Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Timoti 4:1-22

  • “Jeruo ozi gị n’isi” (1-5)

    • Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa okwu Chineke (2)

  • “Alụọla m ezigbo ọgụ anyị na-alụ” (6-8)

  • Ihe Pọl kwuru gbasara onwe ya (9-18)

  • Ekele ikpeazụ (19-22)

4  Kraịst Jizọs ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ+ ikpe+ mgbe ọ ga-apụta ìhè+ nakwa mgbe ọ ga na-achị n’Alaeze ya.+ Ana m agwasi gị ike n’ihu ya na n’ihu Chineke ka ị na-eme ihe a:  Kwusaa okwu Chineke.+ Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya ma n’oge dị mma ma n’oge nsogbu. Dọọ onye mejọrọ ihe aka ná ntị.+ Baara ya mba, gbaakwa ya ume. Na-enwe ndidi ka ị na-eme ihe ndị a, na-emekwa ha ka onye bụ́ aka ochie n’ịkụzi ihe.+  N’ihi na a ga-enwe oge ndị mmadụ na-agaghị anabata eziokwu a na-akụziri anyị.+ Kama, ha ga-eme ihe ha chọrọ, kpọkọtara onwe ha ndị ga na-akụziri ha ihe ha chọrọ ịnụ.*+  Ha ga-akwụsịkwa ige eziokwu, gewezie akụkọ ụgha.  Ma gịnwa, na-eche echiche nke ọma n’ihe niile. Na-edi ahụhụ ị na-ata.+ Na-ezisa ozi ọma.* Jeruo ozi gị n’isi.+  N’ihi na adị m ka àjà e ji mmanya chụọ, nke a wụpụrụ n’ebe ịchụàjà,+ oge m ga-anwụ*+ dịkwa nso.  Alụọla m ezigbo ọgụ anyị na-alụ.+ Agbaala m ọsọ ndụ ruo n’isi.+ Akwụsikwara m ike n’okwukwe.  Onyenwe anyị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi,+ ejikerela inye m okpueze a na-enye ndị ezi omume.+ Ọ ga-eji ya kwụọ m ụgwọ n’ụbọchị ikpe.+ Ma, ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, ọ ga-enyekwa ya ndị niile na-atụsi anya ike ka ọ pụta ìhè.  Gbalịsie ike ka ị bịa hụ m ngwa ngwa. 10  N’ihi na Dimas+ ahapụla m gawa Tesalonaịka maka na ọ hụrụ ụwa a* n’anya. Kresens agaakwala Galeshia, Taịtọs agaa Dalmeshia. 11  Ọ bụ naanị Luk ka mụ na ya nọ. Gị na Mak soro bịa, n’ihi na ọ ga-enyere m aka n’ozi m na-ejere Chineke. 12  Ma, ezigara m Tikikọs+ Efesọs. 13  Ị bịawa, chịtara m uwe mgbokwasị m hapụrụ na Troas n’ụlọ Kapọs, wetakwa akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịchaa, akpụkpọ anụ ndị ahụ e dere ihe na ha. 14  Alegzanda onye na-akpụ ọla kọpa mere m ọtụtụ ihe ọjọọ. Jehova* ga-akwụ ya ụgwọ ihe ndị o mere.+ 15  I kwesịkwara ịna-eze ya eze, n’ihi na otú o si gbaa ihe anyị kwuru ụkwụ enweghị atụ. 16  Mgbe mbụ m gara zara ọnụ m n’ihu ndị ọchịchị, o nweghị onye bịara kwado m. Ha niile hapụrụ m. Ka Chineke ghara ịgụkọrọ ha ya. 17  Ma Onyenwe anyị nyeere m aka ma nye m ike, ka e wee si n’aka m kwusaa ozi ọma ahụ ruo n’isi, ka mba niile nụkwa ya.+ Ọ napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.+ 18  Onyenwe anyị ga-anapụta m n’ihe ọjọọ niile. Ọ ga-azọpụta m, kpọbatakwa m n’Alaeze eluigwe ya.+ Ka a na-eto ya ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 19  Keleere m Priska na Akwịla+ nakwa Onesịfọrọs na ezinụlọ ya.+ 20  Erastọs+ ka nọ na Kọrịnt, ma, ọ bụ na Maịlitọs ka m hapụrụ Trọfimọs+ n’ihi na ahụ́ adịghị ya. 21  Gbalịsie ike ka i rute tupu oge oyi. Yubulọs na-ekele gị. Pudens na Laịnọs na Klọdia na ụmụnna niile na-ekelekwa gị. 22  Ka Onyenwe anyị nọnyere gị maka àgwà ọma ị na-akpa. Ka o meekwara unu amara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị.”
Ma ọ bụ “Na-arụ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma.”
Ma ọ bụ “oge a ga-ahapụ m.”
Ma ọ bụ “oge a.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.