Samuel nke Abụọ 15:1-37

  • Absalọm kpara nkata weghara ọchịchị (1-12)

  • Devid si na Jeruselem gbapụ (13-30)

  • Ahitofel kwadowere Absalọm (31)

  • Devid dunyere Hushai ka ọ gaa mee ka ndụmọdụ Ahitofel ghara ịba uru (32-37)

15  Mgbe ihe ndị a mechara, Absalọm bịara nweta otu ụgbọ ịnyịnya na ọtụtụ ịnyịnya nakwa ndị nche iri ise.*+  Ọ na-abụ, Absalọm pụta n’isi ụtụtụ, ya aga guzoro n’akụkụ okporo ụzọ e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha.+ E nwee onye na-abịa ịgwa eze maka ikpe ọ ga-ekpere ya,+ Absalọm akpọọ ya, jụọ ya, sị: “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ asị: “Ohu gị si n’otu n’ime ebo Izrel.”  Absalọm na-asịkwa ya: “Ihe i kwuru dị mma, bụrụkwa eziokwu. Ma, o nweghị onye eze họpụtara ga-eleba okwu gị anya.”  Absalọm na-asịkwa: “A sị nnọọ na a họpụtara m ka m bụrụ onyeikpe n’ala a, ọ gaara abụ, onye nwee ikpe ọ chọrọ ka e kpeere ya, ya abịakwute m, m ga-ekpekwa ikpe ziri ezi.”  Ọ na-abụkwa, onye bịa ịkpọrọ ya isiala, ya amatịa aka, jide onye ahụ, susuokwa ya ọnụ.*+  Ihe a ka Absalọm na-eme ndị Izrel niile na-abịa ịgwa eze ikpe ọ ga-ekpere ha. Otú a ka Absalọm si na-enweta obi ndị Izrel.+  Mgbe afọ anọ* gachara, Absalọm bịara sị eze: “Biko, ka m gaa Hebrọn+ mezuo nkwa m kwere Jehova.  Mgbe ahụ mụnwa bụ́ ohu gị nọ na Geshọ+ dị na Siria, o nwere nkwa m kwere.+ M sịrị, ‘Ọ bụrụ na Jehova emee ka m laghachi Jeruselem, m ga-achụrụ Jehova àjà.’”*  Eze asị ya: “Gaa nke ọma.”* Ya agawa Hebrọn. 10  Absalọm wee zie ndị mmadụ, ha agaa n’ebo niile n’Izrel na nzuzo na-agwa ha, sị: “Ozugbo unu nụrụ ụda opi, sịnụ, ‘Absalọm aghọọla eze na Hebrọn!’”+ 11  Absalọm kpọrọ narị ụmụ nwoke abụọ (200), ha esi Jeruselem soro ya gawa ebe ahụ. Ha ji obi ọcha ha soro ya, ha amaghịkwa ihe na-aganụ. 12  Mgbe Absalọm chụrụ àjà ndị ahụ, o ziri ozi ka a kpọọrọ ya Ahitofel+ onye Gaịlo, onye ndụmọdụ Devid,+ ka o si n’obodo ya bụ́ Gaịlo+ bịa. Nkata ọjọọ Absalọm kpara nọ na-agaziri ya, ndị na-akwado ya nọkwa na-adịkwu ọtụtụ.+ 13  Ka oge na-aga, otu onye bịara gwa Devid, sị: “Ndị Izrel na-akwadozi Absalọm.” 14  Ozugbo ahụ, Devid gwara ndị niile na-ejere ya ozi ya na ha nọ na Jeruselem, sị: “Bịanụ ka anyị gbapụ,+ n’ihi na anyị agaghị agbanahụli Absalọm ma ọ bịakwute anyị. Meenụ ọsọ ọsọ, ka ọ ghara ịchụkwute anyị, gbuo anyị, jirikwa mma agha gbuo ndị obodo a.”+ 15  Ndị na-ejere eze ozi asị ya: “Anyị ga-eme ihe ọ bụla onyenwe anyị eze chọrọ.”+ 16  Eze na ndị ezinụlọ ya niile wee pụwa, ma ọ hapụrụ ụmụ nwaanyị iri, bụ́ ndị iko ya,+ ka ha na-elekọta ụlọ.* 17  Eze na ndị niile so ya wee na-aga, ma ha kwụsịtụrụ na Bet-mehak. 18  Eze na ndị niile na-ejere ya ozi so na-aga, ma ndị Keretaịt niile ma ndị Peletaịt*+ niile, ma narị ụmụ nwoke isii (600) bụ́ ndị Gat.+ Ha niile so eze na-aga, ya ana-eleru ha anya. 19  Eze wee sị Ịtaị+ onye Gat: “Gịnị mere i ji soro anyị? Laghachi ka gị na onye bụ́zi eze ugbu a biri, n’ihi na ị bụ onye mba ọzọ. I sikwa n’obodo gị bịa biri ebe a. 20  O tebeghị ị bịara. Olee otú m ga-esi hapụ gị taa ka i soro anyị na-awagharị, na-aga ebe ọ bụla m na-aga? Laghachi, kpọrọkwa ndị gị laghachi. Ka Jehova gosikwa gị na ya hụrụ gị n’anya nakwa na ya agaghị agbahapụ gị.”+ 21  Ma Ịtaị sịrị eze: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụrụ gịnwa bụ́ onyenwe m eze iyi na ma n’ọnwụ ma ná ndụ, ohu gị ga-anọ ebe ọ bụla onyenwe m eze nọ.”+ 22  Devid asị Ịtaị:+ “Ngwanụ, ka anyị na-aga.” Ịtaị onye Gat na ndị ya niile nakwa ụmụ ya niile wee soro Devid na-aga. 23  Ndị niile bi na Jeruselem nakwa ndị bi ya nso nọ na-ebesi ákwá ike mgbe Devid na ndị niile ya na ha so si na Ndagwurugwu Kidrọn na-agafe. Eze guzokwa n’akụkụ ndagwurugwu ahụ,+ ndị niile so ya ana-agafe na-aga n’ụzọ e si aga ala ịkpa. 24  Zedọk+ sokwa ná ndị ahụ, ya na ndị Livaị niile+ bu igbe ọgbụgba+ ndụ ezi Chineke.+ Ha busara Igbe ezi Chineke otu ebe, Abayata+ eguzoro n’akụkụ ya ruo mgbe mmadụ niile si n’obodo ahụ gafetachara. 25  Ma eze sịrị Zedọk: “Bughachi Igbe ezi Chineke n’obodo anyị.+ Ọ bụrụ na ihe m dị Jehova mma, ọ ga-akpọghachi m ka m hụ ya, hụkwa ebe a na-ebusa ya.+ 26  Ma ọ bụrụ na ihe m adịghị ya mma, ya mee m ihe ọ bụla dị ya mma.” 27  Eze sịkwara Zedọk onye nchụàjà: “Ọ̀ kwa ị bụdị onye ọhụ ụzọ?+ Gị na Abayata laghachi n’obodo anyị, kpọrọkwanụ Ahimaz nwa gị na Jonatan+ nwa Abayata. Ka ihe gaziekwara unu. 28  M ga-echeretụ n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri, nke dị nso n’ala ịkpa, ruo mgbe unu ga-ezi m ozi.”+ 29  Zedọk na Abayata wee bughachi Igbe ezi Chineke na Jeruselem, nọrọzie ebe ahụ. 30  Devid nọ na-ebe ákwá ka ọ na-agbago Ugwu Oliv.+ O kpuchikwara isi ya, gbara ụkwụ ọtọ na-agbago. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha, bere ákwá na-agbago. 31  A bịara kọọrọ Devid, sị: “Ahitofel so ná ndị ha na Absalọm+ na-akpa nkata ọjọọ.”+ Devid asị: “Jehova, biko,+ mee ka e were ndụmọdụ Ahitofel ka nke onye nzuzu.”+ 32  Mgbe Devid rutere n’ọnụ ọnụ ugwu ebe ndị mmadụ na-anọ akpọrọ Chineke isiala, Hushaị+ onye Akaịt+ bịakwutere ya. Ọ dọwara uwe ya adọwa, kpokwasịkwa ájá n’isi ya. 33  Ma, Devid sịrị ya: “O nweghị uru gịnwa iso m gafee ga-abara m. 34  Ma ọ bụrụ na ị laghachi sị Absalọm, ‘Eze, abụ m ohu gị. Abụ m ohu nna gị mgbe mbụ, ma ugbu a, abụzi m ohu gị,’+ ị ga-eme ka ndụmọdụ Ahitofel ghara ịba uru.+ 35  Zedọk na Abayata bụ́ ndị nchụàjà nọkwa ebe ahụ. Ihe ọ bụla ị nụrụ n’ụlọ eze, gị agaa kọọrọ Zedọk na Abayata bụ́ ndị nchụàjà.+ 36  Ụmụ ha abụọ, Ahimaz+ nwa Zedọk na Jonatan+ nwa Abayata, so ha nọrọ ebe ahụ. Gwanụ ha ihe ọ bụla unu ga-anụta ka ha bịa gwa m.” 37  Hushaị, enyi Devid,+ wee bata Jeruselem ka Absalọm na-abatakwa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụmụ nwoke iri ise ga na-agba ọsọ n’ihu ya.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.
O nwere ike ịbụ, “afọ iri anọ.”
Ma ọ bụ “m ga-efe Jehova.” Na Hibru, “m ga-ejere Jehova ozi.”
Na Hibru, “Gaa n’udo.”
Ma ọ bụ “obí eze.”
Ndị Keretaịt na ndị Peletaịt bụ ndị na-eche Devid nche.