Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Timoti 3:1-17
3 Ma mara na oge ikpeazụ+ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ.
2 N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-etu ọnụ, ndị mpako, ndị na-ekwulu ndị ọzọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ,
3 ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị,
4 ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ, ndị isi ike, ndị onwe ha na-ebu isi, ndị ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ, ọ bụghị ịhụ Chineke n’anya,
5 ndị na-eme ka hà ji ife Chineke kpọrọ ihe, ma ha anaghị erubere ya isi.+ Na-eze ụdị ndị a eze.
6 Ọ bụ ụdị ndị a na-egbeba n’ezinụlọ dị iche iche na-aghọgbu ụmụ nwaanyị na-esighị ike n’okwukwe, ndị mmehie na-anyịgbu, ndị na-emekwa ihe na-agụ ahụ́ ha agụụ.
7 Ha na-amụ ihe mgbe niile, ma ha enweghị ike ịmata eziokwu nke ọma.
8 Ọ bụ otú Janis na Jambris si megide Mosis ka ndị a* si emegide eziokwu. Uche ha rụrụ arụ kpamkpam. Ihe ha anaghịkwa amasị Chineke n’ihi na ha na-eme ihe dị iche n’ihe Ndị Kraịst kweere.
9 Ma, ihe agaghị agaziri ha, n’ihi na mmadụ niile ga-ama na ha dị nzuzu, otú ahụ mmadụ niile matara na Janis na Jambris dị nzuzu.+
10 Ma, ị mụtara nnọọ ihe m kụziri. Ị na-ebi ndụ otú m si ebi,+ marakwa ihe m zubere ime na otú m si nwee okwukwe, otú m si enwe ndidi, otú m si hụ ndị ọzọ n’anya, otú m si atachi obi,
11 otú e si kpagbuo m na otú e si taa m ahụhụ, dị ka nke a tara m n’Antiọk,+ n’Aịkoniọm,+ nakwa na Listra.+ Ediri m ahụhụ a niile a tara m, Onyenwe anyị napụtakwara m na ha niile.+
12 N’eziokwu, a ga-akpagbukwa ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.+
13 Ma ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-akakwu njọ, na-eduhie ndị mmadụ, ndị ọzọ ana-eduhiekwa ha.+
14 Ma gịnwa, ahapụkwala ihe ndị ị mụtara, ndị a kụziiri gị otú mere ka i kwere,+ n’ihi na ị ma ndị i si n’aka ha mụta ha.
15 Chetakwa na i si n’oge ị bụ nwata*+ mara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ,+ nke ga-emeli ka ị mara ihe, a zọpụtakwa gị n’ihi okwukwe i nwere na Kraịst Jizọs.+
16 Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.+ Ha bakwara uru iji ha akụzi ihe,+ iji ha adọ mmadụ aka ná ntị, iji ha agbazi mmadụ, nakwa iji ha azụ mmadụ ka ọ na-eme ezi omume,+
17 ka onye nke Chineke wee ruo eruo n’ụzọ niile, bụrụ onye kwadebere nke ọma ime ihe ọ bụla dị mma.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ndị a na-ekwu okwu ha bụ ndị ahụ na-aga aghọgbu ụmụ nwaanyị na-esighị ike n’okwukwe.
^ Na Grik, “nwa ọhụrụ.”