Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 22:1-12

  • Ehazaya malitere ịchị Juda (1-9)

  • Atalaya weghaara ọchịchị n’ike (10-12)

22  Ndị bi na Jeruselem wee chie Ehazaya ọdụdụ nwa ya eze ka ọ nọchie ya, n’ihi na ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ha na ndị Arab so bịa ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu gburu ndị niile tọrọ ya.+ Otú a ka Ehazaya nwa Jehoram si malite ịchị ndị Juda.+  Ehazaya dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara otu afọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Atalaya+ nwa nwa* Ọmraị.+  Ọ nọkwa na-akpa àgwà ka ndị ezinụlọ Ehab,+ n’ihi na ọ na-eso ndụmọdụ ọjọọ nne ya na-enye ya.  Ọ nọkwa na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova, otú ndị ezinụlọ Ehab mere, n’ihi na ọ bụ ha na-agwa ya ihe ọ na-eme mgbe nna ya nwụrụ. Ihe a kpatakwaara ya nsogbu.  O mere ihe ha gwara ya, gaa soro Jehoram nwa Ehab eze Izrel lụso Hazel+ eze Siria agha na Remọt-gilied.+ Ọ bụkwa ebe ahụ ka ndị ọgba ụta merụrụ Jehoram ahụ́.  Jehoram lawaziri Jezril+ ka ọ nọrọ ebe ahụ ka ahụ́ ahụ e merụrụ ya laa. E merụrụ ya ahụ́ ahụ na Rema mgbe ọ gara lụso Hazel eze Siria agha.+ Ehazaya* nwa Jehoram+ eze Juda gara Jezril ka ọ hụ Jehoram+ nwa Ehab n’ihi ahụ́ ahụ e merụrụ ya.*+  Ma, Chineke mere ka Ehazaya nwụọ mgbe ọ gara ịhụ Jehoram. Mgbe ọ garuru, ya na Jehoram gara ka ha hụ Jihu+ nwa nwa* Nimshaị, onye Jehova họpụtara ka o bibie ezinụlọ Ehab.+  Mgbe Jihu malitere ime ndị ezinụlọ Ehab ihe Chineke kpebiri ka e mee ha, ọ hụrụ ndị isi ebo Juda, hụkwa ụmụ ụmụnne Ehazaya, ndị na-ejere Ehazaya ozi. O gbukwara ha.+  Ndị na-ejere ya ozi chọwaziri Ehazaya, mechaa jide ya ebe o zoro na Sameria, kpụtakwara ya Jihu. Ha gbuziri ya, liekwa ya.+ Ha sịkwara: “Ọ bụ nwa nwa Jehoshafat, onye ji obi ya niile chọọ Jehova.”+ O nweghị onye si n’ezinụlọ Ehazaya ga-achịli alaeze ahụ. 10  Mgbe Atalaya+ nne Ehazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara ka o gbuo ụmụ eze niile si n’ebo Juda.+ 11  Ma, Jehoshabịat* nwa eze zooro ezoro si ebe ụmụ eze ndị a chọrọ igbu nọ kupụ Jehoash+ nwa Ehazaya. O kunyere ya nwaanyị na-enye ya ara ma kpọba ha abụọ n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime. Jehoshabịat bụ nwa Eze Jehoram.+ (Ọ bụ nwunye Jehoyada+ onye nchụàjà, bụrụkwa nwanne Ehazaya.) O zoro Jehoash ka Atalaya ghara ịhụ ya, nke mere na o gbughị ya.+ 12  E zoro Jehoash n’ụlọ ezi Chineke ruo afọ isii mgbe Atalaya nọ na-achị ndị obodo ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “nwa.”
Ihe a kpọrọ ya n’Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị e ji aka dee n’oge ochie n’asụsụ Hibru bụ “Azaraya.”
Ma ọ bụ “n’ihi ọrịa ọ na-arịa.”
Na Hibru, “nwa.”
Jehoshabịat bụ nwaanyị.