Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 21:1-20

  • Jehoram malitere ịchị Juda (1-11)

  • Ịlaịja detaara Jehoram akwụkwọ ozi (12-15)

  • Jehoram nwụrụ ọnwụ ihere (16-20)

21  Jehoshafat mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid. Jehoram nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+  O nwekwara ụmụnne ndị nwoke, ndị Jehoshafat mụrụ. Ha bụ Azaraya, Jehayel, Zekaraya, Azaraya, Maịkel, na Shefataya. Ha niile bụ ụmụ Jehoshafat eze Izrel.  Nna ha nyere ha ọtụtụ onyinye. O nyere ha ọlaọcha, ọlaedo, ihe ndị bara ezigbo uru, na obodo dị iche iche a rụsiri ike dị na Juda.+ Ma o nyere Jehoram alaeze ya,+ n’ihi na ọ bụ ya bụ ọkpara.  Mgbe Jehoram chịwara alaeze nna ya nyere ya, o ji mma agha gbuo ụmụnne ya niile+ iji mee ka ọchịchị ya sie ike. O gbukwara ụfọdụ n’ime ndị isi ndị Izrel.  Jehoram dị afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ asatọ na Jeruselem.+  Ọ nọ na-akpa àgwà ka ndị eze Izrel,+ otú ndị ezinụlọ Ehab kpara, n’ihi na ọ lụrụ nwa Ehab.+ Ọ nọkwa na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova.  Ma Jehova achọghị ịla ezinụlọ Devid n’iyi, n’ihi na ya na Devid gbara ndụ,+ ya ekwe ya nkwa na a ga-enwe onye si n’ezinụlọ ya ga na-achị.*+  Ọ bụ n’oge Jehoram na-achị ka ndị Ịdọm nupụụrụ ndị Juda isi,+ nwee eze nke ha.+  Jehoram na ndị isi agha ya wee jiri ụgbọ ịnyịnya ya niile gaa ebe ahụ. O bilikwara n’abalị lụso ndị Ịdọm gbara ya na ndị isi na-agba ụgbọ ịnyịnya ya gburugburu agha, meriekwa ha. 10  Ma ndị Ịdọm ka na-enupụrụ ndị Juda isi ruo taa. N’oge ahụ, ndị Libna+ nupụkwaara Jehoram isi, n’ihi na ọ hapụrụ Jehova bụ́ Chineke nna nna ya.+ 11  Ọ rụkwara ebe ndị dị elu+ n’ugwu ndị dị na Juda, iji mee ka ndị bi na Jeruselem kpawa àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke. O duhiekwara ndị Juda. 12  Ka oge na-aga, Ịlaịja onye amụma detaara ya akwụkwọ ozi.+ Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Jehova bụ́ Chineke Devid nna nna gị sịrị, ‘Ị naghị akpa àgwà ka Jehoshafat nna gị+ ma ọ bụ ka Esa+ eze Juda. 13  Kama, ị na-akpa àgwà ka ndị eze Izrel,+ nke mere ka ndị Juda na ndị bi na Jeruselem kpawa àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke,+ otú ndị ezinụlọ Ehab+ si kpaa àgwà ka ndị akwụna. I gbudịrị ụmụnne gị,+ ndị ezinụlọ nna gị, ndị ka gịnwa mma. 14  N’ihi ya, Jehova ga-ebibi ndị gị, ụmụ gị, ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere. 15  Ị ga-arịakwa ọtụtụ ọrịa. Otu n’ime ha ga-abụ ọrịa afọ. Ị ga-arịagide ya ruo mgbe eriri afọ gị ga na-awụpụta kwa ụbọchị.’” 16  Jehova mekwara+ ka ndị Filistia+ na ndị Arab+ ndị bi ndị Etiopia nso ghọọ ndị iro Jehoram. 17  Ha wee bịa lụso ndị Juda agha, kwakọrọ akụ̀ niile dị n’ụlọ* eze,+ dọrọkwa ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwunye ya n’agha. Naanị nwa nwoke ha hapụụrụ eze bụ Jehoahaz,*+ bụ́ ọdụdụ nwa ya. 18  Mgbe ihe a niile mechara, Jehova mere ka Jehoram rịawa ọrịa afọ na-enweghị ngwọta.+ 19  Ka oge na-aga, mgbe afọ abụọ zuru ezu gwụchara, ọrịa ahụ mere ka eriri afọ ya wụpụta. Ọ nwụkwara mgbe ọrịa ahụ kara njọ. Ndị ya amụnyeghịkwa ihe na-esi ísì ọma ọkụ iji kwanyere ya ùgwù otú e meere nna nna ya hà.+ 20  Ọ dị afọ iri atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ asatọ na Jeruselem. O nweghịkwa onye o wutere mgbe ọ nwụrụ. Ha likwara ya n’Obodo Devid,+ ma, e lighị ya ebe a na-eli ndị eze.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “na ọkụ ya na ụmụ ya ga na-enwu mgbe niile.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
A na-akpọkwa ya Ehazaya.