Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ 9:1-31

  • Eze nwaanyị Shiba gara leta Solomọn (1-12)

  • Akụnụba Solomọn (13-28)

  • Mgbe Solomọn nwụrụ (29-31)

9  Mgbe eze nwaanyị Shiba+ nụrụ akụkọ Solomọn, ọ bịara Jeruselem ka ọ jụọ ya ajụjụ ndị tara akpụ ka ọ mara ma ọ̀ ga-azata ha. Ọtụtụ mmadụ so ya. Ha jikwa kamel dị iche iche buru mmanụ balsam, ọtụtụ ọlaedo,+ na nkume ndị dị oké ọnụ.* Ọ gakwuuru Solomọn jụọ ya ihe niile ọ chọrọ ịjụ ya.+  Solomọn zakwara ya ajụjụ niile ọ jụrụ ya. O nweghị ihe ọ bụla nwaanyị ahụ jụrụ ya siiri ya ike ịza.  Mgbe eze nwaanyị Shiba hụrụ otú Solomọn si mara ihe,+ hụkwa ụlọ ọ rụrụ,+  o riri ya ọnụ. Ihe ndị ọzọ ọ hụrụ riri ya ọnụ bụ nri a na-adọsara Solomọn na tebụl,+ otú e si hazie ndị na-ejere ya ozi, otú ndị na-ebutere ya nri si ebute ya na otú ha si eji ejiji, otú ndị na-ebutere ya mmanya si ebute ya na otú ha si eji ejiji, nakwa àjà a na-esu ọkụ ọ na-achụ mgbe niile n’ụlọ Jehova.+  O wee sị eze: “Ihe m nụrụ n’obodo m gbasara ike ị na-akpa* nakwa otú i si mara ihe bụ eziokwu.  Ma, ekwetaghị m ihe ndị mmadụ nọ na-akọ ruo ugbu a m bịara jiri anya m hụ ya.+ A gwarughịdị m ọkara otú ị maruru ihe.+ Ihe m na-ahụ gbasara gị karịrị ihe m nụrụ.+  Ndị gị ga na-enwe obi ụtọ. Ndị na-ejere gị ozi, ndị gị na ha na-anọ mgbe niile, ha ana-ege ntị n’okwu onye amamihe ị na-ekwu, ga na-enwekwa obi ụtọ.  Ka e too Jehova Chineke gị, onye mere ka ị nọrọ n’ocheeze ya, meekwa ka ị bụrụ eze na-anọchite anya Jehova Chineke gị, maka na ihe gị masịrị ya. Chineke gị hụrụ ndị Izrel n’anya,+ ọ chọkwara ka ha dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya mere o ji họrọ gị ka ị bụrụ eze ha, ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume.”  O bunyeziri eze otu narị talent* ọlaedo na iri abụọ (120),+ mmanụ balsam karịrị akarị, na nkume ndị dị oké ọnụ.* O nweghị mgbe ọzọ e buteere Eze Solomọn mmanụ balsam há ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere ya.+ 10  Ndị na-ejere Haịram ozi na ndị na-ejere Solomọn ozi si Ofa+ bute ọlaedo, mechaakwa bute osisi algọm na nkume ndị dị oké ọnụ.*+ 11  Eze ji osisi algọm ndị ahụ rụọ steepụ ụlọ Jehova+ nakwa steepụ ụlọ* eze,+ jirikwa ha rụọrọ ndị na-abụ abụ une na ụbọ akwara.+ O nwetụbeghị mgbe a hụrụ ụdị osisi dị ka osisi ndị ahụ na Juda. 12  Eze Solomọn nyekwara eze nwaanyị Shiba ihe ọ bụla masịrị ya ọ rịọrọ ya. Ihe ndị eze nyere nwaanyị ahụ karịkwara nke o wetaara eze. Nwaanyị ahụ na ndị na-ejere ya ozi mechara laghachi n’obodo ha.+ 13  N’afọ ọ bụla, ọlaedo a na-ebutere Solomọn na-adị narị talent isii na iri isii na isii (666),+ 14  n’agụnyeghị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahịa dị iche iche, ndị eze ndị Arab niile, na ndị gọvanọ mpaghara dị iche iche na-ebutere Solomọn.+ 15  Eze Solomọn jikwa ọlaedo a gwara agwa+ rụọ narị nnukwu ọta abụọ (200) (o ji narị shekel* ọlaedo isii (600) a gwara agwa rụọ ọta nke ọ bụla).+ 16  O jikwa ọlaedo a gwara agwa rụọ narị obere ọta atọ (300) (o ji maịna* ọlaedo atọ rụọ obere ọta nke ọ bụla). Eze dowekwara ha n’ụlọ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ 17  Eze jikwa ọdụ́ rụọ otu nnukwu ocheeze ma were ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+ 18  Steepụ e si arịgo n’ocheeze ahụ nwere ụzọ ebe isii a na-azọkwasị ụkwụ ma a rịgowe ya. A rụnyere ihe e ji agbakwasị ụkwụ e ji ọlaedo rụọ n’ocheeze ahụ, rụnyekwa ebe a na-atụkwasị aka n’akụkụ ya abụọ. A kpụnyekwara otu ọdụm+ n’akụkụ ebe nke ọ bụla a na-atụkwasị aka. 19  A kpụnyere ọdụm iri na abụọ+ n’elu ebe isii ahụ a na-azọkwasị ụkwụ ma a rịgowe steepụ ahụ. Ọdụm abụọ dị na nke ọ bụla n’ime ha, otu n’aka nri, otu n’aka ekpe. O nweghị alaeze ọzọ rụrụ ụdị ihe a. 20  E ji ọlaedo mee iko niile Eze Solomọn nwere, jirikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa mee arịa niile dị n’ụlọ ahụ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn. E nweghị ihe ọ bụla e ji ọlaọcha mee, n’ihi na e nweghị ihe e ji ọlaọcha kpọrọ n’oge Solomọn na-achị.+ 21  Ndị na-ejere Haịram+ ozi na-eji ụgbọ mmiri eze aga Tashish.+ Otu ugboro n’afọ atọ, ụgbọ mmiri ndị a na-aga Tashish ebute ọlaedo, ọlaọcha, ọdụ́,+ adaka, na ekwuru. 22  Eze Solomọn nwere akụnụba karịa ndị eze ndị ọzọ niile nọ n’ụwa, kakwa ha mara ihe.+ 23  Ndị eze niile n’ụwa na-achọtakwa* Solomọn ka ha gere okwu onye amamihe ezi Chineke tinyere n’obi ya.+ 24  Kwa afọ, onye ọ bụla n’ime ha na-ewetara ya onyinye. Ha na-eweta ihe ndị e ji ọlaọcha mee, ihe ndị e ji ọlaedo mee, uwe,+ ngwá agha, mmanụ balsam, ịnyịnya, na jakị. 25  Solomọn nwekwara puku ụlọ ịnyịnya anọ (4,000), ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya, na puku ịnyịnya* iri na abụọ (12,000).+ O dowekwara ha n’obodo dị iche iche a na-edowe ụgbọ ịnyịnya nakwa n’ebe dị yanwa bụ́ eze nso na Jeruselem.+ 26  Ọ nọkwa na-achị ndị eze niile nọ malite n’Osimiri Yufretis ruo n’ala ndị Filistia, ruokwa n’ókè Ijipt.+ 27  Ọlaọcha eze webatara na Jeruselem dị ọtụtụ ka nkume. Osisi sida o butere dịkwa ọtụtụ ka osisi sịkamọ ndị dị na Shefila.*+ 28  Ndị mmadụ na-esikwa n’Ijipt na n’obodo ndị ọzọ atụbatara Solomọn ịnyịnya.+ 29  E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Solomọn,+ malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ. Ọ bụ Netan+ onye amụma, Ahaịja+ onye Shaịlo, na Ido onye ọhụụ dere ya. Ido+ dere ya n’ebe o dere ọhụụ ọ hụrụ gbasara Jeroboam+ nwa Nibat. 30  Solomọn nọ na Jeruselem chịa ndị Izrel niile afọ iri anọ. 31  N’ikpeazụ, Solomọn nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ. E liri ya n’Obodo Devid nna ya.+ Rehoboam nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “okwu ndị ị na-ekwu.”
Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “nkume ndị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “obí.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Maịna e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ gram 570. Gụọ B14.
Na Hibru, “na-achọkwa ihu.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”