Jọn Nke Atọ 1:1-14

  • Ekele na ekpere (1-4)

  • Jọn jara Gayọs mma (5-8)

  • Dayotrefis na-achọ ịbụ onye mbụ (9, 10)

  • A kọrọ akụkọ ọma banyere Dimitriọs (11, 12)

  • Jọn na-atụ anya ịga hụ Gayọs; ekele mmechi (13, 14)

 Gayọs, onye m hụrụ n’anya, onye m hụrụ n’anya n’eziokwu, mụnwa bụ́ okenye* na-edetara gị akwụkwọ ozi.  Onye m hụrụ n’anya, m na-ekpe ekpere ka ahụ́ na-agbasi gị ike nakwa ka ihe niile na-agara gị nke ọma, otú ha na-agara gị* nke ọma ugbu a.  N’ihi na m ṅụrịrị nnukwu ọṅụ mgbe ụmụnna bịara kwuo* na i jisiri eziokwu ahụ aka ike. M na-aṅụrịkwa ọṅụ na ị na-eje ije n’eziokwu ahụ.+  E nweghị ihe na-eme m obi ụtọ karịa ihe a: na m ga-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.+  Onye m hụrụ n’anya, ihe ị na-emere ụmụnna, n’agbanyeghị na ị maghị ndị ha bụ,+ gosiri na i jisiri Chineke aka ike.  Ha akọọrọla ọgbakọ* banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-ala, gbalịa nyere ha aka otú ga-adị Chineke mma.+  N’ihi na ọ bụ maka aha ya ka ha ji gawa izisa ozi ọma n’anaghị ndị mba ọzọ ihe ọ bụla.+  N’ihi ya, anyị kwesịrị ịnabata ụdị ndị a nke ọma,+ ka anyị wee bụrụ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ n’ịkwado eziokwu ahụ.+  E nwere akwụkwọ ozi m detaara ọgbakọ, ma Dayotrefis, onye na-achọ ịbụ onye mbụ n’ime ha,+ anaghị akwanyere ihe ọ bụla si n’aka anyị ùgwù.+ 10  N’ihi ya, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-eme ka a mata ọrụ ndị ọ na-arụ, na ọ na-akọsa ihe na-abụghị eziokwu* banyere anyị.+ Nke a ezughịrị ya. Ọ naghịdị anabata ụmụnna+ nke ọma. Ọ na-agbalịkwa igbochi ndị chọrọ ịnabata ha, na-achụpụkwa ha n’ọgbakọ. 11  Onye m hụrụ n’anya, esola ndị ọjọọ na-eme ihe ọjọọ, kama soro ndị na-eme ihe ọma mewe ihe ọma.+ Onye na-eme ihe ọma si na Chineke.+ Onye na-eme ihe ọjọọ ahụbeghị Chineke.+ 12  Ha niile kọrọ akụkọ ọma banyere Dimitriọs, eziokwu ahụ gbakwaara ya àmà. N’eziokwu, anyị na-ekwukwa okwu ọma banyere ya.* Ị makwa na ihe anyị na-ekwu* bụ eziokwu. 13  E nwere ọtụtụ ihe m chọrọ ịgwa gị, ma achọghị m iji mkpịsị akwụkwọ na ịnk na-edere gị ha. 14  Ma, enwere m olileanya na m ga-ahụ gị n’oge na-adịghị anya, anyị ga-ekwukwa okwu ihu na ihu. Udo dịrị gị.+ Ndị enyi anyị na-ekele+ gị. Keleere m+ ndị enyi anyị n’otu n’otu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “agadi nwoke.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Grik, “gbaa àmà.”
Na Grik, “agbaarala ọgbakọ àmà.”
Na Grik, “na-ekwu okwu ọjọọ.”
Na Grik, “anyị na-agbakwara ya àmà.”
Na Grik, “àmà anyị na-agba.”