Samuel nke Abụọ 1:1-27

  • Oge Devid nụrụ na Sọl anwụọla (1-16)

  • Abụ iru uju Devid ji Sọl na Jonatan bụọ (17-27)

1  Mgbe Sọl nwụchara, Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag+ mgbe o merichara* ndị Amalek lọta.  N’ụbọchị nke atọ, otu nwoke si n’ebe ndị agha Sọl mara ụlọikwuu bịa. Ọ dọwara uwe ya adọwa, kpokwasịkwa ájá n’isi ya. Mgbe ọ bịakwutere Devid, ọ dara n’ala, kpọọkwa isiala.  Devid asị ya: “Ebee ka i si?” Ya asị: “Esi m ebe ndị agha Izrel mara ụlọikwuu gbapụta.”  Devid ajụọ ya sị: “Olee otú ihe si gaa? Biko, kọọrọ m.” Ya asị: “Ndị Izrel esila n’ọgbọ agha gbaa ọsọ. Ọtụtụ n’ime ha anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya anwụọkwala.”+  Devid ajụọ ya, sị: “Olee otú i si mara na Sọl na Jonatan nwa ya anwụọla?”  Nwoke ahụ asị ya: “Ọ dabara na m nọ n’Ugwu Gilboa,+ Sọl adabere n’ube ya, ndị gba ụgbọ ịnyịnya na ndị gba ịnyịnya achụkwute ya.+  Mgbe ọ tụgharịrị hụ m, ọ kpọrọ m, mụ asị, ‘Lee m.’  Ya ajụọ m, sị, ‘Ị̀ bụ onye?’ Mụ asị ya, ‘Abụ m onye Amalek.’+  Ya asịzie m, ‘Biko, bịa gbuo m, n’ihi na n’agbanyeghị na m ka dị ndụ,* emerụọla m ezigbote ahụ́.’ 10  N’ihi ya, m gara gbuo ya,+ maka na m ma na ahụ́ ahụ o merụrụ ka ga-egbu ya ma ọ daruo ala. M wekwaara okpueze o kpu n’isi na ọla ọ gba n’aka, sị ka m wetara ha onyenwe m ebe a.” 11  Devid wee dọwaa uwe ya, ndị niile so ya adọwaakwa nke ha. 12  Ha nọkwa na-eti mkpu, na-ebe ákwá, na-ebu ọnụ+ ruo anyasị n’ihi Sọl na Jonatan nwa ya nakwa n’ihi ndị Jehova, ya bụ, n’ihi ọtụtụ ndị Izrel+ e ji mma agha gbuo. 13  Devid wee jụọ onye ahụ kọọrọ ya ihe ahụ, sị: “Ị̀ bụ onye ebee?” Ya asị: “Abụ m nwa onye Amalek, onye mbịarambịa n’Izrel.” 14  Devid asị ya: “Gịnị mere na ụjọ atụghị gị igbu onye Jehova tere mmanụ?”+ 15  Devid wee gwa otu n’ime ndị ahụ so ya, sị: “Gaa gbuo ya.” Ya agaa jiri mma agha gbuo ya.+ 16  Devid asị ya: “Ka ọbara gị dịrị gị n’isi, n’ihi na i ji ọnụ gị kwuo na ọ bụ gị gburu onye Jehova tere mmanụ.”+ 17  Devid wee jiri Sọl na Jonatan nwa ya bụọ abụ iru uju,+ 18  sịkwa ka a kụziere ndị Juda abụ iru uju ahụ. A na-akpọ abụ ahụ “Ụta.” E dere ya n’akwụkwọ Jesha, sị:+ 19  “Izrel, e gbuola ndị gị mara mma, ha atọgbọrọ n’ebe ndị dị elu dị n’ala gị.+ Ndị dike anwụọkwala n’agha. 20  Unu akọla akụkọ ya na Gat.+ Unu akọsala ya n’okporo ámá Ashkelọn,Ka ụmụ nwaanyị ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ,Ka ụmụ nwaanyị nke ndị a na-ebighị úgwù ghara inwe obi ụtọ. 21  Ugwu ndị dị na Gilboa,+Ka igirigi ghara ịdara unu, ka mmiri ghara izoro unu. Ka ubi unu gharakwa imepụta nri ọ bụla a ga-eji chụọ àjà,+N’ihi na n’ebe ahụ ka e merụrụ ọta ndị dike. Ọta Sọl abụghịzi ọta e tere mmanụ. 22  Ụta Jonatan anaghị ahapụ ịtụ ebe a chọrọ ka ọ tụọ.+ Mma agha Sọl anaghị ahapụ ime ihe a chọrọ ka o mee.+ Ụta na mma agha ahụ gburu ndị dike. Ọbara ndị iro jukwara na ha. 23  Sọl na Jonatan+ bụ ndị a hụrụ n’anya na ndị e ji kpọrọ ihe n’oge ha dị ndụ. E kewaghịkwa ha n’ọnwụ.+ Ha na-efe ọsọ karịa ugo.+ Ha dịkwa ike karịa ọdụm.+ 24  Ụmụ nwaanyị Izrel, beerenụ Sọl ákwá,Onye yiwere unu uwe uhie* na uwe a chọrọ mma,Onye tinyere ihe e ji achọ mma e ji ọlaedo mee n’uwe unu. 25  Ndị Izrel, ndị dike unu adaala n’ọgbọ agha. A nọ n’ebe dị elu n’ala unu gbuo Jonatan.+ 26  Nwanne m Jonatan, ọnwụ gị agbawaala m obi. Ị bụ ezigbote enyi m.+ Otú i si hụ m n’anya karịrị otú ụmụ nwaanyị si ahụ mmadụ n’anya.+ 27  Ndị dike anwụọla. Ngwá agha alaakwala n’iyi.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “o gbuchara.”
Ma ọ bụ “n’ihi na mkpụrụ obi m niile ka dị n’ime m.”
Ma ọ bụ “uwe na-acha ọbara ọbara.”