Samuel nke Abụọ 9:1-13

  • Devid meere Mefiboshet ebere (1-13)

9  Mgbe e mechara, Devid jụrụ, sị: “È nwere onye fọrọ n’ezinụlọ Sọl ka m gosi ya na m hụrụ ya n’anya* otú m kwere Jonatan ná nkwa?”+  Ma e nwere otu nwoke aha ya bụ Zaịba,+ onye na-eje ozi n’ụlọ Sọl. A gara gwa ya na Eze Devid na-akpọ ya, ya agakwuru ya. Eze asị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ Zaịba?” Ya asị: “Abụ m ohu gị.”  Eze asị ya: “È nwere onye fọrọ n’ezinụlọ Sọl ka m gosi ya na m hụrụ ya n’anya* otú Chineke si eme?” Zaịba asị eze: “Otu nwa Jonatan fọrọ. Ọ dara ngwọrọ.”+  Eze asị ya: “Olee ebe ọ nọ?” Zaịba asị eze: “Ọ nọ na Lo-diba n’ụlọ Mekia+ nwa Amiel.”  Eze Devid ziri ozi ozugbo ahụ, a gaa n’ụlọ Mekia nwa Amiel, nke dị na Lo-diba, kpọta ya.  Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan nwa Sọl bịakwutere Devid, o gburu ikpere n’ala ozugbo, kpọọ isiala. Devid akpọọ ya: “Mefiboshet.” Ya asị: “Lekwa ohu gị.”  Devid asị ya: “Atụla egwu, maka na m ga-egosi gị na m hụrụ gị n’anya*+ n’ihi Jonatan nna gị. M ga-enyeghachikwa gị ala niile bụ́ nke Sọl nna nna gị, ị ga na-erikwa nri na tebụl mụ mgbe niile.”+  O wee kpọọ isiala, sị: “Ònye ka ohu gị bụ, nke na ị na-eche gbasara nkịta nwụrụ anwụ+ dị ka m?”  Eze kpọziri Zaịba, bụ́ onye na-ejere Sọl ozi, sị ya: “Ihe niile Sọl na ezinụlọ ya niile nwe bụzi nke nwa nwa nna gị ukwu.+ 10  Gị na ụmụ gị na ndị na-ejere gị ozi ga na-akọ ubi ya, na-ewekwa ihe ubi ya mepụtara ka ọ bụrụ ihe mmadụ niile si n’ezinụlọ nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu, ga na-eri nri na tebụl mụ mgbe niile.”+ Zaịba mụrụ ụmụ nwoke iri na ise, nweekwa mmadụ iri abụọ na-ejere ya ozi.+ 11  Zaịba asị eze: “Ohu gị ga-eme ihe niile onyenwe m eze gwara ohu ya mee.” Mefiboshet wee na-eri ihe na tebụl Devid* ka ọ̀ bụ otu n’ime ụmụ eze. 12  Mefiboshet mụtara nwa nwoke aha ya bụ Maịka.+ Ndị niile bi n’ụlọ Zaịba ghọkwara ndị na-ejere Mefiboshet ozi. 13  Ma Mefiboshet bi na Jeruselem, n’ihi na ọ bụ na tebụl eze ka ọ na-eri nri mgbe niile.+ Ọ dakwara ngwọrọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “gosi ya ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “gosi ya ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ga-egosi gị ịhụnanya pụrụ iche.”
O nwere ike ịbụ, “mụ.”