Samuel nke Abụọ 17:1-29

  • Hushaị tụrụ aro mere e ji hapụ nke Ahitofel (1-14)

  • A gara gwa Devid na Absalọm ga-egbu ya, ya agbaa ọsọ (15-29)

    • Bazilaị na ndị ọzọ buteere Devid onyinye (27-29)

17  Ahitofel sịrị Absalọm: “Biko, ka m họrọ puku mmadụ iri na abụọ (12,000) chụwa Devid n’abalị a.  M ga-agakwuru ya mgbe ike gwụrụ ya na mgbe ọ na-agaghị emeli ihe ọ bụla.*+ M ga-emekwa ka ụjọ jide ya. Ndị niile ya na ha nọ ga-agba ọsọ. M ga-egbukwa naanị eze.+  M ga-akpọghachitekwara gị mmadụ niile ahụ so ya. Nwoke a ị na-achọ nwụọ, ndị niile so ya ga-alọghachikwute gị, nọrọkwa n’udo.”  Ihe a o kwuru dị Absalọm na ndị okenye Izrel niile mma.  Ma, Absalọm sịrị: “Biko, kpọọkwa Hushaị,+ onye Akaịt, ka anyị nụ ihe yanwa ga-ekwu.”  Hushaị wee bịakwute Absalọm. Absalọm asị ya: “Lekwa lekwa ihe Ahitofel kwuru. Ọ̀ bụ anyị mee ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, kwuo ihe anyị ga-eme.”  Hushaị asị Absalọm: “Aro nke ugbu a Ahitofel tụrụ adịghị mma.”+  Hushaị kwukwara, sị: “Ị manụ na nna gị na ndị agha ya siri ezigbote ike,+ na-esikwa ọnwụ ka anụ ọhịa bea nke na-ahụkwaghị ụmụ ya n’ọhịa.+ Nna gị bụkwa dike n’agha.+ Ọ gaghịkwa eso ndị ahụ so ya nọrọ n’abalị.  Ka ọ dị ugbu a, o zoola n’otu ọgba* ma ọ bụ n’ebe ọzọ.+ Ọ bụrụkwa na o bu ụzọ lụso anyị agha, ndị nụrụ ya ga-asị, ‘E meriela ndị so Absalọm.’ 10  Ezigbo ụjọ ga-ejide ma dike nke obi ya dị ka obi ọdụm,+ n’ihi na ndị Izrel niile ma na nna gị bụ dike,+ marakwa na obi kara ndị so ya. 11  Aro m bụ: Ka a kpọkọtara gị ndị Izrel niile, malite na Dan ruo Bia-shiba,+ ndị hiri nne ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri.+ Ị ga-edukwa ha gaa agha. 12  Anyị ga-alụso ya agha ebe ọ bụla ọ sọrọ ya ya nọrọ. Anyị ga-aga n’ìgwè otú ahụ igirigi si ada lụso ya agha. O nweghịkwa onye n’ime ha anyị ga-ahapụ ndụ, ma yanwa ma ndị so ya. 13  E nweekwa obodo ọ gbabara, ndị Izrel niile ga-achịrị ụdọ banye na ya, jirikwa ụdọ dọrọ obodo ahụ dọkpuo na ndagwurugwu. A gaghịkwa ahapụ ọbụnadị otu obere okwute ebe ahụ.” 14  Absalọm na ndị Izrel niile so ya asị: “Ihe Hushaị onye Akaịt kwuru ka ihe Ahitofel kwuru mma.”+ Jehova ekpebiela na ya ga-eme ka ha ghara ige ntị n’ezigbo aro Ahitofel tụrụ,+ ka Jehova wee mee ka ọdachi dakwasị Absalọm.+ 15  Hushaị mechara gwa Zedọk na Abayata+ bụ́ ndị nchụàjà, sị: “Lekwa lekwa ihe Ahitofel gwara Absalọm na ndị okenye Izrel mee, ma lekwa lekwa ihe m gwara ha mee. 16  Ugbu a, zie mmadụ ka ọ gaa ọsọ ọsọ gwa Devid, sị: ‘N’abalị a, anọla n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri,* nke dị nso n’ala ịkpa. Kama gafee mmiri ahụ, ka a ghara igbu* eze na ndị niile so ya.’”+ 17  Jonatan+ na Ahimaz+ pụrụ gaa nọrọ n’En-rogel,+ ka a ghara inwe onye ga-ahụ ha. Otu nwa agbọghọ na-eje ozi gakwara kọọrọ ha ihe niile na-eme, ka ha gaa kọọrọ ya Eze Devid. 18  Ma, otu nwa okorobịa hụrụ ha gaa kọọrọ Absalọm. Ha abụọ wee gbapụ gbaba n’ụlọ otu nwoke na Bahurim.+ Nwoke ahụ nwere olulu mmiri n’èzí ya. Ha banyekwara n’ime ya. 19  Nwunye nwoke ahụ chịịrị ákwà kpuchie olulu mmiri ahụ, kpokwasịkwa ọka* a kụjasịrị akụjasị n’elu ya, ka a ghara ịma na e nwere ndị zoro ebe ahụ. 20  Ndị na-ejere Absalọm ozi wee bịakwute nwaanyị ahụ n’ụlọ ya, jụọ ya, sị: “Olee Ahimaz na Jonatan?” Nwaanyị ahụ asị ha: “Ha si ebe a gafee gawa na mmiri.”+ Ha chọgidere ha, ma ha achọtaghị ha. Ha alaghachizie Jeruselem. 21  Mgbe ndị ahụ na-achọ ha lawara, ha si n’olulu mmiri ahụ pụta gaa kọọrọ Eze Devid ihe merenụ. Ha gwara ya, sị: “Bilienụ, gafee mmiri a ngwa ngwa. Lekwa lekwa ihe Ahitofel kwuru ka e mee unu.”+ 22  Devid na ndị niile so ya biliri ozugbo ahụ, gafee Osimiri Jọdan. Tupu chi abọọ, ha niile agafechaala Osimiri Jọdan. 23  Mgbe Ahitofel hụrụ na e meghị ihe ọ tụrụ aro ka e mee, o dokwasịrị ihe a na-eji anọkwasị na jakị, gbara ya laa n’ụlọ ya dị n’obodo ha.+ Mgbe ọ gwachara ndị ezinụlọ ya ihe ha ga-eme,+ ọ kwụgburu onwe ya.+ Otú a ka o si nwụọ. E likwara ya ebe a na-eli ndị ezinụlọ ha. 24  N’oge ahụ, Devid gara Mahaneyim,+ ma Absalọm na ndị Izrel niile so ya gafere Osimiri Jọdan. 25  Absalọm họpụtara Amesa+ ka ọ nọchie Joab+ bụ́ onyeisi ndị agha. Amesa bụ nwa otu nwoke aha ya bụ Itra onye Izrel. O nwere mgbe nwoke a na Abigel dinara.+ Abigel a bụ nwa Nehash, bụrụkwa nwanne Zeruya, nne Joab. 26  Ndị Izrel na Absalọm wee maa ụlọikwuu ha na Gilied.+ 27  Ozugbo Devid ruru Mahaneyim, Shobaị nwa Nehash, onye Raba+ bụ́ obodo ndị Amọn, na Mekia+ nwa Amiel onye Lo-diba, na Bazilaị+ onye Rogilim dị na Gilied 28  butere àkwà,* nnukwu efere, ite ụrọ, ọka wit, ọka bali, ntụ ọka, ọka e ghere eghe,* akịdị, lentil,* ọka a mịrị amị, 29  mmanụ aṅụ, bọta, atụrụ, na chiiz.* Ha wetaara Devid na ndị so ya ihe ndị a niile ka ha na-eri.+ Ha sịrị: “Agụụ ji ndị a. Ike gwụkwara ha. Akpịrị na-akpọkwa ha nkụ n’ala ịkpa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mgbe aka ya abụọ na-adịghịzi ike.”
Ma ọ bụ “olulu; ndagwurugwu.”
O nwere ike ịbụ, “anọla n’ọzara.”
Na Hibru, “iloda.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ọka a ṅara n’ọkụ.”
Lentil yiri akịdị.
Ma ọ bụ “mmiri ara ehi kpụkọrọ akpụkọ.”