Samuel nke Abụọ 6:1-23

  • E butere Igbe Chineke na Jeruselem (1-23)

    • Chineke gburu Ọza mgbe o jidere Igbe ya aka (6-8)

    • Maịkal ledara Devid anya (16, 20-23)

6  Devid kpọkọtakwara puku ụmụ nwoke iri atọ (30,000) n’Izrel bụ́ ọkà n’ịlụ agha.  Ya na ndị niile ya na ha so wee gawa Beli-juda ka ha si ebe ahụ bute Igbe ezi Chineke,+ nke ndị mmadụ na-anọ n’ihu ya eto aha Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob.+  Ha gara n’ụlọ Abinadab dị n’elu ugwu+ jiri ụgbọala ọhụrụ anụmanụ na-adọkpụ buru Igbe ezi Chineke+ dị ebe ahụ pụwa. Ọza na Ahayo, ụmụ Abinadab, nọkwa na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ.  Otú ahụ ka ha si si n’ụlọ Abinadab dị n’elu ugwu buru Igbe ezi Chineke pụọ. Ahayo nọkwa na-aga Igbe ahụ n’ihu.  Devid na ndị Izrel niile nọkwa na-enwe aṅụrị n’ihu Jehova, jiri ụdị ngwá egwú niile e ji osisi junipa rụọ na-eti egwú. Ha ji ma une ma ụbọ akwara+ ma obere ịgbà+ ma ájà ma ngwá egwú ndị ọzọ.+  Ma, mgbe ha ruru ebe a na-akpọ Nekọn, bụ́ ebe a na-azọcha ọka, Ọza matịrị aka jide Igbe ezi Chineke,+ n’ihi na ọ fọrọ obere ka ehi ndị kpụ ụgbọala ahụ kwatuo Igbe ahụ.  Jehova bụ́ ezi Chineke wee wesa Ọza ezigbo iwe, gbuokwa ya+ ebe ahụ maka na ọ dara iwu ya.+ Ọ nwụkwara ebe ahụ n’akụkụ Igbe ezi Chineke.  Ma iwe were Devid maka na Jehova wesara Ọza ezigbo iwe. A na-akpọkwa ebe ahụ Pirez-ọza* ruo taa.  Ihe a mere ka Devid tụọ Jehova egwu+ n’ụbọchị ahụ, ya asị: “Olee otú m ga-esi bute Igbe Jehova n’ụlọ m?”+ 10  Devid hapụziri ibute Igbe Jehova n’ụlọ ya dị n’Obodo Devid.+ Kama ibute ya ebe ahụ, o kwuru ka e buga ya n’ụlọ Obed-ịdọm+ onye Gat. 11  Igbe Jehova wee dịrị n’ụlọ Obed-ịdọm onye Gat ruo ọnwa atọ. Jehova nọkwa na-agọzi Obed-ịdọm na ezinụlọ ya niile.+ 12  A bịara kọọrọ Eze Devid, sị: “Jehova agọziela Obed-ịdọm na ihe niile o nwere maka Igbe ezi Chineke dị n’ụlọ ya.” Devid wee jiri ọṅụ gawa ka o bupụta Igbe ezi Chineke n’ụlọ Obed-ịdọm, buru ya gawa n’Obodo Devid.+ 13  Mgbe ndị bu Igbe Jehova+ zọrọ nzọụkwụ isii, Devid chụrụ ehi na anụ gbara agba n’àjà. 14  Devid ji ike ya niile na-agba egwú n’ihu Jehova. N’oge ahụ niile, Devid yi efọd e ji ákwà linin kwaa.+ 15  Ka Devid na ndị Izrel niile bu Igbe Jehova na-alọta,+ ha nọ na-eti mkpu,+ na-aṅụrị ọṅụ, na-afụkwa opi.+ 16  Ma, mgbe e bubatara Igbe Jehova n’Obodo Devid, Maịkal nwa Sọl,+ si na windo lepụ anya hụ Eze Devid ka ọ na-awụli elu, na-agbakwa egwú n’ihu Jehova, ya ebido ileda Devid anya n’obi ya.+ 17  Otú a ka ha si bubata Igbe Jehova ma dọsa ya n’ebe ọ ga na-adị n’ụlọikwuu ahụ Devid mara maka ya.+ E mechaa, Devid chụụrụ Jehova àjà+ a na-esu ọkụ+ na àjà udo.+ 18  Mgbe Devid chụchara àjà a na-esu ọkụ na àjà udo, ọ gọziri ndị Izrel n’aha Jehova nke ụsụụ ndị agha. 19  O nyekwara mmadụ niile, ya bụ, ndị Izrel niile, nwoke ọ bụla na nwaanyị ọ bụla, otu achịcha, otu keeki mkpụrụ osisi det, na otu keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ. Mgbe e mechara, onye ọ bụla lara n’ụlọ ya. 20  Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ezinụlọ ya, Maịkal, nwa Sọl,+ bịara zute ya. Ọ gwakwara Devid, sị: “Eze Izrel emeela onwe ya ka ọ dị ebube taa mgbe ọ nọ n’ihu ndị ohu nwaanyị nke ndị na-ejere ya ozi gbara ọtọ na-agba egwú, otú onye nzuzu si agba onwe ya ọtọ n’ihu ọha.”+ 21  Devid asị Maịkal: “M nọ n’ihu Jehova na-enwe aṅụrị. Ọ bụ ya họọrọ m kama ịhọrọ nna gị na ezinụlọ ya. Ọ bụkwa Jehova mere m onye ndú nke ndị ya bụ́ Izrel.+ N’ihi ya, m ga-aṅụrị ọṅụ n’ihu Jehova. 22  M ga-ewedakwa onwe m ala karịa otú a. E nweghịkwa ihe m ga-eji onwe m kpọrọ. Ma, ọ bụ ndị ohu nwaanyị ahụ i kwuru gbasara ha ga-eto m.” 23  Maịkal, nwa Sọl,+ amụtaghị nwa ruo ụbọchị ọ nwụrụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
Pirez-ọza pụtara “Iwe E Wesara Ọza.”