Samuel nke Abụọ 10:1-19

  • Ndị Izrel meriri ndị Amọn na ndị Siria (1-19)

10  Ka oge na-aga, Eze ndị Amọn+ nwụrụ, Henọn nwa ya anọchie ya, malite ịchị.+  Devid wee sị: “M ga-egosi Henọn nwa Nehash na m hụrụ ya n’anya* n’ihi na nna ya gosiri m na ya hụrụ m n’anya.” N’ihi ya, Devid ziri ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa kasie ya obi maka nna ya nwụrụnụ. Ma, mgbe ndị na-ejere Devid ozi batara n’ala ndị Amọn,  ndị isi ndị Amọn gwara Henọn onyenwe ha, sị: “Ì chere na ihe mere Devid ji zite ndị ga-akasi gị obi bụ maka na ọ na-akwanyere nna gị ùgwù? Ihe mere o ji zite ha ọ́ bụghị ka ha nyopụta otú obodo a dị ma weghara ya?”  N’ihi ya, Henọn kpọọrọ ndị na-ejere Devid ozi kpụchapụ ọkara afụ ọnụ ha,+ chawaakwa uwe mwụda ha ruo n’ikè, hapụzie ha ka ha lawa.  Mgbe a kọọrọ Devid ihe a, o ziri ndị mmadụ ozugbo ka ha gaa hụ ha, n’ihi na e menyere ha ezigbo ihere. Eze gwakwara ha, sị: “Nọrọnụ na Jeriko,+ afụ ọnụ unu rujuo, unu alọta.”  Ka oge na-aga, ndị Amọn hụrụ na ihe ha adịghịzi Devid mma. N’ihi ya, ha gara goo puku ndị agha iri abụọ (20,000) ji ụkwụ aga n’aka ndị Siria nọ na Bet-rihọb+ nakwa n’aka ndị Siria nọ na Zoba.+ Ha gakwara goo eze ndị Meaka+ na otu puku (1,000) ndị agha ya, gaakwa Ishtọb* goo puku ndị agha iri na abụọ (12,000).+  Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gwara Joab na ndị agha ya niile, ma ndị nke kacha bụrụ dike n’agha, ka ha gaa agha.+  Ndị Amọn pụtakwara n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha, hazie onwe ha n’usoro ka ha lụọ agha, ma ndị Siria si Zoba na ndị nke si Rihọb nakwa ndị Ishtọb* na ndị Meaka gara nọrọ n’ọhịa osisi na-adịghị, haziekwa onwe ha.  Mgbe Joab hụrụ na e si ihu na azụ na-abịa ịlụso ya agha, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ndị Izrel bụ́ ọkà n’ịlụ agha, hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Siria agha.+ 10  Ọ hapụkwaara Abishaị+ nwanne ya ndị fọrọnụ, ka ọ hazie ha n’usoro ịga lụso ndị Amọn agha.+ 11  Ọ gwakwara Abishaị, sị: “Ndị Siria karịa m ike, gị abịa nyere m aka. Ma ndị Amọn karịa gị ike, mụ abịa nyere gị aka. 12  Ka anyị jisie ike, katakwa obi+ n’ihi ndị ala anyị nakwa n’ihi obodo niile nke Chineke anyị. Jehova ga-emekwa uche ya.”+ 13  Joab na ndị ya na ha so gaziri lụso ndị Siria agha, merie ha, ha agbaa ọsọ.+ 14  Mgbe ndị Amọn hụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, hanwa gbakwara ọsọ n’ihi Abishaị, laghachi n’obodo ha. Mgbe agha ahụ biri, Joab si ebe ọ gara ịlụso ndị Amọn agha lọta Jeruselem. 15  Mgbe ndị Siria hụrụ na ndị Izrel emeriela ha, ha zukọtara ọzọ.+ 16  Hadadiza+ zikwara ndị Siria nọ ná mpaghara Osimiri Yufretis+ ka ha bịa. Shobak, onyeisi ndị agha Hadadiza, eduru ha gaa Hilam. 17  Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara ndị Izrel niile ozugbo, ha esi n’Osimiri Jọdan gafee ruo Hilam. Ndị Siria hazikwara onwe ha n’usoro, malitekwa ịlụso Devid agha.+ 18  Ma ndị Izrel meriri ndị Siria, ha agbaa ọsọ. Devid gbukwara narị ndị Siria asaa (700) na-agba ụgbọ ịnyịnya na puku ndị Siria iri anọ (40,000) na-agba ịnyịnya. O gbukwara Shobak onyeisi ndị agha ha ebe ahụ.+ 19  Mgbe ndị eze niile, ndị na-ejere Hadadiza ozi, hụrụ na ndị Izrel emeriela ha, ha gakwuuru ndị Izrel ozugbo, ha na ha emee udo, ha aghọọ ndị ohu ha.+ Ụjọ ekweghịzi ndị Siria gaa nyere ndị Amọn aka ọzọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “M ga-egosi Henọn nwa Nehash ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “gakwurukwa ndị Tọb.”
Ma ọ bụ “ndị Tọb.”