Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 8:1-18

  • Ihe ndị ọzọ Solomọn rụrụ (1-11)

  • Solomọn haziri otú a ga-esi na-efe Chineke n’ụlọ nsọ (12-16)

  • Ụgbọ mmiri ndị e ziteere Solomọn (17, 18)

8  Solomọn ji afọ iri abụọ rụchaa ụlọ Jehova na ụlọ nke ya.+  Solomọn rụghachiri obodo ndị Haịram+ nyere ya ma mee ka ndị Izrel biri na ha.  Solomọn gakwara lụso ndị Hemat-zoba agha, meriekwa ha.  Ọ gakwara rụsie Tadmọ nke dị n’ala ịkpa ike,* ya na obodo niile a na-akwasa ihe+ na Hemat.+  Ọ gakwara jiri mgbidi, ibo ụzọ, na ihe e ji atụchi ụzọ rụsie Bet-horọn Mgbago+ na Bet-horọn Ndịda+ ike.  Ọ rụsikwara Belat+ ike, ya na obodo niile ọ na-akwasa ihe, na obodo niile ọ na-adọsa ụgbọ ịnyịnya,+ nakwa obodo ndị ndị na-agba ịnyịnya bi. Solomọn rụkwara ihe niile ọ chọrọ ịrụ na Jeruselem, Lebanọn, nakwa n’obodo niile ọ na-achị.  Ma ndị niile na-abụghị ndị Izrel fọrọnụ,+ ya bụ, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+  ma ụmụ ha ma ụmụ ụmụ ha ndị fọrọ n’ala ha, ndị ndị Izrel na-egbughị,+ Solomọn manyere ha ka ha na-arụrụ ya ọrụ ruo taa.+  Ma, o nweghị onye Izrel ọ bụla Solomọn manyere ka ọ na-arụrụ ya ọrụ,+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha ya, ndị isi agha ya, ndị isi nke ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya ya, na ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya.+ 10  Ndị isi nke ndị na-enyere Eze Solomọn aka dị narị mmadụ abụọ na iri ise (250). Ha bụ ndị isi nke ndị na-arụ ọrụ.+ 11  Solomọn sikwa n’Obodo Devid kpọpụta nwa Fero+ ma kpọga ya n’ụlọ ọ rụụrụ ya.+ Ọ sịrị: “N’agbanyeghị na ọ bụ nwunye m, o kwesịghị ibi n’ụlọ Devid eze Izrel, maka na ebe ọ bụla e bubatara Igbe Jehova dị nsọ.”+ 12  Solomọn maliteziri ịchụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà+ ọ rụụrụ Jehova. Ọ rụrụ ya n’ihu ihe a rụrụ n’ụzọ e si abanye n’ụlọ nsọ ahụ.+ 13  Ọ na-achụ àjà kwa ụbọchị otú a gwara Mosis ka e si na-achụ ya. Ọ na-achụkwa àjà n’Ụbọchị Izu Ike,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ nakwa n’ụbọchị ememme atọ a na-eme n’afọ ọ bụla,+ ya bụ, Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ Ememme Izu,+ na Ememme Ụlọ Ndò.+ 14  Ọ haziri ndị nchụàjà n’ìgwè n’ìgwè+ ka ha na-arụ ọrụ ha otú Devid nna ya kwuru ka e si na-arụ ha, haziekwa ndị Livaị maka ọrụ ha, ka ha na-eto Chineke,+ na-ejekwa ozi n’ihu ndị nchụàjà otú e kwuru ka a na-eme kwa ụbọchị. Ọ hazikwara ndị nche ọnụ ụzọ ámá n’ìgwè n’ìgwè ka ha na-eche ọnụ ụzọ ámá dị iche iche nche.+ Otú a ka Devid, onye nke ezi Chineke, kwuru ka a na-eme. 15  Ha ahapụghịkwa ime ihe eze gwara ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha na-eme gbasara ihe ọ bụla nakwa gbasara ebe a na-akwasa ihe. 16  A haziri ọrụ niile Solomọn rụrụ n’ụlọ Jehova nke ọma malite n’ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọ ahụ+ ruo mgbe a rụchara ya. Otú a ka e si rụchaa ụlọ Jehova.+ 17  Ka e mechara, Solomọn gara Iziọn-giba+ na Ilọt.+ Obodo ndị a dị n’ụsọ oké osimiri, n’Ịdọm.+ 18  Haịram+ ziri ndị na-ejere ya ozi, ha ezitere Solomọn ndị bụ́ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri nakwa ụgbọ mmiri ndị ha ga na-akwọ. Ha na ndị na-ejere Eze Solomọn+ ozi gara Ofa+ butere ya narị talent* ọlaedo anọ na iri ise (450).+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “rụghachi Tadmọ nke dị n’ala ịkpa.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.