Samuel nke Abụọ 18:1-33

  • E meriri Absalọm, gbuokwa ya (1-18)

  • A bịara kọọrọ Devid na Absalọm anwụọla (19-33)

18  Devid gụrụ ndị so ya ọnụ, họpụtakwara ha ndị isi otu puku otu puku ndị agha na ndị isi otu narị otu narị ndị agha.+  Devid kere ndị so ya ụzọ atọ mgbe ọ na-ezipụ ha. Joab+ bụ onyeisi otu ụzọ, Abishaị+ nwa Zeruya,+ nwanne Joab, abụrụ onyeisi otu ụzọ, Ịtaị+ onye Gat abụrụkwa onyeisi otu ụzọ. Eze gwaziri ha, sị: “M ga-esokwa unu gaa.”  Ma ha sịrị: “Agala,+ n’ihi na naanị gị hà ka puku mmadụ iri (10,000) n’ime anyị.+ E nwee ka anyịnwa si gbaa ọsọ, o nweghị ihe ha ga-eji ya kpọrọ.* Ọ bụrụkwa na ọkara n’ime anyị anwụọ, o nweghị ihe ha ga-eji ya kpọrọ. N’ihi ya, ọ ga-aka mma ma ị nọrọ n’obodo a na-enyere anyị aka.”  Eze asị ha: “M ga-eme ihe ọ bụla dị unu mma.” Eze wee kwụrụ n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, mmadụ niile apụọ n’ìgwè n’ìgwè. E nwere ndị dị otu narị mmadụ otu narị mmadụ, nweekwa ndị dị otu puku mmadụ otu puku mmadụ.  Eze nyeziri Joab na Abishaị na Ịtaị iwu, sị: “Unu emerụkwala Absalọm ahụ́, maka na ọ bụ nwa m hụrụ n’anya.”+ Mmadụ niile nụkwara mgbe eze nyere ndị isi ahụ niile iwu a gbasara Absalọm.  Ha wee pụọ gawa n’ọhịa ịlụso ndị Izrel ndị ọzọ agha. Ha lụkwara agha ahụ n’oké ọhịa dị n’Ifrem.+  Ndị na-ejere Devid ozi+ meriri ndị Izrel+ ndị ọzọ ebe ahụ. E gbukwara ọtụtụ ndị n’ụbọchị ahụ. Puku mmadụ iri abụọ (20,000) nwụrụ.  Agha ahụ gbasakwara ná mpaghara niile n’ebe ahụ. N’ụbọchị ahụ, ndị oké ọhịa ahụ tara isi ha karịrị ndị e ji mma agha gbuo.  Absalọm mechara gbaba ebe ndị na-ejere Devid ozi nọ. Mgbe ọ hụrụ ha, ya agbaa ọsọ. Ka ọ gba jakị na-aga, jakị ahụ agbaba n’okpuru nnukwu osisi gbara agba nke alaka ya tụhịkọtara atụhịkọta. Isi Absalọm ekonye ná nnukwu osisi ahụ. Jakị ahụ ọ gba agbara na-aga, yanwa ekoro n’elu.* 10  Mgbe otu nwoke hụrụ ihe a merenụ, ọ gara kọọrọ Joab,+ sị: “Ahụrụ m ebe Absalọm ko n’otu nnukwu osisi.” 11  Joab gwara nwoke ahụ nọ na-akọrọ ya ihe ahụ, sị: “Gịnị mere na i gbughị ya ozugbo ị hụrụ ya? A sị na i gburu ya, m gaara enye gị mkpụrụ ego ọlaọcha iri na otu ájị̀.” 12  Ma nwoke ahụ sịrị Joab: “Ọ bụrụgodị na e nye m otu puku (1,000) mkpụrụ ego ọlaọcha, agaghị m akpa nwa eze aka, n’ihi na anyị nụrụ mgbe eze nyere gị na Abishaị na Ịtaị iwu, sị, ‘Kpacharanụ anya ka a ghara inwe onye ga-emerụ Absalọm nwa m nwoke ahụ́.’+ 13  A sị na m nupụrụ isi gbuo ya, o nweghị otú a ga-esi zoo ya, eze aghara imecha mara, gịnwa agaghịkwa azọ m.” 14  Joab wee sị: “Agaghị m anọ ebe a gị ana-egbu m oge.” Ọ gaziri chịrị ube atọ, gaa manye ha n’obi Absalọm mgbe ọ ka dị ndụ n’etiti nnukwu osisi ahụ. 15  Mmadụ iri ndị na-eburu Joab ngwá agha gakwara gbuo Absalọm.+ 16  Joab fụziri opi, ndị agha ahụ alọghachi, kwụsị ịchụ ndị Izrel ndị ọzọ. Otú a ka Joab si kwụsị ha. 17  Ha buuru Absalọm tụba ná nnukwu olulu dị n’oké ọhịa ahụ, tụkọjuokwa nkume n’elu ya.+ Ma ndị Izrel ndị nke ọzọ niile gbalara n’ụlọ ha. 18  Mgbe Absalọm dị ndụ, o buuru otu ogidi gwunyere ya onwe ya na Ndagwurugwu Eze.+ Ọ sịrị: “Amụtaghị m nwa nwoke ga na-aza aha m.”+ Ọ gụkwara ogidi ahụ aha ya. Ruokwa taa, a na-akpọ ya Ihe E Ji Echeta Absalọm. 19  Ma Ahimaz+ nwa Zedọk sịrị: “Biko, ka m gbara ọsọ gaa kọọrọ eze ihe merenụ, n’ihi na Jehova ekpepụtala ya n’aka ndị iro ya.”+ 20  Ma Joab sịrị ya: “Ọ bụghị gị ga-aga kọọ nke taa. Ụbọchị ọzọ gị akọwa. Ị gaghị akọ ihe merenụ taa, n’ihi na nwa eze anwụọla.”+ 21  Joab gwaziri otu onye Kush,+ sị: “Gaa kọọrọ eze ihe ị hụrụ.” Onye Kush ahụ akpọọrọ Joab isiala gbara gawa. 22  Ahimaz nwa Zedọk gwara Joab ọzọ, sị: “Ihe ọ bụla ga-eme, ya mee. Biko, ka m gbarakwa ọsọ soro onye Kush ahụ n’azụ.” Ma, Joab sịrị: “Nwa m, gịnị mere ị ga-eji gbara gawa mgbe ọ na-enweghị ihe ị na-aga ịkọ?” 23  Ma ọ sịrị: “Ihe ọ bụla ga-eme, ya mee. Ka m gbara gawa.” Joab asị ya: “Gbara gawa!” Ahimaz wee si ụzọ e si aga na ndagwurugwu Osimiri Jọdan gbara gawa, mechaakwa gbafee onye Kush ahụ. 24  Devid nọkwa ọdụ n’agbata ọnụ ụzọ ámá dị n’ime na nke dị ná mpụta obodo ọ nọ.+ Onye nche+ arịgoro n’elu ụlọ nke ọnụ ụzọ ámá dị na mgbidi, lepụ anya, hụ otu nwoke naanị ya ji ọsọ na-abịa. 25  Onye nche ahụ kpọrọ eze gwa ya ihe ọ hụrụ. Eze asị: “Ọ bụrụ naanị ya na-abịa, e nwere ihe ọ na-abịa ịkọrọ anyị.” Ka onye ahụ nọ na-abịarukwu nso, 26  onye nche ahụ hụrụ nwoke ọzọ ji ọsọ na-abịa. Onye nche ahụ wee kpọọ onye nche ọnụ ụzọ ámá, sị: “Nwoke ọzọ ji ọsọ na-abịa naanị ya!” Eze asị: “Onye nke a nwekwara ihe ọ na-abịa ịkọ.” 27  Onye nche ahụ asị: “Ụkwụ ọsọ onye nke mbụ dị m ka ụkwụ ọsọ Ahimaz+ nwa Zedọk.” Eze asị: “Ọ bụ ezigbo mmadụ. O ji ozi ọma na-abịa.” 28  Ahimaz kpọrọ eze, sị ya: “Nsogbu adịghị!” Ọ kpọkwaara eze isiala. O kwukwara, sị: “Ka e too Jehova bụ́ Chineke gị, onye nyefere gị ndị nupụụrụ onyenwe m eze isi!”+ 29  Ma, eze jụrụ ya, sị: “Absalọm nwa m nwoke ọ̀ dịkwa mma?” Ahimaz asị: “Tupu Joab ezie mụ na onye na-ejere eze ozi ịbịa hụ gị, ahụrụ m ka ebe niile nọ na-agba ghara ghara, ma amaghị m ihe kpatara ya.”+ 30  Eze asị ya: “Cheregodị, kwụrụ ebe a.” Ya agaa n’otu akụkụ kwụrụ. 31  Ma, onye Kush ahụ mechara bata,+ sị: “Ka onyenwe m eze nụ ozi a: Jehova ekpepụtala gị taa n’aka ndị niile na-enupụrụ gị isi.”+ 32  Ma eze jụrụ onye Kush ahụ, sị: “Absalọm nwa m nwoke ọ̀ dịkwa mma?” Onye Kush ahụ asị: “Ka ndị iro onyenwe m eze na ndị niile nupụụrụ gị isi, ndị na-achọ imerụ gị ahụ́, dịrị ka nwa okorobịa ahụ.”+ 33  Ihe a wutere eze, ya agbagoo n’ọnụ ụlọ dị n’elu ụlọ ọnụ ụzọ ámá na-ebe ákwá. Ọ nọkwa na-agagharị, na-asị: “Absalọm nwa m, nwa m, Absalọm nwa m! Ọ gaara akara m mma ma a sị na ọ bụ m nwụrụ kama gịnwa ga-anwụ, Absalọm nwa m, nwa m!”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “obi ha agaghị adị n’ebe anyị nọ.”
Na Hibru, “n’agbata eluigwe na ụwa.”