Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 3:1-17

  • Solomọn malitere ịrụ ụlọ nsọ (1-7)

  • Ebe Kacha Nsọ (8-14)

  • Ogidi abụọ e ji ọla kọpa rụọ (15-17)

3  Solomọn mechara bido ịrụ ụlọ Jehova+ na Jeruselem n’Ugwu Moraya.+ N’ebe ahụ ka Jehova pụtara n’ihu Devid nna ya.+ Devid nọkwa ebe ahụ, n’ebe Ọnan+ onye Jebus na-azọcha ọka, kwadebe maka ụlọ nsọ a ga-arụ.  Solomọn bidoro ịrụ ya n’abalị abụọ n’ọnwa nke abụọ, n’afọ nke anọ n’ọchịchị ya.  E jiri ihe e jibu atụ̀ ihe tụọ ntọala ụlọ ezi Chineke Solomọn tọrọ, ọ dị kubit* iri isii n’ogologo, dịrịkwa kubit iri abụọ n’obosara.+  Ihe a rụnyere n’ụzọ e si abata n’ụlọ nsọ ahụ dị kubit iri abụọ n’obosara. Ogo ya dị otu narị na iri abụọ (120).* Ihe ahụ na ụlọ ahụ hà n’obosara. Solomọn jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa+ machie ime ya.  O ji osisi junipa kụchie Ebe Kacha Nsọ, werezie ezigbo ọlaedo+ machie ya. O sekwara ọtụtụ nkwụ+ na ụdọ ígwè+ n’ahụ́ ya iji chọọ ya mma.  O jikwa ọmarịcha nkume dị oké ọnụ*+ machie ụlọ ahụ. Ọlaedo+ o jikwa machie ya si Paveim.  O jikwa ọlaedo machie+ ụlọ ahụ, ọnụ ụzọ ya, ahụ́ ya, ibo ya, na ogologo osisi ndị e ji kụọ elu ya. Ọ tụkwara ọtụtụ cherob n’ahụ́ ụlọ ahụ.+  Ọ rụkwara Ebe Kacha Nsọ.+ Ogologo ya na obosara ụlọ ahụ hà. Ogologo ya dị kubit iri abụọ, obosara ya dịkwa kubit iri abụọ. O jikwa ezigbo ọlaedo+ dị narị talent* isii (600) machie ya.  Ọlaedo e ji kpụọ ntu e ji rụọ ọrụ n’ụlọ ahụ dị shekel* iri ise. Solomọn jikwa ọlaedo machie ọnụ ụlọ ndị dị n’elu ya. 10  Ọ kpụkwara cherob abụọ n’Ebe Kacha Nsọ, jirikwa ọlaedo machie ha.+ 11  Nku cherob ndị ahụ+ dị kubit iri abụọ n’ogologo. Otu nku cherob nke mbụ dị kubit ise, na-emetụkwa n’ahụ́ ụlọ ahụ. Nku ya nke ọzọ dịkwa kubit ise, na-emetụ nku cherob nke abụọ. 12  Otu nku cherob nke abụọ dị kubit ise, na-emetụkwa akụkụ nke ọzọ n’ahụ́ ụlọ ahụ. Nku ya nke ọzọ dịkwa kubit ise, na-emetụ nku cherob nke mbụ. 13  Nku cherob ndị a gbasara agbasa. Ha niile dịkwa kubit iri abụọ. Cherob ndị ahụ guzo ọtọ, cheekwa ihu n’Ebe Nsọ. 14  O jikwa ọmarịcha ákwà, eri na-acha anụnụ anụnụ, na nke na-acha uhie uhie,* nakwa nke na-acha pọpụl mee ákwà mgbochi ya.+ Ọ kpanyekwara cherob na ya.+ 15  Ọ rụkwara ogidi abụọ+ n’ihu ụlọ ahụ. Ha dị kubit iri atọ na ise n’ogologo. Ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi nke ọ bụla dị kubit ise.+ 16  Ọ rụkwara ụdọ ígwè nke yiri ihe olu ma konye ha n’elu ogidi ndị ahụ. Ọ kpụkwara otu narị (100) ihe yiri mkpụrụ pomigranet ma ganye ha n’ụdọ ígwè ndị ahụ. 17  O gwunyere ogidi ndị ahụ n’ihu ụlọ nsọ ahụ. Otu dị n’aka nri,* nke ọzọ adịrị n’aka ekpe.* Ọ kpọrọ nke dị n’aka nri Jekin,* kpọọ nke dị n’aka ekpe Boaz.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5), ma ụfọdụ ndị chere na otu kubit ihe e jibu atụ̀ ihe a na-ekwu okwu ya ebe a bụ nke na-adị sentimita 51.8 (inch 20.4). Gụọ B14.
A maghị ma ọ̀ bụ na kubit ka ọ̀ bụkwanụ n’ihe ọzọ e ji atụ̀ ihe.
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
Jekin pụtara “Ka O [ya bụ, Jehova] Mee Ka Ọ Kwụrụ Chịm.”
O nwere ike ịbụ na Boaz pụtara “E Ji Ike.”