Samuel nke Abụọ 8:1-18
8 Ka oge na-aga, Devid lụsoro ndị Filistia agha+ ma merie ha.+ Ọ nakwaara ha Meteg-ama.
2 O merikwara ndị Moab,+ makpuwe ha n’ala, jiri ụdọ e ji atụ̀ ihe tụọ ha, tụta ụzọ abụọ n’ime ha a ga-egbu egbu, na otu ụzọ a ga-ahapụ ndụ.+ Ndị Moab ghọkwara ndị ohu Devid, na-atụkwara ya ụtụ.+
3 Ka Hadadiza nwa Rihọb, eze Zoba,+ na-aga ka o nwetaghachi Osimiri Yufretis,+ Devid lụsoro ya agha, meriekwa ya.
4 Devid jidekwara otu puku na narị mmadụ asaa (1,700), bụ́ ndị agha Hadadiza ndị na-agba ịnyịnya nakwa puku mmadụ iri abụọ (20,000), bụ́ ndị agha ya ji ụkwụ aga. O sekwara ịnyịnya niile na-adọkpụ ụgbọala ha akwara ma e wezụga otu narị (100) n’ime ha ọ hapụrụ.+
5 Mgbe ndị Siria nọ na Damaskọs+ bịara inyere Hadadiza eze Zoba aka, Devid gburu puku mmadụ iri abụọ na puku abụọ (22,000) n’ime ha.+
6 Devid dowekwara ndị agha na-eche nche na Siria, nke Damaskọs bụ isi obodo ya. Ndị Siria ghọkwara ndị ohu Devid, na-atụkwara ya ụtụ. Jehova mekwara ka Devid na-emeri n’agha ọ bụla ọ gara.+
7 Devid bukọkwaara ọta ndị na-ejere Hadadiza ozi, bute ha Jeruselem.+ Ọta ndị ahụ dị okirikiri, e jikwa ọlaedo mee ha.
8 Eze Devid gakwara Bita na Berotai, bụ́ obodo ndị Hadadiza na-achị, buru ọtụtụ ọla kọpa.
9 Toaị eze Hemat+ nụkwara na Devid emeriela ndị agha niile na-alụrụ Hadadiza agha.+
10 N’ihi ya, Toaị ziri Joram nwa ya ka ọ gakwuru Devid kelee ya, jaakwa ya ike maka na ọ lụsoro Hadadiza agha, meriekwa ya (n’ihi na Hadadiza na-agakarị alụso Toaị agha). Joram wetakwaara Devid ihe ndị e ji ọlaọcha, ọlaedo, na ọla kọpa mee.
11 Eze Devid nyefere Jehova ihe ndị a, ma ọlaọcha ma ọlaedo ndị ọ natara mba niile o meriri.+
12 Ndị ọ natara ihe ndị ahụ bụ ndị Siria, ndị Moab,+ ndị Amọn, ndị Filistia,+ ndị Amalek,+ nakwa Hadadiza+ nwa Rihọb eze Zoba.
13 Aha Devid bịara na-ede ude mgbe o gbuchara puku ndị Ịdọm iri na asatọ (18,000) na Ndagwurugwu Nnu.+
14 O dowekwara ndị agha na-eche nche n’Ịdọm. O dowere ha ebe niile n’Ịdọm. Ndị Ịdọm niile ghọkwara ndị ohu Devid.+ Jehova mekwara ka Devid na-emeri n’agha ọ bụla ọ gara.+
15 Devid nọkwa na-achị Izrel niile,+ na-ekpere ndị ya niile+ ikpe ziri ezi, na-emekwara ha ihe ọma.+
16 Joab+ nwa Zeruya bụ onyeisi ndị agha. Jehoshafat+ nwa Ahaịlọd bụ onye na-edekọ ihe.
17 Zedọk+ nwa Ahaịtọb na Ahimelek nwa Abayata bụ ndị nchụàjà. Seraya bụ odeakwụkwọ.
18 Benaya+ nwa Jehoyada bụ onyeisi ndị Keretaịt na ndị Peletaịt.+ Ụmụ Devid ndị nwoke ghọkwara ndị isi.*
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “ndị nchụàjà.”