Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 26:1-23

  • Ọzaya malitere ịchị Juda (1-5)

  • Ike ndị Ọzaya kpara n’agha (6-15)

  • Chineke mere ka Ọzaya rịawa ekpenta n’ihi na ọ dị mpako (16-21)

  • Mgbe Ọzaya nwụrụ (22, 23)

26  Ndị Juda niile wee kpọrọ Ọzaya,+ chie ya eze, ya anọchie Amazaya nna ya.+ Ọ dị afọ iri na isii mgbe ahụ.  Mgbe Eze Amazaya nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ,+ Ọzaya nwa ya weghaara Ilọt,+ mee ka ọ bụrụghachi obodo ndị Juda.  Ọzaya+ dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri ise na abụọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jekọlaya. Ọ bụ onye Jeruselem.+  Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova otú Amazaya nna ya mere.+  Ọ nọkwa na-ejere Chineke ozi n’oge Zekaraya dị ndụ, onye kụziiri ya ịtụ egwu Chineke. N’oge ọ nọ na-ejere Jehova ozi, ezi Chineke mere ka ihe gaziere ya.+  Ọ gara lụso ndị Filistia agha+ ma tipuo mgbidi Gat,+ mgbidi Jabne,+ na mgbidi Ashdọd.+ Ọ rụkwara obodo dị iche iche n’ebe dị nso n’Ashdọd nakwa n’ebe ndị Filistia nwe.  Ezi Chineke nọkwa na-enyere ya aka, ya emerie ndị Filistia, ndị Arebia+ bi na Gọbel, na ndị Meyunim.  Ndị Amọn+ malitekwara ịtụrụ Ọzaya ụtụ. Ka oge na-aga, ude ya ruru Ijipt, n’ihi na ọ bịara sie ezigbo ike.  Ọzaya rụkwara ụlọ nche dị iche iche+ na Jeruselem, rụsiekwa ha ike. Ebe ndị ọ rụrụ ha bụ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Mgbidi Sụkọtara Isi,+ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu,+ nakwa n’Idé Ji Mgbidi. 10  Ọ rụkwara ụlọ nche+ n’ala ịkpa, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri (n’ihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ). O mekwara otú ahụ na Shefila* nakwa n’ala dị larịị. O nwere ndị ọrụ ubi na ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn dị n’ugwu nakwa na Kamel, n’ihi na ọrụ ubi na-amasị ya. 11  Ọzaya nwekwara ndị agha nwere ngwá agha dị iche iche. A na-ahazi ha n’ìgwè n’ìgwè ma ha gawa agha. Jeayel bụ́ odeakwụkwọ+ na Measaya bụ́ onyeisi gụrụ ha ọnụ, debakwa aha ha n’akwụkwọ.+ Ọ bụ Hananaya, otu n’ime ndị eze mere ndị isi, bụ onyeisi mmadụ abụọ a. 12  Ndị niile bụ́ ndị isi ọnụmara, bụrụkwa ndị isi ndị a bụ́ dike n’agha, dị puku mmadụ abụọ na narị isii (2,600). 13  Ndị agha ha na-edu aga agha dị narị puku mmadụ atọ, puku asaa na narị ise (307,500). Ha niile bụ ndị agha siri ezigbo ike, ha na-alụsokwa ndị iro eze agha.+ 14  Ọzaya nyere ndị agha ya niile ọta, ube,+ okpu agha, uwe agha,+ ụta, na nkume e ji agba èbè.*+ 15  Ndị ọkachamara nọkwa na Jeruselem rụọrọ ya ígwè ndị e ji alụ agha. A rụnyere ígwè ndị ahụ n’ụlọ nche dị iche iche+ nakwa n’elu ebe dị iche iche mgbidi sụkọtara isi. A na-eji ha agbapụ akụ́ na nnukwu nkume. Ọzaya nọkwa na-ede ude ebe niile n’ihi na Chineke nyeere ya ezigbo aka, ya esie ike. 16  Ma ozugbo o siri ike, ọ bịara dị mpako, si otú ahụ kpatara onwe ya nsogbu. O mebiri iwu Jehova Chineke ya, banye n’ụlọ nsọ Jehova ka ọ mụnye insens* ọkụ n’elu ebe ịchụàjà insens.+ 17  Ma, Azaraya onye nchụàjà na ndị nchụàjà Jehova iri asatọ ndị ọzọ, ndị katara obi, sochiri ya azụ ozugbo. 18  Ha gakwuuru Eze Ọzaya, sị ya: “Ọzaya, ọ bụghị gị kwesịrị ịmụnyere Jehova insens ọkụ.+ Ọ bụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịna-amụnye insens ọkụ, n’ihi na ha bụ ụmụ ụmụ Erọn,+ ndị e doro nsọ. Si n’ụlọ nsọ a pụọ, n’ihi na i meela ihe ọjọọ. Jehova Chineke agaghị eme ka a kwanyere gị ùgwù n’ihi ihe a i mere.” 19  Ma Ọzaya were ezigbo iwe.+ O jikwa ihe a na-eji etinye insens ka o jiri ya mụnye insens ọkụ. Ka ọ nọ na-ewesa ndị nchụàjà ahụ iwe, ekpenta+ pụtara ya n’egedege ihu n’ụlọ Jehova, n’akụkụ ebe ịchụàjà insens. Ndị nchụàjà ahụ nọkwa ebe ahụ. 20  Mgbe Azaraya onyeisi nchụàjà na ndị nchụàjà niile ahụ lere ya anya, ha hụrụ ekpenta n’egedege ihu ya. Ha meziri ọsọ ọsọ kpọpụ ya ebe ahụ. Yanwa pụwakwara ngwa ngwa n’ihi na Jehova ataala ya ahụhụ. 21  Eze Ọzaya rịagidere ekpenta ruo ụbọchị ọ nwụrụ. O bikwa n’ụlọ a rụpụrụ iche,+ n’ihi na a machiri ya ịga n’ụlọ Jehova. Jotam nwa ya nọzi na-ahụ maka otú ihe si na-aga n’ụlọ* eze, na-ekpekwara ndị obodo ahụ ikpe.+ 22  Aịzaya onye amụma,+ bụ́ nwa Emọz, dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ọzaya, malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ. 23  Ọzaya mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya ebe e liri nna nna ya hà. Ma, ha liri ya n’ala dị iche bụ́kwa nke ndị eze,* n’ihi na ha sịrị: “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
Èbè bụ ihe yiri katapọt.
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ọ ga-abụ na ala a ha liri ya dị nso n’ala a na-eli ndị eze.