Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 7:1-22

  • Ebube Jehova jupụtara n’ụlọ nsọ ya (1-3)

  • Ememme ndị Izrel ji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (4-10)

  • Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ (11-22)

7  Ozugbo Solomọn kpechara ekpere,+ ọkụ si n’eluigwe bịa+ rechapụ anụ ahụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ, ebube Jehova ejukwa n’ụlọ ahụ.+  Ndị nchụàjà abalighịkwa n’ụlọ Jehova n’ihi ebube Jehova juru n’ụlọ Jehova.+  Ebube Jehova dịkwa n’elu ụlọ ahụ. Ndị Izrel niile nọkwa na-ekiri ọkụ ahụ na ihe niile na-emenụ. Ha hulatakwara ala na pevment, kpọọ isiala ma kelee Jehova “n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”  Eze na ndị Izrel niile nọkwa na-achụrụ Jehova àjà.+  Eze Solomọn chụrụ puku ehi iri abụọ na puku abụọ (22,000) n’àjà, chụọkwa otu narị puku atụrụ na puku iri abụọ (120,000) n’àjà. Otú a ka eze na ndị Izrel niile si nyefee ezi Chineke ụlọ ahụ.+  Ndị nchụàjà guzo ebe ha na-arụ ọrụ, ha na ndị Livaị ndị ji ngwá egwú e ji abụrụ Jehova abụ.+ (Ọ bụ Eze Devid mere ngwá egwú ndị ahụ ka ha jiri ha na-ekele Jehova, na-asị, “n’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.” Ihe a ka ha na-ekwu mgbe ọ bụla Devid bịara iso ha* eto Chineke.) Ndị nchụàjà nọkwa n’ihu ha na-afụsi opi ike,+ ka ndị Izrel ndị ọzọ niile guzo ọtọ.  Solomọn dokwara etiti ogige dị n’ihu ụlọ Jehova nsọ n’ihi na ọ chọrọ ịnọ ebe ahụ chụọ àjà a na-esu ọkụ,+ jirikwa abụba si n’anụ e ji chụọ àjà udo chụọ àjà. Ọ chọrọ ịnọ ebe ahụ chụọ àjà maka na ebe ịchụàjà ahụ o ji ọla kọpa rụọ+ dị obere ịnọ chụọ àjà a na-esu ọkụ, àjà ọka,+ na àjà e ji abụba achụ.+  N’oge ahụ, Solomọn mere ememme* ụbọchị asaa,+ ya na ndị Izrel niile, ndị hiri ezigbo nne, malite na Libo-hemat* ruo na Ndagwurugwu* Ijipt.+  Ha ji ụbọchị asaa mee ememme e ji nyefee Chineke ebe ịchụàjà, jirikwa ụbọchị asaa mee oriri maka ya. Ma, ha nwere nzukọ pụrụ iche n’ụbọchị nke asatọ.*+ 10  Ma n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa nke asaa, ọ gwara ha ka ha lawa, ha alaakwa n’ụlọ ha dị iche iche. Obi nọkwa na-atọ ha ụtọ, ha ana-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihi ihe ọma Jehova meere Devid, Solomọn, na ndị ya bụ́ ndị Izrel.+ 11  Otú a ka Solomọn si rụchaa ụlọ Jehova na ụlọ* eze.+ Solomọn mechakwara ihe niile o bu n’obi ime gbasara ụlọ Jehova na obí nke ya.+ 12  Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ+ n’abalị, sịkwa ya: “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ụlọ a ka ọ bụrụ ebe a ga-anọ na-achụ àjà.+ 13  Ọ bụrụ na mụ akpọchie eluigwe ka mmiri ghara izo, ọ bụrụ na mụ enye ụkpara iwu ka ha tachapụ ihe ndị a kụrụ n’ubi n’ala a, ọ bụrụkwa na mụ emee ka ndị m rịawa ọrịa na-efe efe, 14  ma, ndị m, bụ́ ndị na-aza aha m,+ eweda onwe ha ala,+ kpee ekpere, chọọ m, hapụkwa ụzọ ọjọọ ha,+ m ga-anọ n’eluigwe nụ ekpere ha, gbagharakwa ha mmehie ha. M ga-emekwa ka ala ha mewe nri ọzọ.+ 15  Anya m ga-adị n’ebe ndị ga-ekpe ekpere ebe a nọ, ntị m ga-anụkwa ekpere ha ga-ekpe ebe a.+ 16  Ugbu a, ahọrọla m ụlọ a, dookwa ya nsọ ka a nọrọ na ya na-eto aha m mgbe niile.+ Anya m na obi m ga-adịkwa na ya mgbe niile.+ 17  “Ọ bụrụ na i jeere m ozi otú Devid nna gị jere, debe iwu niile m nyere gị, mee ihe otú m chọrọ, na-emekwa ihe ndị m kpebiri,+ 18  m ga-eme ka ocheeze nke alaeze gị sie ike,+ otú m kwere Devid nna gị+ ná nkwa mgbe mụ na ya gbara ndụ. M sịrị ya, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ gị ga-anọ n’ocheeze Izrel.’+ 19  Ma ọ bụrụ na unu agbanwee, kwụsị iso ntụziaka m, kwụsị idebe iwu ndị m nyere unu, gaakwa fewe chi ọzọ dị iche iche ma kpọwara ha isiala,+ 20  m ga-efopụ unu n’ala m nke m nyere unu.+ M ga-ebibikwa ụlọ a m ji maka aha m doo nsọ. Ndị mba ọzọ niile ga-eji ụlọ a mere ihe ọchị.* Ha agaghịkwa eji ya kpọrọ ihe.+ 21  Ụlọ a ga-abụzi ụlọ e bibiri ebibi. Onye ọ bụla nke na-agafe ya ga-ekporopụ anya na-ele ya,+ na-asịkwa, ‘Gịnị mere Jehova ji mee ala a na ụlọ a otú a?’+ 22  A ga-asịkwa ya, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova+ bụ́ Chineke ndị nna nna ha, onye kpọpụtara ha n’Ijipt.+ Ha nabatakwara chi ọzọ dị iche iche, kpọwara ha isiala ma fewe ha.+ Ọ bụ ya mere o ji mee ka ọdachi a niile dakwasị ha.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ ndị Livaị.
Ma ọ bụ “n’ebe e si abanye Hemat.”
Ya bụ, Ememme Ụlọ Ndò.
Ya bụ, ụbọchị na-eso ụbọchị e mechara oriri ahụ, ma ọ bụ n’ụbọchị nke 15.
Ma ọ bụ “obí.”
Na Hibru, “ga-eji ya na-atụ ilu.”