Aịzaya 31:1-9
31 Ndị na-agakwuru ndị Ijipt ka ha nyere ha aka ga-ata ahụhụ.+
Ha na-atụ anya na ịnyịnya ga-enyere ha aka.+
Obi siri ha ike na ụgbọ ịnyịnya agha dị ọtụtụ ga-enyere ha aka.
Obi sikwara ha ike na ịnyịnya agha* ga-enyere ha aka maka na ha siri ike.
Ma, ha anaghị atụ anya ka Onye Nsọ Izrel nyere ha aka.
Ha achọghịkwa Jehova.
2 Ma, Chineke ma ihe. Ọ ga-emekwa ka ọdachi dakwasị ha.
Ọ gaghị ahapụ imezu ihe o kwuru.
Ọ ga-ata ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.
Ọ ga-atakwa ndị na-enyere ndị na-eme ihe ọjọọ aka ahụhụ.+
3 Ndị Ijipt bụ ụmụ mmadụ nkịtị. Ha abụghị Chineke.
Ịnyịnya ha bụ anụ ahụ́. Ha abụghị mmụọ.+
Mgbe Jehova ga-agbatị aka ya,Ndị a na-enyere aka ga-ada.
Ndị na-enyere ha aka ga-adakwa.
Ha niile ga-ala n’iyi otu mgbe.
4 Jehova gwara m, sị:
“Ọ na-abụ ọdụm siri ezigbo ike nọrọ n’elu anụ o jidere na-agbọ ụja,A kpọkọgodị ndị niile na-azụ atụrụ ka ha chụpụ ya,Mkpu ha na-eti anaghị emenye ya ụjọ.
Mkpọtụ ha na-eme anaghịkwa eme ka ọ gbaa ọsọ.
Otú ahụkwa ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-esi gbadata ka ọ lụọ aghaN’ihi Ugwu Zayọn nakwa n’ihi ugwu nta dị na ya.
5 Otú ahụ nnụnụ si eji ọsọ fere bịa ka o chebe ụmụ ya ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-esi bịa chebe Jeruselem.+
Ọ ga-echebe ya, zọpụtakwa ya.
Ọ ga-emere ya ebere, gbatara ya ọsọ enyemaka.”
6 “Ndị Izrel, lọghachikwutenụ Chineke, onye unu kpachaara anya nupụrụ isi.+
7 N’ihi na n’ụbọchị ahụ, onye ọ bụla n’ime unu ga-ajụ chi ya na-abaghị uru, ndị e ji ọlaọcha mee, na chi ya na-abaghị uru, ndị e ji ọlaedo mee. Unu ji aka unu mee ha. Ọ bụkwa mmehie.
8 A ga-eji mma agha na-abụghị mma agha mmadụ gbuo ndị Asiria.
A ga-ejikwa mma agha na-abụghị mma agha mmadụ memilaa ha.+
Ha ga-agba ọsọ n’ihi mma agha.
A ga-amanyekwa ụmụ okorobịa ha ịrụ ọrụ.
9 Onye ha weere ka nnukwu nkume ga-anwụ n’ihi ụjọ.
Ndị isi ha ga-atụkwa ụjọ n’ihi ihe ahụ na-agba àmà.” Ọ bụ Jehova,Onye ìhè* ya dị na Zayọn, onye ekwú ya dịkwa na Jeruselem, kwuru ihe a.