Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 23:1-21

  • Jehoyada nyere aka e chie Jehoash eze (1-11)

  • E gburu Atalaya (12-15)

  • Ihe ọma dị iche iche Jehoyada mere (16-21)

23  N’afọ nke asaa, Jehoyada katara obi kpọọ ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha,+ ha na ya agbaa ndụ. Ndị isi ahụ bụ Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohenan, Azaraya nwa Obed, Measaya nwa Adaya, na Elishefat nwa Zikraị.  Ha gaziri n’obodo niile dị na Juda kpọkọta ndị Livaị+ na ndị isi ọnụmara ndị dị n’Izrel. Mgbe ha gbakọrọ na Jeruselem,  ha na eze gbara ndụ+ n’ụlọ ezi Chineke. Mgbe ha gbachara ndụ, Jehoyada sịrị ha: “Ihe Jehova kwere Devid ná nkwa gbasara ụmụ ya ga-eme. Ọ bụ nwa eze ga-achị.+  Ihe a ka unu ga-eme: Ndị nchụàjà na ndị Livaị ga-eke onwe ha ụzọ atọ. Otu ụzọ ga-abịa ọrụ+ n’Ụbọchị Izu Ike. Otu ụzọ ga na-eche ọnụ ụzọ nche.+  Otu ụzọ ọzọ ga-anọ n’ụlọ* eze,+ otu ụzọ ọzọ anọrọ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọzi n’ogige ndị dị n’ụlọ Jehova.+  Unu ekwela ka onye ọ bụla bata n’ụlọ Jehova ma e wezụga ndị nchụàjà na ndị Livaị na-eje ozi.+ Ọ bụ ha ga-abata n’ihi na ha dị nsọ. Ndị ọzọ niile ga-anọ n’èzí na-arụ ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ Jehova.  Ndị Livaị ga-agba eze gburugburu, onye nke ọ bụla ga-ejikwa ngwá agha ya n’aka. Gbuonụ onye ọ bụla batara n’ụlọ ahụ. Sorokwanụ eze ebe ọ bụla ọ na-aga.”*  Ndị Livaị na ndị Juda niile mekwara nnọọ ihe Jehoyada onye nchụàjà gwara ha. Onyeisi nke ọ bụla kpọọrọ ndị nọ n’ìgwè ya, ma ndị nke nọ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike ahụ ma ndị nke na-anọghị ọrụ,+ n’ihi na Jehoyada onye nchụàjà agwabeghị ìgwè dị iche iche+ ka ha kwụsị ọrụ.  Jehoyada onye nchụàjà nyekwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị ahụ+ ube na ọta Eze Devid,+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke.+ 10  Ọ gwakwara mmadụ niile ebe ha ga-anọ, ha anọrọ ebe ahụ gbaa eze gburugburu, malite n’ebe aka nri ụlọ ahụ ruo n’ebe aka ekpe ya. Ha nọkwa ebe ịchụàjà na ụlọ nsọ ahụ nso, onye nke ọ bụla n’ime ha jikwa ngwá agha ya n’aka. 11  Ha kpọpụtakwara nwa eze,+ kpuwe ya okpueze, dokwasịkwa Ihe Àmà*+ n’isi ya ma chie ya eze. Jehoyada na ụmụ ya tekwara ya mmanụ. Ha asị: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!”+ 12  Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị na-agba ọsọ, na-eto eze, ọ bịakwutere ha ozugbo n’ụlọ Jehova.+ 13  Ọ hụkwara ka eze guzo n’akụkụ otu ogidi* nke dị ebe e si abata n’ụlọ ahụ. Ndị isi+ na ndị na-afụ opi nọkwa n’akụkụ eze. Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ+ ma na-afụ opi. Ndị ji ngwá egwú na-abụ abụ nọkwa na-edu ndị niile ahụ na-aṅụrị ọṅụ. Ihe a mere ka Atalaya dọwaa uwe ya, tie mkpu, sị: “Ha agbaala m mgba okpuru! Ha agbaala m mgba okpuru!” 14  Ma Jehoyada onye nchụàjà kpọrọ ndị isi ìgwè otu narị otu narị ahụ, ya bụ, ndị isi ndị agha, sị ha: “Kpọpụnụ ya ebe a unu nọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla esoro ya, jirinụ mma agha gbuo onye ahụ.” Jehoyada onye nchụàjà kwukwara, sị: “Unu egbula ya n’ụlọ Jehova.” 15  Ndị agha ahụ wee kpụrụ ya. Mgbe ha kpụ ya rute ebe a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya, nke dị n’ụlọ* eze, ha gburu ya ozugbo. 16  Jehoyada mekwara ka ya na mmadụ niile na eze gbaa ndụ na ha agaghị akwụsị ịbụ ndị Jehova.+ 17  Mgbe e mechara, mmadụ niile gara n’ụlọ Bel, kwatuo ya,+ kụriekwa ebe ndị a na-achụrụ ya àjà na arụsị ndị dị ebe ahụ.+ Ha gbukwara Matan bụ́ onye nchụàjà Bel+ n’ihu ebe ịchụàjà ndị ahụ. 18  Jehoyada nyefeziri ndị nchụàjà na ndị Livaị ọrụ ndị dị n’ụlọ Jehova. Devid adịla mbụ kee ha n’ìgwè n’ìgwè ka ha na-elekọta ụlọ Jehova, na-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ+ otú e dere n’Iwu Mosis ka a na-eme.+ Ka ha na-eme ihe ndị a, ha ga na-aṅụrị ọṅụ, na-abụkwa abụ otú Devid kwuru ka a na-eme. 19  O dowekwara ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ Jehova, ka onye ọ bụla na-adịghị ọcha n’ụzọ ọ bụla ghara ịbanye. 20  Ọ kpọkwara ndị isi ìgwè otu narị otu narị ndị agha,+ ndị ukwu, ndị ọchịchị, nakwa ndị obodo ahụ niile, ha esi n’ụlọ Jehova kpọrọ eze pụwa. Ha sizi n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago bata n’ụlọ* eze, meekwa ka eze nọrọ n’ocheeze+ alaeze ahụ.+ 21  Ndị obodo ahụ niile nọkwa na-aṅụrị ọṅụ. Obodo ahụ dakwara jii n’ihi na ha ejirila mma agha gbuo Atalaya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “mgbe ọ na-apụ apụ na mgbe ọ na-abata abata.”
O nwere ike ịbụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Chineke.
Na Hibru, “ogidi ya.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “n’obí.”