Samuel nke Abụọ 14:1-33

  • Joab na otu nwaanyị Tekoa (1-17)

  • Devid matara nkata Joab kpara (18-20)

  • Devid kwere ka Absalọm lọta (21-33)

14  Joab nwa Zeruya+ chọpụtakwara na ọ na-agụsi eze ike ịhụ Absalọm.+  N’ihi ya, Joab ziri ozi ka a gaa kpọọrọ ya otu nwaanyị onye Tekoa+ dị akọ. Mgbe ọ bịara, ya asị ya: “Biko, mewe ka onye na-eru uju, yirikwa ákwà iru uju, etekwala mmanụ.+ Mewe ka nwaanyị na-eru uju kemgbe.  Gakwuru eze, lekwa lekwa ihe ị ga-agwa ya.” Joab wee gwa ya ihe ọ ga-ekwu.*  Nwaanyị Tekoa ahụ wee gakwuru eze, gbuo ikpere n’ala, kpọọ isiala, sị: “Eze, biko, nyere m aka!”  Eze asị ya: “Gịnị mere?” Nwaanyị ahụ asị: “N’eziokwu, abụ m nwaanyị isi mkpe. Di m anwụọla.  Ohu gị nwaanyị mụrụ ụmụ nwoke abụọ. Otu ụbọchị, ha abụọ malitere ịlụ ọgụ n’ọhịa. O nweghịkwa onye nọ ebe ahụ igbo ha, otu n’ime ha etigbuo ibe ya.  Ugbu a, ndị ikwu m niile na-enye ohu gị nsogbu. Ha ma na ọ bụzi naanị otu nwa nwoke fọọrọ m. Ma, ha bịara sị m, ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya+ ka anyị gbuo ya n’ihi nwanne ya o gburu!’ Onyenwe m, naanị ya ka m ji nwee olileanya. Ha gbuo ya, ámá di m ga-echi. A gaghịzi enwe onye ga na-aza aha ya n’ụwa.”  Eze gwaziri nwaanyị ahụ, sị: “Lawa n’ụlọ gị. M ga-eleba anya n’okwu a.”  Nwaanyị Tekoa ahụ asị eze: “Onyenwe m eze, ka mụ na ezinụlọ nna m buru ihe nwa m nwoke metara. Ka ọ ghara ịdị n’isi eze na ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya.” 10  Eze asị ya: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa gị okwu ọzọ, kpọtara m ya. Ọ gaghịzi enye gị nsogbu ọzọ.” 11  Ma ọ sịrị: “Eze, biko, cheta Jehova bụ́ Chineke gị, ka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ+ ghara ịkpatakwu nsogbu, gharakwa igbu nwa m nwoke.” David asị ya: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ+ na-aṅụ iyi na otu ntutu isi nwa gị nwoke agaghị ada n’ala.” 12  Nwaanyị ahụ asị: “Biko, ka ohu gị nwaanyị gwatụ onyenwe m eze okwu.” David asị ya: “Kwuwe.” 13  Nwaanyị ahụ asị ya: “Gịnịzi mere i ji mee ihe ga-akpatara ndị Chineke nsogbu?+ Eze, ebe ọ bụ na i kweghị akpọlata nwa gị ị chụpụrụ achụpụ, i jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe ugbu a.+ 14  N’eziokwu, anyị niile ga-anwụrịrị, dịzie ka mmiri a wụfuru awụfu, nke a na-enweghị ike ikurughachi. Ma, Chineke anaghị achọ igbu mmadụ, kama, ọ na-achọ ihe ọ ga-eji maka ya kpọghachite onye a chụpụrụ achụpụ. 15  M bịara ka m gwa onyenwe m eze ihe a n’ihi na ndị mmadụ menyere m ụjọ. Ọ bụ ya mere ohu gị nwaanyị ji sị, ‘Biko, ka m gwa eze okwu. Eze nwere ike leba anya n’arịrịọ ohu ya. 16  Eze nwere ike gee m ntị, napụtakwa ohu ya n’aka nwoke na-achọ igbu mụ na naanị otu nwa nwoke m mụtara, ka anyị ghara inweta ihe Chineke nyere anyị.’+ 17  Ọ bụ ya mere ohu gị ji sị, ‘Biko, ka okwu onyenwe m eze kasie m obi.’ N’ihi na onyenwe m eze ma ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ otú ndị mmụọ ozi ezi Chineke ma. Ka Jehova bụ́ Chineke gị nọnyere gị.” 18  Eze sịziri nwaanyị ahụ: “E nwere ihe m ga-ajụ gị. Biko, gwa m eziokwu.” Nwaanyị ahụ asị ya: “Biko, onyenwe m eze, jụwa.” 19  Eze ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ Joab gwara gị ka i kwuo ihe a niile?”+ Nwaanyị ahụ asị: “Onyenwe m eze, ịgwa gị eziokwu, i kwutere ya. Ọ bụ Joab, onye na-ejere gị ozi, dunyere m. Ọ bụkwa ya gwara m kwuo ihe a niile m kwuru. 20  Ihe mere Joab, onye na-ejere gị ozi, ji gwa m mee ihe a bụ ka ị gbanwee obi gị n’okwu a. Ma, onyenwe m ma ihe ka mmụọ ozi ezi Chineke. Ọ makwa ihe niile na-eme n’ala a.” 21  Eze gwaziri Joab, sị: “Anụla m ihe i kwuru. M ga-eme ya.+ Ngwa, gaa kpọlata Absalọm.”+ 22  Joab wee gbuo ikpere n’ala, kpọọ isiala ma too eze. Ọ sịrị: “Onyenwe m eze, taa ka ohu gị matara na ihe m masịrị gị, n’ihi na eze emeela ihe ohu ya rịọrọ ya.” 23  Joab gaziri Geshọ+ kpọlata Absalọm na Jeruselem. 24  Ma, eze sịrị: “Ya lawa n’ụlọ ya. Ya abịakwala ịhụ m.” Absalọm wee laa n’ụlọ ya. Ọ gaghịkwa hụ eze. 25  N’Izrel niile, o nweghị nwoke mara mma ka Absalọm. O nweghịkwa nke a na-eto maka mma ya otú e si eto ya. Ntụpọ ọ bụla adịghị ya n’ahụ́, malite n’ụkwụ ya ruo n’isi ya. 26  Ya kpụọ isi, ntutu isi ya na-adị narị shekel abụọ* (200) n’arọ ma e jiri nkume e ji atụ̀ ihe* n’ụlọ eze tụọ ya. (Ọ na-akpụ isi ya ná ngwụcha afọ ọ bụla maka na ntutu isi ya na-anyị ya arọ.) 27  Absalọm mụtara ụmụ nwoke atọ+ na otu nwaanyị. Aha nke nwaanyị ahụ bụ Tema. Ọ mara ezigbo mma. 28  Absalọm biri na Jeruselem afọ abụọ chara acha, ma ọ hụghị eze anya.+ 29  Absalọm wee zie ozi ka Joab bịa ka o zie ya ka ọ gakwuru eze, ma Joab ekweghị abịa. Ya ezie ozi nke ugboro abụọ ka ọ bịa, ma o kweghị abịa. 30  N’ikpeazụ, Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “E nwere ala Joab dị n’akụkụ nke m. Ọ kụrụ ya ọka bali. Gaanụ sunye ya ọkụ.” Ndị na-ejere Absalọm ozi wee gaa sunye ala ahụ ọkụ. 31  Joab wee gakwuru Absalọm n’ụlọ ya, jụọ ya, sị: “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji suo ala m ọkụ?” 32  Absalọm asị Joab: “M ziri gị ozi ka ị bịa ka m zie gị ka ị gakwuru eze, sị ya: ‘Olee ihe mere m ji si Geshọ lọta?+ Ọ gaara akara m mma ma a sị na m ka nọ ebe ahụ. Ugbu a, m chọrọ ịhụ eze. Ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ m mere, ya gbuo m.’” 33  Joab wee gakwuru eze, kọọrọ ya ihe a. Eze akpọọ Absalọm, ya abịakwute ya, gbuo ikpere n’ala, kpọọrọ eze isiala, eze esusuo ya ọnụ.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “tinye ya okwu n’ọnụ.”
Ihe dị ka kilogram 2.3. Gụọ B14.
Ihe a nwere ike ịbụ ihe na-adị n’ụlọ eze a na-eji atụ̀ ihe ma ọ bụkwanụ shekel ndị eze nke na-adị iche na nke ndị nkịtị.
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.