Samuel nke Abụọ 7:1-29

  • Ọ bụghị Devid ga-arụ ụlọ nsọ Chineke (1-7)

  • Chineke kwere Devid nkwa na alaeze ya ga-adịgide (8-17)

  • Ekpere Devid kpere iji kelee Chineke (18-29)

7  Mgbe eze kwabachara n’ụlọ* ya,+ Jehova emeekwa ka o zuoro ndị iro niile gbara ya gburugburu ike,  eze gwara Netan+ onye amụma, sị: “Ugbu a, ebi m n’ụlọ e ji osisi sida rụọ,+ ma, a ka na-adọsa Igbe ezi Chineke n’ụlọikwuu.”+  Netan asị eze: “Gaa mee ihe ọ bụla dị gị n’obi ime, n’ihi na Jehova nọnyeere gị.”+  Ma n’abalị ụbọchị ahụ, Jehova gwara Netan, sị:  “Gaa gwa Devid ohu m, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi?+  Ebitụbeghị m n’ụlọ malite n’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel ruokwa taa.+ Kama, m na-esi n’otu ụlọ ndò aga n’ụlọ ndò ọzọ, na-esikwa n’otu ụlọikwuu aga n’ụlọikwuu ọzọ.+  M so ndị Izrel na-agagharị kemgbe. Ọ bụ m na-ahọpụta onye ga-azụ Izrel ndị m ka atụrụ. È nwetụla mgbe ị nụrụ na m gwara otu n’ime ha ka o jiri osisi sida rụọrọ m ụlọ?”’  Gwakwa Devid ohu m, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ị nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ ka ha na-ata ahịhịa,+ mụ abịa kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú ndị m Izrel.+  M ga-anọnyere gị ebe ọ bụla ị na-aga.+ M ga-egbu ndị iro gị niile.+ M ga-emekwa ka aha gị na-ede ude+ ka aha ndị ukwu bi n’ụwa. 10  M ga-enye ndị m Izrel otu ebe, ha ga-ebikwa ebe ahụ. A gaghị enwe onye ga-enye ha nsogbu. Ndị ọjọọ agaghịkwa emekpa ha ahụ́ ọzọ otú ha mere na mbụ,+ 11  malite n’oge m na-ahọpụta ndị ikpe+ ka ha bụrụ ndị isi ndị m Izrel. M ga-emekwa ka i zuoro ndị iro gị niile ike.+ “‘“Jehova agwala gị na Jehova ga-arụrụ gị ụlọ.*+ 12  Mgbe ị nwụrụ,+ e liekwa gị otú e liri nna nna gị hà, m ga-echi nwa* gị, onye ị mụtara,* eze, ka ọ nọchie gị. M ga-emekwa ka alaeze ya sie ezigbo ike.+ 13  Ọ bụ ya ga-arụ ụlọ a ga-eji maka ya na-eto aha m.+ M ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.+ 14  M ga-abụ nna ya, yanwa ga-abụkwa nwa m.+ Ya mee ihe ọjọọ, m ga-agbazi ya, jirikwa ụtarị dọọ ya aka ná ntị otú ụmụ mmadụ na-eme.*+ 15  Agaghị m akwụsị ịhụ ya n’anya* otú m kwụsịrị ịhụ Sọl n’anya,+ onye ị hụrụ mgbe m wepụrụ ya. 16  Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọchịchị gị ga-esikwa ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.”’”+ 17  Netan gwara Devid ihe a niile a gwara ya n’ọhụụ.+ 18  Eze Devid wee nọdụ ala n’ihu Jehova, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ònye ka m bụ? Gịnịkwa ka ezinụlọ m bụ mere i ji meere m ihe a niile?+ 19  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, a ka na-ekwu ihe a niile i meere m, gị ana-agwakwa m ugbu a na ezinụlọ ohu gị ga-adịte aka. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, o nweghị mmadụ ọ bụla ga-agbanweli ya.* 20  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, olee ihe ọzọ ohu gị Devid ga-agwa gị, ebe ọ bụ na ị ma m nke ọma?+ 21  I mere ihe a niile dị egwu, meekwa ka ohu gị mara ha,+ n’ihi na ọ bụ ihe i kwere ná nkwa. 22  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ọ bụ ya mere i ji bụrụ onye ukwu n’eziokwu.+ O nweghị onye dị ka gị.+ Ọ bụ eziokwu na anyị anụla gbasara ọtụtụ chi ndị ọzọ, naanị gị bụ Chineke.+ 23  Oleekwa mba dị n’ụwa nke dị ka ndị gị Izrel?+ Chineke anyị, ị gara gbapụta ha ka ha bụrụ ndị gị.+ I meere ha oké ihe+ na ihe ndị dị egwu iji mee ka aha gị na-ede ude.+ Ị chụpụrụ mba dị iche iche na chi ha n’ihi ndị gị i si n’Ijipt gbapụta. 24  I meela ka ndị Izrel bụrụ ndị gị ruo mgbe ebighị ebi.+ Jehova, ị bụkwa Chineke ha.+ 25  “Ugbu a, Jehova Chineke, mezuo nkwa i kwere gbasara mụnwa bụ́ ohu gị nakwa gbasara ezinụlọ m ruo mgbe ebighị ebi. Biko, meekwa ihe i kwere ná nkwa.+ 26  Ka e too aha gị ruo mgbe ebighị ebi.+ Ka ndị mmadụ, sị: ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ Chineke Izrel.’ Ka ezinụlọ Devid ohu gị siekwa ezigbo ike n’anya gị.+ 27  N’ihi na gịnwa, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, Chineke Izrel, agwala ohu gị, sị, ‘M ga-arụrụ gị ụlọ.’*+ Ọ bụ ya mere obi ji sie ohu gị ike ịgwa gị ihe ndị a n’ekpere. 28  Ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ọ bụ gị bụ ezi Chineke. Okwu gị bụkwa eziokwu.+ I kwekwala ohu gị nkwa imere ya ihe ọma ndị a. 29  Biko, gọzie ezinụlọ ohu gị ka ọ dịgide ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, gọzie ezinụlọ ohu gị ruo mgbe ebighị ebi, ebe ọ bụ na i kwela ohu gị nkwa.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “alaeze.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “nke ga-esi n’ahụ́ gị pụta.”
Na Hibru, “jirikwa ụtarị ụmụ mmadụ dọọ ya aka ná ntị.”
Ma ọ bụ “Agaghị m akwụsị igosi ya ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “ihe a bụ iwu e nyere mmadụ niile.”
Ma ọ bụ “alaeze.”