Pita Nke Abụọ 1:1-21

  • Ekele (1)

  • Gbalịsienụ ike ka unu ghara ịkwụsị ịna-efe Chineke (2-15)

    • Ihe ndị ọzọ anyị ga na-eme ma e wezụga inwe okwukwe (5-9)

  • Obi siri anyị ike na amụma ndị Chineke buru ga-emezu (16-21)

1  Abụ m Saịmọn Pita, ohu Jizọs Kraịst na onyeozi ya. M na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị a kụziiri ọmarịcha eziokwu a kụzikwaara anyịnwa* maka na Chineke na Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta anyị, bụ ndị ezi omume.  Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu n’ihi na unu amatala ya na Onyenwe anyị Jizọs nke ọma.+  N’ihi otú a anyị si mata ha nke ọma, Chineke enyela anyị ike ya, nyekwa anyị ihe niile anyị kwesịrị inwe iji na-efe ya. Ọ kpọrọ anyị+ maka na ọ dị ebube, nweekwa obiọma.  Ọ bụkwa ya mere o ji mee ka anyị mara ọmarịcha nkwa ndị na-enweghị atụ o kwere,+ ka anyị wee dịrị ike otú ọ dị+ n’ihi nkwa ndị ahụ o kwere anyị maka na anyị anaghị eme omume ọjọọ ndị ụwa na-eme, nke agụụ ihe ọjọọ na-akpata.  N’ihi ya, na-agbasinụ mbọ ike+ ka unu nwee okwukwe, na-akpakwa àgwà ọma.+ Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu mara ihe,+  na-ejide onwe unu,+ na-atachi obi, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.+  Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu hụ ụmụnna niile n’anya ka ụmụnne. Hụkwanụ mmadụ niile n’anya.+  Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, na-emekwa ha mgbe niile, unu ga-eji ihe unu ma nke ọma gbasara Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-arụ ihe dị mma, unu agaghịkwa anọ nkịtị.+  Ma, onye ọ bụla na-anaghị eme ihe ndị a kpuru ìsì. O mechiri anya ya ka ọ ghara ịhụ ìhè,*+ chefuokwa na Chineke asachapụla mmehie ndị o mere+ n’oge gara aga. 10  N’ihi ya, ụmụnna m, gbalịsienụ ike ka unu ghara ịkwụsị ịna-efe Chineke, ebe ọ kpọrọ unu,+ họrọkwa unu. Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị akwụsị ife Chineke.+ 11  N’eziokwu, ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, a ga-agọzi unu otú na-enweghị atụ, ya bụ, unu ga-abanye n’Alaeze ga-adịru ebighị ebi+ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.+ 12  N’ihi ya, m chọrọ ịna-echetara unu ihe ndị a mgbe niile n’agbanyeghị na unu ma ha, bụrụkwa a kwaa a kwụrụ n’eziokwu a na-akụziri anyị. 13  Ma, ebe ọ bụ na m ka dị ndụ n’anụ ahụ́,*+ echere m na ọ dị mma ichetara unu ihe ndị a.+ 14  O doro m anya na anụ ahụ́* m agaghịzi adịte aka, otú Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gwara m.+ 15  M ga na-eme ike m mgbe niile otú ọ ga-abụ mgbe m na-anọghịzi, unu ga-enwe ike ịna-echeta ihe ndị a n’onwe unu. 16  Ihe anyị gwara unu gbasara ike Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na ọnụnọ ya abụghị akụkọ ụgha ndị mmadụ chepụtara iji duhie ibe ha, kama ọ bụ ihe anyị ji anya anyị hụ gbasara ebube ya.+ 17  N’ihi na Chineke bụ́ Nna mere ka ọ dị ebube, meekwa ka a na-asọpụrụ ya. Chineke, onye ebube na-enweghị atụ na-esi n’aka ya, mere ihe a mgbe o kwuru gbasara ya, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+ 18  N’eziokwu, anyị nụrụ olu si n’eluigwe kwuo ihe a mgbe anyị na ya nọ n’ugwu nsọ. 19  Ọ bụ ya mere obi ji sie anyị ike na amụma ndị Chineke buru ga-emezu. Ọ dị mma na unu na-echebara amụma ndị a echiche. N’ime obi unu, ha ga-adị ka ọkụ*+ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, nke na-enwugide ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ+ apụta. 20  N’ihi na unu bu ụzọ mara na o nweghị amụma dị n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ echiche mmadụ. 21  N’ihi na o nwetụbeghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma,+ kama mmụọ nsọ nọ na-edu ndị mmadụ, ha ana-ekwu ihe Chineke chọrọ ka ha kwuo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “unu ndị nwere okwukwe pụrụ iche anyịnwa nwekwara.”
O nwere ike ịbụ, “ka o kpuo ìsì, ghara ịhụcha ụzọ.”
Na Grik, “m ka nọ n’ụlọikwuu a.”
Na Grik, “ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “oriọna.”