Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 25:1-28

  • Amazaya malitere ịchị Juda (1-4)

  • Amazaya na ndị Ịdọm lụrụ agha (5-13)

  • Amazaya fere arụsị (14-16)

  • Amazaya na Jehoash eze Izrel lụrụ agha (17-24)

  • Mgbe Amazaya nwụrụ (25-28)

25  Amazaya dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ iri abụọ na itoolu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jehoadan onye Jeruselem.+  Ọ nọkwa na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova, ma o jighị obi ya niile na-eme ya.  Ozugbo alaeze ya siri ike, o gburu ndị na-ejere ya ozi, ndị gburu nna ya bụ́ eze.+  Ma o gbughị ụmụ ha, n’ihi na o mere ihe e dere n’Iwu, nke dị n’akwụkwọ Mosis, ebe Jehova nyere iwu, sị: “A gaghị egbu ndị nna n’ihi ihe ụmụ ha mere, a gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi ihe nna ha mere. Kama, ọ bụ mmehie mmadụ mere ka a ga-eji maka ya gbuo ya.”+  Amazaya kpọkọtakwara ndị Juda ma gwa ha ka ha kwụrụ n’ọnụmara n’ọnụmara. Ọnụmara nke ọ bụla na ndị isi ha ga-anọ, ya bụ, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha. O mere ihe a maka ndị Juda na ndị Benjamin niile.+ O debara aha ha n’akwụkwọ malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe.+ Ha niile dị narị puku atọ (300,000). Ha bụ ndị agha a zụrụ azụ,* ndị nwere ume ibu ube na ọta ukwu.  Ọ gara n’Izrel goo otu narị puku (100,000) ndị bụ́ dike n’agha. O ji otu narị talent* (100) ọlaọcha goo ha.  Ma, onye nke ezi Chineke bịakwutere ya, sị ya: “Eze, ka ndị agha Izrel ghara iso gị, n’ihi na Jehova anọnyereghị Izrel,+ o nweghịkwa onye Ifrem ọ bụla ọ nọnyeere.  Kama gawa naanị gị, lụọ agha, obi siekwa gị ike n’agha a. Ma ọ́ bụghị ya, ezi Chineke nwere ike ime ka onye iro gị merie gị, n’ihi na Chineke nwere ike inyere mmadụ aka,+ nweekwa ike ime ka e merie mmadụ.”  Amazaya wee gwa onye nke ezi Chineke, sị: “Oleekwanụ maka otu narị (100) talent m nyere ndị agha Izrel?” Onye nke ezi Chineke asị ya: “Jehova nwere ike inye gị ihe karịrị ya.”+ 10  Amazaya gwaziri ndị agha ahụ si Ifrem bịa ka ha laa n’ụlọ ha. Ma, ha wesoro Juda ezigbo iwe, jirikwa iwe laghachi n’ụlọ ha. 11  Amazaya kataziri obi duru ndị agha ya gawa na Ndagwurugwu Nnu,+ gbuokwa puku ndị Sia iri (10,000).+ 12  Ndị Juda jidekwara puku mmadụ iri (10,000) ná ndụ, kpọrọ ha gaa n’elu nnukwu nkume, si n’elu nkume ahụ tụda ha, ha niile akụọ righirighi. 13  Ma, ndị agha ahụ Amazaya gwara ka ha lawa ka ha ghara iso ya gaa agha+ banyere n’obodo ndị dị na Juda n’ike, malite na Sameria+ ruo Bet-horọn.+ Ha gburu puku mmadụ atọ (3,000) n’ebe ndị ahụ, burukwa ọtụtụ ihe laa. 14  Ma mgbe Amazaya gbuchara ndị Ịdọm, o welatara arụsị dị iche iche ndị Sia na-efe ma dowe ha ebe ọ ga na-aga efe ha.+ O bidokwara ịkpọrọ ha isiala, na-esukwara ha àjà ọkụ. 15  Ihe a Amazaya mere were Jehova ezigbo iwe, ya ezie onye amụma ya, ya agaa gwa ya, sị: “Gịnị mere i ji fewe chi ndị na-anapụtaghị ndị na-efe ha n’aka gị?”+ 16  Mgbe ọ gwara eze ihe a, eze sịrị ya: “Mechie ọnụ!+ Ònye mere gị onye ndụmọdụ eze?+ Ị̀ chọrọ ịnwụ?” Onye amụma ahụ mechiziri ọnụ. Ma tupu ya emechie ọnụ, ọ sịrị: “Ama m na Chineke ekpebiela ịla gị n’iyi n’ihi ihe a i mere nakwa n’ihi na i geghị ntị n’ihe m kwuru.”+ 17  Mgbe Amazaya eze Juda na ndị ndụmọdụ ya gbachara izu, o zigaara Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jihu eze Izrel ozi, sị: “Bịa ka mụ na gị lụọ agha.”*+ 18  Jehoash eze Izrel wee zigara Amazaya eze Juda ozi, sị: “Ahịhịa ogwu dị na Lebanọn zigaara osisi sida dị na Lebanọn ozi, sị, ‘Kpọnye nwa m nwoke nwa gị nwaanyị ka ọ lụwa.’ Ma, anụ ọhịa nke nọ na Lebanọn gafeere, zọda ahịhịa ogwu ahụ. 19  Ị sịrị, ‘Emeriela m Ịdọm.’+ Ọ na-ebuzi gị isi, gị ana-achọ ka e towe gị. Ma ugbu a, nọrọ n’ụlọ* gị. Gịnị mere ị ga-eji bido ọgụ a ga-emeri gị na ndị Juda?” 20  Ma Amazaya egeghị ya ntị,+ n’ihi na ọ bụ otú ezi Chineke si chọọ ya. Ọ chọrọ inyefe ha n’aka ndị iro ha,+ maka na ha na-efe chi ndị Ịdọm.+ 21  Jehoash eze Izrel wee buru ọgụ gawa, ya na Amazaya eze Juda ebido ịlụ agha na Bet-shimesh+ nke dị na Juda. 22  Ndị Izrel wee merie ndị Juda, onye nke ọ bụla n’ime ha agbalaa n’ụlọ* ya. 23  Jehoash eze Izrel jidere Amazaya eze Juda, nwa Jehoash nwa Jehoahaz.* O jidere ya na Bet-shimesh, mechaa kpụta ya na Jeruselem. Ọ kwatukwara mgbidi Jeruselem, malite n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem+ ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Mgbidi Sụkọtara Isi.+ Mgbidi ahụ ọ kwaturu dị narị kubit anọ (400).* 24  O bukọkwaara akụ̀ ndị dị n’ụlọ eze nakwa ọlaedo na ọlaọcha niile na arịa niile dị n’ụlọ ezi Chineke,+ kpụrụkwa* Obed-ịdọm na ndị ọzọ e jidere n’agha. Mgbe e mechara, ọ laghachiri Sameria. 25  Mgbe Jehoash nwa Jehoahaz eze Izrel nwụchara, Amazaya+ nwa Jehoash+ eze Juda nọkwuru ndụ afọ iri na ise.+ 26  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Amazaya, malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ e dere gbasara ndị eze Juda na Izrel. 27  Mgbe Amazaya hapụrụ Jehova, ndị mmadụ gbaara ya izu+ na Jeruselem, ya agbaga Lekish. Ma ha ziri ndị mmadụ, ha achọrọ ya gaa Lekish, gbuo ya ebe ahụ. 28  Ha ji ịnyịnya bulata ya ma lie ya ebe e liri nna nna ya hà na Juda.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “a họrọ ahọ.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ka anyị hụ ihu na ihu.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu.”
A na-akpọkwa ya Ehazaya.
Ihe dị ka mita 178 (amaụkwụ 584). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ọlaedo na ọlaọcha niile na arịa niile dị n’aka.”