Samuel nke Abụọ 13:1-39

  • Amnọn dinara Tema n’ike (1-22)

  • Absalọm gburu Amnọn (23-33)

  • Absalọm gbagara Geshọ (34-39)

13  Absalọm nwa Devid nwere nwanne nwaanyị mara mma. Aha ya bụ Tema.+ Obi Amnọn+ nwa Devid dịkwa ebe ọ nọ.  Ihe a nọkwa na-enye Amnọn nsogbu n’obi nke na ọ dara ọrịa n’ihi Tema nwanne ya nwaanyị. O sikwaara Amnọn ike ime Tema ihe ọ bụla maka na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.  Ma, Amnọn nwere otu enyi aha ya bụ Jehonadab.+ Ọ bụ nwa Shimea,+ nwanne Devid. Jehonadab bụkwa nwoke dị ezigbote akọ.  Ọ jụkwara Amnọn, sị: “Nwa eze, gịnị mere na obi anaghị adị gị mma kwa ụtụtụ? Gwa m.” Amnọn asị ya: “Obi m dị ebe Tema nwanne+ Absalọm bụ́ nwanne m nwoke nọ.”  Jehonadab asị ya: “Dinara n’àkwà* gị mee ka à ga-asị na ị na-arịa ọrịa. Nna gị bịa ileta gị, gị asị ya, ‘Biko, ka Tema nwanne m nwaanyị bịa nye m nri. Ọ bụrụ na ọ nọrọ n’ihu m siere m nri a na-esiri onye ọrịa, nyekwa m ya, m ga-eri ya.’”  Amnọn wee dinara ala mee ka à ga-asị na ọ na-arịa ọrịa, eze abịa ileta ya. Amnọn asị ya: “Biko, ka Tema nwanne m nwaanyị bịa nọrọ n’ihu m meere m keeki abụọ, nyekwa m ya ka m taa.”  Devid wee zie ozi, a gaa n’ụlọ Tema nọ gwa ya, sị: “Biko, gaa n’ụlọ Amnọn nwanne gị siere ya nri.”  Tema wee gaa ebe Amnọn nwanne ya nwoke dina n’ụlọ ya. Mgbe o ruru, ọ gwọrọ ntụ ọka, nọrọ n’ihu ya jiri ya mee keeki.  O wepụtaziri ya n’ite o ji mee ya, bupụtara ya Amnọn. Ma ọ jụrụ ịta ya, gwakwa mmadụ niile ka ha pụọ. Ha niile wee si ebe ahụ ọ nọ pụọ. 10  Amnọn gwaziri Tema, sị: “Butere m nri ahụ n’ime ụlọ, ka ị na-enye m ya n’ọnụ.” Tema wee buru keeki ahụ o mere bugara Amnọn nwanne ya nwoke n’ime ụlọ. 11  Mgbe ọ gara ya nso ka o nye ya nri ahụ ka o rie, ọ bagidere ya, sị ya: “Nwanne m nwaanyị, ka mụ na gị dinaa.” 12  Ma, ọ sịrị ya: “Mba, nwanne m! Emenyela m ihere, n’ihi na a naghị eme ụdị ihe a n’ala Izrel.+ Emela arụ a.+ 13  Olee otú ihere ya ga-esi apụ m apụ n’ihu? Ndị Izrel ga na-elekwa gịnwa anya ka onye nzuzu. Ugbu a, biko, gwa eze, ọ gaghị ajụ ịkpọrọ m kpọnye gị.” 14  Ma o geghị ya ntị. Ebe ọ bụkwa na ọ ka ya ike, o dinara ya n’ike. 15  Mgbe Amnọn dinachara ya, ọ bịara kpọ ya ezigbo asị, nke na otú o si kpọ ya asị karịrị otú o si hụ ya n’anya na mbụ. Amnọn sịkwara ya: “Bilie, si ebe a pụọ!” 16  Tema asị ya: “Nwanne m, achụpụla m, n’ihi na ịchụpụ m ugbu a dị njọ karịa ihe a i mere m!” Ma o geghị ya ntị. 17  Ọ kpọziri onye na-ejere ya ozi, sị ya: “Biko, kpọpụrụ m onye a ebe a, kpọchiekwara m ụzọ ma ọ pụọ.” 18  (N’oge ahụ, Tema yi otu uwe mwụda pụrụ iche, n’ihi na ọ bụ ụdị uwe ụmụ eze na-alụbeghị di* na-eyi.) Onye ahụ na-ejere Amnọn ozi sikwa n’ụlọ ahụ kpọpụ Tema, kpọchiekwa ụzọ mgbe ọ pụrụ. 19  Tema wee wụọ ntụ n’isi ya,+ dọwaa uwe mwụda mara mma o yi, buru aka n’isi pụwa, bere ákwá na-aga. 20  Absalọm nwanne ya nwoke+ ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ Amnọn nwanne gị nwoke dinara gị? Nwanne m nwaanyị, gbachi nkịtị. Ọ bụ nwanne gị nwoke.+ Etinyela obi gị n’ihe a.” Tema wee biri n’ụlọ Absalọm nwanne ya nwoke, nọpụrụ onwe ya iche. 21  Mgbe Eze Devid nụrụ ihe a niile, ezigbo iwe were ya.+ Ma, ọ chọghị ime ihe ga-akpasu Amnọn nwa ya iwe, n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya maka na ọ bụ ọkpara ya. 22  Ma, Absalọm kpọrọ Amnọn asị+ maka na o mere Tema nwanne ya ihe ihere.+ Ma, Absalọm agwaghị Amnọn ihe ọ bụla, ma nke ọma ma nke ọjọọ. 23  Mgbe afọ abụọ chara acha gara, ndị na-akpachara Absalọm ajị atụrụ nọ na Bel-hezọ, nke dị nso n’Ifrem,+ Absalọm akpọọ ụmụ eze ndị nwoke niile oriri.+ 24  Absalọm bịakwutekwara eze, sị ya: “A na-akpachara ohu gị ajị atụrụ. Biko, ka eze na ndị na-ejere ya ozi soro m gaa.” 25  Ma eze sịrị Absalọm: “Mba, nwa m. Ọ bụrụ na anyị niile esoro gị gaa, ọ ga-ebu gị aka.” Ọ nọ na-arịọsi eze ike, ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya. 26  Absalọm agwazie eze, sị: “Ọ bụrụ na ị gaghị aga, biko, ka Amnọn nwanne m nwoke soro anyị gaa.”+ Eze ajụọ ya, sị: “Gịnị mere ọ ga-eji soro gị gaa?” 27  Ma Absalọm rịọsiri ya ike, ya agwazie Amnọn na ụmụ eze ndị nwoke niile ka ha soro ya. 28  Absalọm gwaziri ndị na-ejere ya ozi, sị: “Na-elenụ anya, mgbe ọ bụla obi tọwara Amnọn ụtọ n’ihi mmanya ọ ṅụrụ, m ga-asị unu gbuo ya. Gbuokwanụ ya. Ọ bụ m ziri unu, unu atụla egwu. Dịnụ ike, katakwanụ obi.” 29  Ndị na-ejere Absalọm ozi gburu Amnọn otú Absalọm gwara ha. N’ihi ya, ụmụ eze ndị ọzọ niile biliri, onye nke ọ bụla arịgoro na jakị ya, gbalaga. 30  Ka ha nọ n’ụzọ, a kọọrọ Devid, sị: “Absalọm egbuola ụmụ eze ndị nwoke niile. O nweghịkwa onye ọ hapụrụ ndụ n’ime ha.” 31  Eze wee bilie, dọwaa uwe ya, dinara n’ala, ndị niile na-ejere ya ozi adọwaakwa uwe ha, kwụrụ n’akụkụ ya. 32  Ma, Jehonadab+ nwa Shimea,+ nwanne Devid, sịrị: “Onyenwe m, echekwala na ọ bụ ụmụ eze ndị nwoke niile ka ha gburu. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.+ Ọ bụ Absalọm kwuru ka e gbuo ya. Ụbọchị o kpebiri na ọ ga-egbu ya+ bụ ụbọchị ahụ Amnọn mere Tema nwanne ya nwaanyị ihe ihere.+ 33  Ka onyenwe m eze ghara ikwere ihe a a gwara ya na ụmụ eze ndị nwoke niile anwụọla. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.” 34  Ma, Absalọm gbara ọsọ.+ Mgbe e mechara, otu nwoke onye nche lepụrụ anya hụ ọtụtụ ndị si n’ụzọ dị n’akụkụ ugwu na-abịa. 35  Jehonadab+ asị eze: “Ụmụ eze ndị nwoke alọtawala. Ihe ohu gị gwara gị bụ eziokwu.” 36  Ozugbo o kwuchara ihe a, ụmụ eze beere ezigbo ákwá bata. Eze na ndị niile na-ejere ya ozi bekwara ezigbo ákwá. 37  Ma Absalọm gbara ọsọ, gbakwuru Talmaị+ nwa Amaịhọd eze Geshọ. Devid rukwaara Amnọn nwa ya uju ọtụtụ ụbọchị. 38  Mgbe Absalọm gbara ọsọ, gbaga Geshọ,+ ọ nọrọ ebe ahụ afọ atọ. 39  N’ikpeazụ, agụụ ịhụ Absalọm gụsiwere Devid ike, n’ihi na o diela* ọnwụ Amnọn.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “na-amaghị nwoke.”
Ma ọ bụ “ọ kasiela onwe ya obi maka.”