Samuel nke Abụọ 24:1-25

  • Devid mehiere maka na ọ gụrụ ndị obodo ya ọnụ (1-14)

  • Ọrịa na-efe efe gburu puku mmadụ iri asaa (15-17)

  • Devid rụrụ ebe ịchụàjà (18-25)

    • A naghị achụ àjà n’emefughị ihe ọ bụla (24)

24  Jehova wesara ndị Izrel iwe ọzọ+ mgbe otu onye mere ka Devid mee ihe ga-akpatara ha nsogbu. Onye ahụ gwara Devid, sị: “Gaa gụọ ndị Izrel na Juda ọnụ.”+  Eze wee gwa Joab+ ya na ya nọ, onye bụ́kwa onyeisi ndị agha, sị: “Biko, gagharịanụ n’ebo niile n’Izrel, malite na Dan ruo Bia-shiba,+ debanụ aha ndị mmadụ n’akwụkwọ, ka m mara ole ndị Izrel dị.”  Ma Joab sịrị eze: “Ka Jehova bụ́ Chineke gị mee ka ndị ya hikwuo nne otu narị (100) okpukpu, ka onyenwe m eze jirikwa anya ya hụ ya. Ma, oleedị ihe mere onyenwe m eze ji chọọ ime ụdị ihe a?”  Ma, eze siri ọnwụ ka Joab na ndị isi ndị agha mee ihe o kwuru. N’ihi ya, Joab na ndị isi ndị agha hapụrụ eze gawa ideba aha ndị Izrel n’akwụkwọ.+  Ha gafere Osimiri Jọdan, maa ụlọikwuu n’Aroa,+ n’ebe ndịda* obodo dị n’etiti otu ndagwurugwu. Ha gakwara n’ala ebo Gad, gaakwa Jeza.+  Ha sikwa ebe ahụ gaa Gilied+ na Tatim-họdshaị, gara ruo Dan-jean, ruokwa Saịdọn.+  Ha mechakwara gaa ebe a rụsiri ike na Taya,+ gaakwa n’obodo ndị Haịvaịt+ niile nakwa nke ndị Kenan niile. Ha kwụsịziri na Bia-shiba,+ nke dị na Negeb*+ nke Juda.  Ha si otú a gazuo ala ahụ niile, laghachikwa Jeruselem mgbe ọnwa itoolu na ụbọchị iri abụọ gachara.  Joab wee gwa eze mmadụ ole e debara aha ha n’akwụkwọ. Ndị Izrel, ndị ga-agali agha, dị narị puku asatọ (800,000), ndị nke Juda adịrị narị puku ise (500,000).+ 10  Ma, obi* Devid malitere ịpịa ya ụtarị+ mgbe ọ gụchara ndị mmadụ ọnụ. Devid gwaziri Jehova, sị: “Emeela m ezigbote mmehie.+ Ma ugbu a, Jehova, biko, gbaghara ohu gị mmehie ya,+ n’ihi na ezuzuola m nnọọ nzuzu.”+ 11  Mgbe Devid biliri n’ụtụtụ, Jehova gwara Gad+ onye amụma, bụ́ onye na-ahụrụ Devid ọhụụ, sị: 12  “Gaa sị Devid, ‘Jehova kwuru, sị: “Họrọ nke m ga-eme gị n’ime ihe atọ a.”’”+ 13  Gad wee gakwuru Devid sị ya: “Ị̀ chọrọ ka ụnwụ daa n’ala gị afọ asaa?+ Ka ị̀ chọrọ ka ndị iro gị na-achụ gị, gị ana-agbara ha ọsọ ruo ọnwa atọ?+ Ka ị̀ chọrọ ka ọrịa na-efe efe dịrị n’ala gị ụbọchị atọ?+ Chebara ya echiche gwa m nke ị chọrọ ka m gaa gwa Chineke, onye ziri m ozi a.” 14  Devid asị Gad: “Ihe a na-agbawa m obi. Biko, ka anyị daba n’aka Jehova,+ n’ihi na ọ na-eme ebere nke ukwuu.+ Ma, ka anyị ghara ịdaba n’aka mmadụ.”+ 15  Jehova wee mee ka e nwee ọrịa na-efe efe+ n’Izrel malite n’ụtụtụ ruo oge e kwuru na ọ ga-akwụsị. Puku mmadụ iri asaa (70,000) nwụkwara+ n’Izrel malite na Dan ruo Bia-shiba.+ 16  Mgbe otu mmụọ ozi matịrị aka ka o gbuchapụ ndị bi na Jeruselem, Jehova meteere ha ebere.+ Ọ gwaziri mmụọ ozi ahụ chọrọ igbuchapụ ndị Izrel, sị: “O zuola! Wetuo aka gị.” Mmụọ ozi Jehova nọ nso n’ebe Arọna onye Jebus na-anọ azọcha ọka.+ 17  Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ nọ na-egbu ndị mmadụ, ọ sịrị Jehova: “Ọ bụ m mehiere, ọ bụkwa m mejọrọ ihe. Gịnị ka atụrụ+ ndị a mere? Biko, bịa gbuo mụ na ndị ezinụlọ nna m.”+ 18  Gad wee bịakwute Devid n’ụbọchị ahụ, sị ya: “Gaa rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà n’ebe Arọna onye Jebus na-anọ azọcha ọka.”+ 19  Devid gawakwara ka o mee ihe Gad gwara ya, otú Jehova kwuru ka o mee. 20  Mgbe Arọna lepụrụ anya hụ ka eze na ndị na-ejere ya ozi na-abịa ebe ọ nọ, ọ pụtara ozugbo gbuo ikpere n’ala, kpọọrọ eze isiala. 21  Arọna jụrụ ya, sị: “Gịnị mere onyenwe m eze ji bịa na nke ohu ya?” Devid asị ya: “Ọ bụ ka m zụrụ ebe ị na-anọ azọcha ọka, rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà ebe ahụ, ka ọ kwụsị ịta ndị Izrel ahụhụ.”+ 22  Ma Arọna sịrị Devid: “Onyenwe m eze, were ya. Jirikwa ihe ọ bụla dị gị mma chụọ àjà. Lee ehi ị ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ, werekwa ihe e ji eticha ọka nakwa osisi e ji ejikọta ehi mere nkụ. 23  Eze, mụnwa bụ́ Arọna na-enye gị ihe a niile.” Arọna gwakwara eze, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke gị meere gị amara.” 24  Ma, eze sịrị Arọna: “Mba, m ga-azụrịrị ya azụ. Agaghị m achụrụ Jehova bụ́ Chineke m àjà a na-esu ọkụ n’emefughị ihe ọ bụla.” Devid wee zụọ ebe ahụ a na-anọ azọcha ọka nakwa ehi ahụ shekel* ọlaọcha iri ise.+ 25  Devid wee rụọrọ Jehova ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ, chụọkwa àjà a na-esu ọkụ na àjà udo. Jehova nabatakwara arịrịọ ha na-arịọ ya maka ala ahụ,+ kwụsịzie igbu ndị Izrel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’aka nri.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ma ọ bụ “akọnuche.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.