Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 5:1-14

  • Otú e si kwadebe inyefe Chineke ụlọ nsọ ya (1-14)

    • E bubatara igbe ọgbụgba ndụ n’ụlọ nsọ ahụ (2-10)

5  Solomọn wee rụchaa ihe niile gbasara ụlọ Jehova.+ O bubataziri ihe ndị Devid nna ya doro nsọ.+ O busakwara ọlaọcha, ọlaedo, na arịa ndị ọzọ niile n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ ezi Chineke.+  N’oge ahụ, Solomọn kpọkọrọ ndị okenye Izrel, ya bụ, ndị isi niile nke ebo dị iche iche, na ndị isi ọnụmara dị iche iche n’Izrel. Ha gakwuuru ya na Jeruselem iji si n’Obodo Devid,+ ya bụ, Zayọn,+ buru igbe ọgbụgba ndụ Jehova bute n’ụlọ nsọ.  Ndị Izrel niile gbakọrọ na nke eze n’oge ememme* a na-eme n’ọnwa nke asaa.+  Mgbe ndị okenye niile n’Izrel bịara, ndị Livaị buuru Igbe ahụ.+  Ọ bụ ha butere Igbe ahụ, ụlọikwuu nzute,+ nakwa arịa niile dị nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ. Ọ bụ ndị nchụàjà na ndị Livaị* butere ha.  Eze Solomọn na ndị Izrel niile a kpọrọ ka ha bịa nnọkọ ahụ nọ n’ihu Igbe ahụ. Atụrụ na ehi a chụrụ n’àjà+ karịkwara akarị nke na e nweghị ike ịgụta ha ọnụ.  Ndị nchụàjà bubataziri igbe ọgbụgba ndụ Jehova n’ebe ọ ga na-adị, n’ọnụ ụlọ dị n’ime ime ụlọ ahụ, ya bụ, n’Ebe Kacha Nsọ, n’okpuru nku cherob ndị ahụ.+  Otú a ka e si dọsa Igbe ahụ n’okpuru nku cherob ndị ahụ gbasara agbasa, nke na cherob ndị ahụ kpuchiri Igbe ahụ na okporo osisi e ji ebu ya.+  Okporo osisi ndị ahụ dị ogologo nke na onye nọ n’Ebe Nsọ, n’ihu Ebe Kacha Nsọ, na-ahụ ọnụ ọnụ ha, ma onye nọ n’èzí anaghị ahụ ha. Ha dịkwa ebe ahụ ruo taa. 10  Naanị ihe dị n’ime Igbe ahụ bụ mbadamba nkume abụọ Mosis tinyere n’ime ya na Horeb.+ O tinyere ha mgbe Jehova na ndị Izrel gbara ndụ,+ n’oge ha si n’Ijipt na-apụta.+ 11  Mgbe ndị nchụàjà si n’ebe nsọ pụta (n’ihi na ndị nchụàjà niile nọ ebe ahụ edoola onwe ha nsọ,+ n’agbanyeghị ìgwè ha nọ),+ 12  ndị Livaị ndị nke na-abụ abụ+ yi ákwà ọma, jirikwa ájà, ụbọ akwara, na une guzoro n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụàjà ahụ. Ndị na-edu ha n’abụ ahụ bụ Esaf,+ Himan,+ Jedutọn,+ na ụmụ ha na ụmụnne ha. Ndị nchụàjà, ndị dị otu narị mmadụ na iri abụọ (120), guzokwa ebe ahụ na-afụ opi.+ 13  Ndị ahụ na-afụ opi na ndị ahụ na-abụ abụ ji otu olu na-eto Jehova ma na-ekele ya. Ha ji opi, ájà, na ngwá egwú ndị ọzọ na-eto Jehova “n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Ka ha na-abụ abụ a, ígwé ojii bịara ju n’ụlọ ahụ, ya bụ, n’ụlọ Jehova.+ 14  Ígwé ojii ahụ mere ka ndị nchụàjà gharazie ije ozi ha, n’ihi na ebube Jehova juru n’ụlọ ezi Chineke.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Ememme Ụlọ Ndò.
Ma ọ bụ “ndị nchụàjà bụ́ ndị Livaị.”