Samuel nke Abụọ 4:1-12

  • E gburu Ish-boshet (1-8)

  • Devid nyere iwu, e gbuo ndị gburu Ish-boshet (9-12)

4  Mgbe Ish-boshet nwa Sọl+ nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn,+ ezigbo ụjọ jidere ya. Ọnwụ Abna wutekwara ndị Izrel niile.  E nwere ụmụ nwoke abụọ, bụ́ ndị isi ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga na-ejere nwa Sọl ozi. Aha otu n’ime ha bụ Beana, aha onye nke ọzọ abụrụ Rikab. Ha bụ ụmụ Rimọn, onye Bierọt, onye ebo Benjamin. (N’ihi na a na-agụnyebu Bierọt+ n’ebo Benjamin.  Ma ndị Bierọt gbagara Giteyim,+ bụrụ ndị mbịarambịa n’ebe ahụ ruo taa.)  Ma e nwere nwa nwoke Jonatan,+ nwa Sọl, dara ngwọrọ.+ Ọ dị afọ ise mgbe e si Jezril zite ozi na Sọl na Jonatan anwụọla.+ Onye na-elekọta ya wee kuru ya gbawa ọsọ, ma ka o ji ụjọ na-agba ọsọ, nwata ahụ dara ma daa ngwọrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.+  Rikab na Beana, bụ́ ụmụ Rimọn onye Bierọt, gawara n’ụlọ Ish-boshet n’etiti ehihie, ka ọ nọ na-ehi ụra ehihie.  Rikab na Beana+ nwanne ya nwoke batara n’ụlọ ahụ, mee ka hà bịara ikporo ọka wit, maa Ish-boshet mma n’afọ, gbapụ.  Mgbe ha banyere n’ụlọ ahụ, o dina n’àkwà* ya dị n’ime ime ụlọ ya, ha amagbuo ya, gbupụkwa ya isi. Ha bukwaara isi ya na-aga n’ụzọ e si aga Araba n’abalị ahụ niile.  Ha buteere eze Devid isi Ish-boshet+ na Hebrọn, sị ya: “Lee isi Ish-boshet nwa Sọl onye iro gị,+ onye nọ na-achụgharị gị ka o gbuo gị.+ Taa, Jehova akwụọla Sọl na ụmụ ya ụgwọ ihe niile o mere onyenwe anyị eze.”  Ma, Devid gwara Rikab na Beana nwanne ya, bụ́ ụmụ Rimọn onye Bierọt, sị: “Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye napụtara m* ná nsogbu m niile,+ ma na 10  mgbe otu onye bịara na Ziklag gwa m na Sọl anwụọla,+ o chere na ọ bụ ozi ọma ka ọ na-ezi m, ma m gburu ya ebe ahụ.+ Ọ bụ otú ahụ ka m si kwụọ ya ụgwọ ozi ahụ ọ bịara zie m. 11  Marazienụ ihe ga-eme mgbe ndị ajọ omume gara n’ụlọ onye ezi omume gbuo ya n’elu àkwà* ya. Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịta unu ahụhụ,+ kpochapụkwa unu n’ụwa, maka igbu ya?”* 12  Devid gwaziri ndị na-ejere ya ozi ka ha gbuo ha.+ Ha egbuo ha, gbupụkwa ha ụkwụ na aka ma kwụwa ozu ha n’osisi+ n’akụkụ ọdọ mmiri dị na Hebrọn. Ha buukwara isi Ish-boshet lie na Hebrọn ebe e liri Abna.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “napụtara mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ịwụfu ọbara ya.”