Samuel nke Abụọ 20:1-26

  • Shiba nwara iweghara ọchịchị; Joab gburu Amesa (1-13)

  • Ndị agha Devid chụrụ Shiba ọsọ, e gbupụkwara ya isi (14-22)

  • Ndị ha na Devid so na-achị (23-26)

20  Ma e nwere otu nwoke, bụ́ onye isi ike, aha ya bụ Shiba.+ Ọ bụ nwa Bikraị, onye ebo Benjamin. Ọ fụrụ opi,+ sị: “O nweghị ihe jikọrọ anyị na Devid. O nweghịkwa ihe nwa Jesi+ anyị ga-eketa. Ndị Izrel, onye ọ bụla gaa fewe chi ya!”*+  Ndị Izrel niile wee kwụsị iso Devid ma sowe Shiba nwa Bikraị.+ Ma, ndị Juda ahapụghị eze ha. Ha sooro ya malite n’Osimiri Jọdan ruo Jeruselem.+  Mgbe Devid lọrutere n’ụlọ* ya na Jeruselem,+ ọ kpọọrọ ndị iko ya iri ọ hapụrụ ka ha lekọtawa ụlọ,+ kpọsa n’ụlọ ebe a ga na-eche ha nche. Ọ nọ na-enye ha nri, ma ha na ya edinaghị.+ Ha nọgidere ebe ahụ ruo ụbọchị ha nwụrụ. N’agbanyeghị na di ha dị ndụ, ha dị ka ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ.  Eze gwaziri Amesa,+ sị: “Kpọkọọrọ m ndị Juda n’ime ụbọchị atọ, sorokwa ha bịa.”  Amesa wee gaa ka ọ kpọkọọ ndị Juda, ma ọ lọtaghị oge eze gwara ya ka ọ lọta.  Devid gwaziri Abishaị, sị:+ “Shiba+ nwa Bikraị ga-enye anyị nsogbu karịa Absalọm.+ Kpọrọ ndị na-ejere onyenwe gị ozi chụwa ya, ka ọ ghara ịgbaga n’otu obodo a rụsiri ike, wee gbanahụ anyị.”  N’ihi ya, ndị agha Joab,+ ndị Keretaịt, ndị Peletaịt,*+ na ndị dike niile chụwara ya. Ha si na Jeruselem pụọ, chụrụ Shiba nwa Bikraị gawa.  Mgbe ha nọ nso ná nnukwu nkume dị na Gibiọn,+ Amesa+ bịakwutere ha ebe ahụ. Ma Joab yi uwe agha ya. O kekwara mma agha nke dị n’ọbọ ya n’úkwù. Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, mma ahụ dapụtara n’ọbọ ya.  Joab wee jụọ Amesa, sị: “Nwanne m, ị̀ dịkwa mma?” Joab bịakwara jiri aka nri ya jide Amesa n’afụ ọnụ ka à ga-asị na ọ chọrọ isusu ya ọnụ. 10  Ma anya Amesa adịghị ná mma agha Joab ji n’aka. Joab wee were ya maa ya n’afọ,+ eriri afọ ya awụpụtasịa n’ala. Ọ maghịzi ya ọzọ. Otu nke ahụ ọ mara ya gburu ya. Joab na Abishaị nwanne ya nwoke achụrụzie Shiba nwa Bikraị gawa. 11  Otu n’ime ndị agha Joab gara guzoro n’akụkụ ebe Amesa tọgbọ, sị: “Onye ọ bụla na-akwado Joab nakwa onye ọ bụla bụ́ nke Devid sowe Joab.” 12  Ka ihe a na-eme, Amesa tọgbọ n’etiti okporo ụzọ na-atụrụ n’ọbara. Mgbe onye agha ahụ hụrụ na mmadụ niile na-akwụsị ma ha ruo ebe ahụ, o bupụrụ ya n’okporo ụzọ, buba ya n’ọhịa, kpuchiekwa ya ákwà. 13  Mgbe o bupụrụ ya n’okporo ụzọ, mmadụ niile sooro Joab chụwa Shiba+ nwa Bikraị. 14  Shiba gbafere ebo niile n’Izrel ruo Ebel-bet-meaka.*+ Ndị Bikraị niile zukọtakwara chụrụ ya banye n’obodo ahụ. 15  Joab na ndị agha ya bịara* nọchibido Shiba n’Ebel-Bet-meaka. Ha ji ájá rụọ mgbidi nke gbara mgbidi obodo ahụ gburugburu. Ha rụrụ ya iji lụso obodo ahụ agha. Ndị niile ha na Joab so nọkwa na-egwu ala n’úkwù mgbidi obodo ahụ, ka ha kwatuo ya. 16  Otu nwaanyị ma ihe si ná mgbidi obodo ahụ tie mkpu, sị: “Geenụ ntị, geenụ ntị! Biko, kpọọrọnụ m Joab. E nwere ihe m chọrọ ịgwa ya.” 17  Joab wee gakwuru ya, nwaanyị ahụ ajụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Joab?” Ya asị: “Ọ bụ m.” Nwaanyị ahụ asị ya: “Gee ohu gị nwaanyị ntị.” Ya asị: “M na-ege ntị.” 18  Nwaanyị ahụ asị ya: “N’oge gara aga, a na-ekwukarị, sị, ‘Ndị mmadụ nwee nsogbu, ha gaa jụọ ase n’Ebel. Nsogbu ha ga-ebikwa.’ 19  M na-anọchite anya ndị na-eme udo na ndị na-erube isi n’Izrel. Ị na-achọ igbuchapụ ndị bi n’obodo nke dị ka nne n’Izrel. Gịnị mere ị ga-eji egbu* ndị Jehova?”+ 20  Joab asị: “Tụfịakwa. Agaghị m egbu ha. Agaghịkwa m ebibi ha. 21  Ọ bụghị ihe m chọrọ ime. Kama, e nwere otu nwoke gbabatara n’obodo unu, onye si n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+ Ọ na-ama Eze Devid aka. Aha ya bụ Shiba.+ Ọ bụ nwa Bikraị. Unu kpọpụtahaala ya, m ga-ahapụ obodo a.” Nwaanyị ahụ asị Joab: “A ga-esi ná mgbidi tụfetara gị isi ya.” 22  Ozugbo ahụ, nwaanyị ahụ ma ihe gara gwa ndị obodo ya niile, ha egbupụ Shiba nwa Bikraị isi, tụọkwara ya Joab. Ya afụzie opi, ya na ndị agha ya esi n’obodo ahụ lasasịa. Onye ọ bụla n’ime ha lakwara n’ụlọ ya.+ Joab laghachikwukwaara eze na Jeruselem. 23  Joab bụ onyeisi ndị agha Izrel niile.+ Benaya+ nwa Jehoyada+ bụ onyeisi ndị Keretaịt na ndị Peletaịt.+ 24  Adoram+ bụ onyeisi ndị eze manyere ka ha na-arụrụ ya ọrụ. Jehoshafat+ nwa Ahaịlọd bụ onye na-edekọ ihe. 25  Shiva bụ odeakwụkwọ, Zedọk+ na Abayata+ abụrụ ndị nchụàjà. 26  Aịra onye Jeya ghọkwara onyeisi ndị na-ejere Devid ozi.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “onye ọ bụla laa n’ụlọikwuu ya.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ndị Keretaịt na ndị Peletaịt bụ ndị na-eche Devid nche.
Ma ọ bụ “Ebel nke Bet-meaka.”
Na Hibru, “Ha bịara.”
Na Hibru, “eloda.”
Na Hibru, “onye nchụàjà Devid.”