Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 27:1-9

  • Jotam malitere ịchị Juda (1-9)

27  Jotam+ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jerusha nwa Zedọk.+  Jotam nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova otú ahụ Ọzaya nna ya mere.+ Ma, ọ banyeghị ebe ọ na-ekwesịghị ịbanye n’ụlọ nsọ Jehova otú nna ya banyere.+ Ndị obodo ya ka nọkwa na-eme ihe ọjọọ.  Ọ rụrụ ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe mgbago n’ụlọ Jehova,+ rụọkwa ọtụtụ ihe ná mgbidi Ofel.+  Ọ rụkwara obodo dị iche iche+ n’ebe bụ́ ugwu ugwu na Juda,+ rụọkwa ebe ndị siri ike+ na ụlọ nche+ n’oké ọhịa dị iche iche.  Ọ lụsoro eze ndị Amọn agha,+ meriekwa ya na ndị ya. Ọ bụ ya mere ndị Amọn ji nye ya otu narị (100) talent* ọlaọcha n’afọ ahụ, nyekwa ya ọka wit dị puku kọọ* iri (10,000), na ọka bali dị puku kọọ iri (10,000). Ndị Amọn jikwa ihe ndị a kwụọ ya ụgwọ n’afọ nke abụọ na nke atọ.+  Jotam nọkwa na-esikwu ike, n’ihi na o kpebiri na ọ ga na-eso ụzọ Jehova Chineke ya.  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jotam, agha niile ọ lụrụ na otú o si bie ndụ, n’akwụkwọ e dere gbasara ndị eze Izrel na Juda.+  Ọ dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ iri na isii na Jeruselem.+  N’ikpeazụ, Jotam nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ. Ha liri ya n’Obodo Devid.+ Ehaz nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kọọ bụ lita 220. Gụọ B14.