Samuel nke Abụọ 16:1-23

  • Zaịba ghagidere Mefiboshet ụgha (1-4)

  • Shimiaị kpọrọ Devid iyi (5-14)

  • Absalọm nabatara Hushaị (15-19)

  • Aro Ahitofel tụụrụ Absalọm (20-23)

16  Mgbe Devid gafetụrụ ọnụ ọnụ ugwu ahụ,+ Zaịba+ onye na-ejere Mefiboshet+ ozi bịakwutere ya. Ọ kpụ jakị abụọ e dokwasịrị ihe e ji anọkwasị ha. Ha bukwa narị achịcha abụọ (200), otu narị (100) keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ, otu narị (100) keeki e ji mkpụrụ osisi fig na det mee nakwa otu nnukwu ite mmanya.+  Eze wee jụọ Zaịba, sị: “Gịnị mere i ji weta ihe ndị a?” Zaịba asị ya: “M kpụtara jakị ndị a ka eze na ezinụlọ ya na-agba ha. Ọ bụkwa ndị gị na ha so ka m wetaara achịcha ndị a na mkpụrụ osisi ndị a. Mmanya a bụkwa nke unu ga-aṅụ ma ike gwụ unu n’ala ịkpa.”+  Eze ajụọ ya, sị: “Ebee ka nwa* nna gị ukwu nọ?”+ Zaịba asị eze: “Ọ nọ na Jeruselem, n’ihi na ọ sịrị, ‘Ndị Izrel ga-enyeghachi m ọchịchị nna m taa.’”+  Eze sịziri Zaịba: “Ihe niile bụ́ nke Mefiboshet bụzi nke gị.”+ Zaịba asị: “Ana m akpọrọ gị isiala. Ka ihe m dị gị mma, onyenwe m eze.”+  Mgbe Eze Devid ruru Bahurim, ọ hụrụ otu nwoke, onye ezinụlọ Sọl hà. Aha ya bụ Shimiaị,+ nwa Gira. Nwoke ahụ nọ na-aga Devid nso, na-eti mkpu, na-akpọ ya iyi.+  Ọ nọkwa na-atụ Eze Devid na ndị niile na-ejere ya ozi nkume, na-atụkwa ndị agha niile na ndị dike niile nọ Devid n’aka nri na n’aka ekpe.  Shimiaị nọ na-akpọ ya iyi, sị: “Si ebe a pụọ, ogbu mmadụ. Si ebe a pụọ, nwoke na-abaghị uru.  Jehova akwụọla gị ụgwọ maka ndị ezinụlọ Sọl i gburu,* nakwa maka ọchịchị ya i weghaara. Ọ bụ ya mere Jehova ji nye Absalọm nwa gị ọchịchị. Ihe a na-eme gị n’ihi na ị bụ ogbu mmadụ.”+  Abishaị nwa Zeruya+ wee sị eze: “Gịnị mere nkịta a nwụrụ anwụ+ ga-eji na-akpọ onyenwe m eze iyi?+ Biko, ka m gaa gbupụ ya isi.”+ 10  Ma eze sịrị ya: “Olee otú ihe a si gbasa ụmụ Zeruya?+ Ya kpọwa m iyi.+ Ebe ọ bụ na Jehova gwara ya+ kpọọ m iyi, ònyezi ga-agwa ya ka ọ ghara ịkpọ m iyi?” 11  Devid gwakwara Abishaị na ndị niile na-ejere ya ozi, sị: “Ọ bụrụ na nwa m, onye bụ́ ọbara m,* na-achọ igbu m,+ ọ̀ bụzi onye ebo Benjamin bụ onye na-agaghị achọ igbu m?+ Hapụnụ ya ka ọ kpọwa m iyi, n’ihi na ọ bụ Jehova gwara ya kpọwa m iyi. 12  Jehova nwere ike hụ ahụhụ m na-ata.+ Jehova nwekwara ike mee ka iyi a a na-akpọ m taa ghọọ ngọzi.”+ 13  Devid na ndị so ya nọ na-aga n’okporo ụzọ ahụ, ma Shimiaị nọ ugwu ahụ nso na-aga n’akụkụ Devid, na-akpọ ya iyi,+ na-atụ ya nkume, na-ekpokwa ya ájá. 14  N’ikpeazụ, eze na ndị niile ya na ha so ruru ebe ha na-aga. Ike gwụchakwara ha. Ha wee nọrọ ebe ahụ zuwe ike. 15  Ma, Absalọm na ndị Izrel niile na-akwado ya gara Jeruselem. Ahitofel+ sokwa ya. 16  Mgbe Hushaị+ onye Akaịt,+ enyi Devid, bịakwutere Absalọm, ọ sịrị Absalọm: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!+ Eze, ị ga-adị ogologo ndụ!” 17  Absalọm ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ otú a ka i si egosi enyi gị na ị hụrụ ya n’anya? Gịnị mere na i soghị enyi gị gbapụ?” 18  Hushaị asị Absalọm: “Esoghị m ya gbapụ. Ana m akwado onye ọ bụla Jehova na ndị a nọ ebe a nakwa ndị Izrel ndị ọzọ họọrọ. Ebe onye ahụ nọ ka m kwụ. 19  Ka m kwuo ya ọzọ, Ònye ka m kwesịrị ịna-ejere ozi? Ó kwesịghị ịbụ nwa enyi m? Otú m jeere nna gị ozi ka m ga-ejere gịnwa.”+ 20  Absalọm mechara sị Ahitofel: “Gwa m ihe m ga-eme.*+ Gịnị ka anyị ga-eme?” 21  Ahitofel asị Absalọm: “Gaa ka gị na ndị iko nna gị, ndị ọ hapụrụ ka ha lekọtawa ụlọ,*+ dinaa.+ Ọ bụrụkwa na ndị Izrel niile anụ na i mere ihe a nakwa na ị kparịala nna gị, obi ga-esikwu ndị na-akwado gị ike.” 22  Ha wee maara Absalọm ụlọikwuu n’elu ụlọ.+ Absalọm na ndị iko nna ya ana-edina+ n’ihu ndị Izrel niile.+ 23  N’oge ahụ, ndụmọdụ Ahitofel na-adị ka à ga-asị na ọ bụ nke ezi Chineke. Otú ahụ ka ndụmọdụ Ahitofel+ niile na-adị ma Devid ma Absalọm.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nwa nwa.”
Na Hibru, “ị wụfuru ọbara ha.”
Ma ọ bụ “onye si n’ahụ́ m pụta.”
Ma ọ bụ “Nye m ndụmọdụ.”
Ma ọ bụ “obí eze.”