Samuel nke Abụọ 3:1-39

  • Ezinụlọ Devid nọ na-esikwu ike (1)

  • Ụmụ Devid ndị nwoke (2-5)

  • Abna bịara kwadowezie Devid (6-21)

  • Joab gburu Abna (22-30)

  • Devid ruuru Abna uju (31-39)

3  Ndị ezinụlọ Sọl na ndị ezinụlọ Devid lụtere agha aka. Devid nọ na-esikwu ike,+ ma ezinụlọ Sọl nọ na-ada ada.+  Ka ihe a na-eme, a mụụrụ Devid ụmụ ndị nwoke na Hebrọn.+ Ọkpara ya bụ Amnọn.+ Nne Amnọn bụ Ahịnoam+ onye Jezril.  Nke abụọ bụ Kiliab. Nne ya bụ Abigel+ onye Kamel, onye bụ́bu nwunye Nebal. Nke atọ bụ Absalọm.+ Nne ya bụ Meaka, nwa Talmaị+ eze Geshọ.  Nke anọ bụ Adọnaịja+ nwa Hagit. Nke ise bụ Shefataya nwa Abaịtal.  Nke isii bụ Itriam. Nne ya bụ Egla, nwunye Devid. Ndị a ka a mụụrụ Devid na Hebrọn.  Ka ezinụlọ Sọl na ezinụlọ Devid nọ na-alụ agha, Abna+ nọ na-eme ka ọkwá ya n’ezinụlọ Sọl na-arịkwu.  Sọl nwere iko nwaanyị aha ya bụ Rizpa,+ nwa Eya. Ish-boshet+ mechakwara sị Abna: “Gịnị mere gị na iko nna m ji dinaa?”+  Ihe a Ish-boshet jụrụ Abna were ya ezigbo iwe, ya asị: “M̀ bụ isi nkịta ndị Juda? Ruokwa taa, egosila m ezinụlọ Sọl nna gị na ụmụnne ya na ndị enyi ya na m hụrụ ha n’anya. Ekwebeghịkwa m ka aka Devid kpara gị. Ma, ihe ị kpọrọ m taa na-ajụ m gbasara ya bụ ihe ọjọọ ị sị na mụ na nwaanyị mere.  Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike, ma ọ bụrụ na mụ emereghị Devid ihe Jehova ṅụrụ iyi na ọ ga-emere ya.+ 10  Ọ ṅụụrụ Devid iyi na ọ ga-enye ya alaeze ezinụlọ Sọl, meekwa ka ocheeze Devid sie ike ịchị Izrel na Juda, malite na Dan ruo Bia-shiba.”+ 11  O nweghịkwa ihe ọ bụla Ish-boshet gwara Abna n’ihi na ụjọ ya na-atụ ya.+ 12  Ozugbo ahụ, Abna ziri ndị gakwuuru Devid ma gwa ya na Abna sịrị: “Ònyedị nwe ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. M ga-emekwa ihe ọ bụla m nwere ike ime ka ndị Izrel niile dụnyere gị úkwù.”+ 13  Devid asị ya: “Ọ dị mma. Mụ na gị ga-agba ndụ. Naanị ihe m ga-agwa gị bụ ka ị ghara ịnwa anwa bịa hụ m ọ gwụkwala ma ị̀ na-abịa ịkpọtara m Maịkal,+ nwa Sọl.’” 14  Devid zigaziri ndị gakwuuru Ish-boshet,+ nwa Sọl, sị ya: “Kpọnye m Maịkal nwunye m, onye m ji otu narị apị́ ndị Filistia kwe nkwa ịlụ.”+ 15  Ish-boshet wee zie ozi ka a kpọpụta Maịkal n’aka di ya, bụ́ Paltiel+ nwa Leyish. 16  Ma di ya beere ákwá na-eso ya n’azụ ruo Bahurim.+ Abna asị ya: “Laghachi.” Ya alaghachi. 17  Ka ihe a niile na-eme, Abna ziri ndị mmadụ ha agaa gwa ndị okenye Izrel, sị: “O teela unu chọwara ka Devid bụrụ eze unu. 18  Ugbu a bụ oge ichi ya eze, n’ihi na Jehova sịrị ya: ‘M ga-esi n’aka Devid ohu m+ napụta ndị m bụ́ Izrel n’aka ndị Filistia nakwa n’aka ndị iro ha niile.’” 19  Abna gaziri gwa ndị Benjamin okwu,+ gaakwa Hebrọn ka naanị ya na Devid kpaa, ka ọ gwa ya ihe ndị Benjamin niile na ndị Izrel ndị ọzọ kwekọrịtara. 20  Mgbe Abna kpọ mmadụ iri abụọ bịa ịhụ Devid na Hebrọn, Devid meere ha oriri. 21  Abna asị Devid: “Ka m gaa kpọkọta ndị Izrel niile ka ha bịakwute onyenwe m eze, ka gị na ha gbaa ndụ. Ị ga-abụkwa eze ndị niile ị chọrọ ịchị.”* Devid asị Abna gaa nke ọma. Abna alawa n’udo. 22  Ozugbo ahụ, Joab na ndị na-ejere Devid ozi si ebe ha gara agha na-alọta. Ihe ha kwatara hikwara nne. Ma, Abna anọghịzi na Hebrọn, n’ihi na Devid agwala ya ka ọ lawa n’udo. 23  Mgbe Joab+ na ndị agha niile ya na ha so lọtara, a kọọrọ ya, sị: “Abna+ nwa Nee+ bịakwutere eze, ya na ya anọchaa, eze agwa ya ka ọ lawa, ya alawa n’udo.” 24  Joab wee gakwuru eze, sị ya: “À ga-akpọkwanụ ihe a i mere gịnị? Gịnị mere i ji hapụ Abna bịakwutere gị, ya alawa n’udo? 25  Ị manụ Abna nwa Nee nke ọma. Ọ bịara ebe a ka ọ ghọgbuo gị, mara ije gị niile, marakwa ihe niile ị na-eme.” 26  Joab wee hapụ Devid gaa zie ụfọdụ ndị ka ha chụwa Abna. Ha achụkwute ya n’olulu mmiri Saịra, kpọrọ ya laghachi. Ma Devid amaghị ihe ọ bụla gbasara ya. 27  Mgbe Abna laghachiri Hebrọn,+ Joab kpọpụrụ ya iche, ha abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ka ọ gwa ya okwu na nzuzo. Ma, ọ mara ya mma n’afọ ebe ahụ, ya anwụọ.+ O gburu ya maka na o gburu Asahel nwanne ya.+ 28  Mgbe Devid mechara nụ ya, ọ sịrị: “Jehova ma na e nweghị mgbe ọbara Abna nwa Nee ga-adị n’isi mụ na alaeze m.+ 29  Ka ọbara ya dịrị n’isi Joab+ nakwa n’isi ezinụlọ nna ya niile. Ka a na-enwekwa mgbe niile n’ezinụlọ Joab nwoke nwere nsogbu n’ihe o ji bụrụ nwoke+ ma ọ bụ onye ekpenta+ ma ọ bụ nwoke dara ngwọrọ* ma ọ bụ onye e ji mma agha gbuo ma ọ bụ onye nri kọrọ.”+ 30  Otú a ka Joab na Abishaị+ nwanne ya si gbuo Abna+ maka na o gburu Asahel nwanne ha n’agha+ na Gibiọn. 31  Devid gwaziri Joab na ndị niile ya na ha nọ, sị: “Dọwaanụ uwe unu, keekwanụ ákwà iru uju n’úkwù, beekwaranụ Abna ákwá.” Eze Devid nọkwa na-eso ndị bu ihe e ji buru ozu Abna n’azụ. 32  Ha wee lie Abna na Hebrọn. Eze ana-eti, na-ebe ákwá n’ili Abna. Mmadụ niile nọkwa na-ebe ákwá. 33  Eze wee jiri Abna bụọ abụ iru uju, sị: “Abna ò kwesịrị ịnwụ ka onye nzuzu? 34  E keghị aka gị agbụ. A tụghịkwa gị ịga n’ụkwụ. Ị dara ka onye dara n’ihu ndị ọjọọ.”*+ Mmadụ niile wee beere ya ákwá ọzọ. 35  E mechaa, mmadụ niile bịara mgbe chi na-ejibeghị, na-arịọ Devid ka o rie nri.* Ma Devid ṅụrụ iyi, sị: “Ka Chineke taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike ma ọ bụrụ na mụ erie nri ma ọ bụ detụ ihe ọ bụla ọzọ ọnụ tupu anyanwụ adaa.”+ 36  Mmadụ niile hụkwara ihe merenụ, ya adị ha mma. Ihe a dị mmadụ niile mma otú ihe niile eze na-eme si adị ha. 37  Ndị nke Devid niile na ndị Izrel niile wee mara n’ụbọchị ahụ na aka eze adịghị n’ogbugbu e gburu Abna nwa Nee.+ 38  Eze gwaziri ndị na-ejere ya ozi, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụ onyeisi na onye ukwu nwụrụ taa n’Izrel?+ 39  Taa, adịghị m ike, ọ bụ eziokwu na e tere m mmanụ ịbụ eze.+ Amaghịkwa m ihe m ga-eme ụmụ Zeruya,+ bụ́ ụmụ nwoke obi fere azụ.+ Ka Jehova kwụọ onye na-eme ihe ọjọọ ụgwọ ihe ọjọọ ọ na-eme.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị chọrọ ịchị.”
Ya bụ, nwoke ọrụ ọ ga-arụli bụ ọrụ ụmụ nwaanyị. Ọ gaghị agali agha ma ọ bụ rụọ ọrụ ndị ọzọ ụmụ nwoke na-arụ.
Na Hibru, “ụmụ ajọ omume.”
Ma ọ bụ “ka ha nye Devid nri iji gụgụọ ya obi.”