Aịzaya 32:1-20
32 A ga-enwe eze+ ọ ga-abụ, ya chịwa, onye ọ bụla ana-eme ezi omume,+A ga-enwekwa ndị isi ga na-ekpe ikpe ziri ezi ma ha chịwa.
2 Onye ọ bụla n’ime ha ga-adị ka ebe mmadụ na-agbaba ka o zere ifufe
Nakwa ebe mmadụ na-agbaba ka o zere nnukwu mmiri ozuzo.
Onye ọ bụla n’ime ha ga-adịkwa ka iyi na-asọ n’ala mmiri na-adịghị+Nakwa ka ndò nkume dị elu na-enye n’ala kpọrọ nkụ.
3 A gaghịzi anyachi anya ndị na-ahụ ụzọ.
Ndị na-anụ ihe ga-egekwa ntị.
4 Ndị na-eme ihe ọkụ ọkụ ga-echebara otú ha ga-esi amatakwu ihe echiche.
Ndị nsụ* ga na-ekwu ihe doro anya, okwu ana-agakwa ha were were n’ọnụ.+
5 A gaghịzi asị na onye nzuzu na-amaghị Chineke bụ ezigbo mmadụ.*
A gaghịkwa asị na onye arụrụala bụ ezigbo mmadụ.
6 Onye nzuzu ga na-ekwu okwu nzuzu.
Ọ na-eche ihe ọjọọ n’obi ya+ n’ihi naỌ chọrọ ịkwụsị ife Chineke, fewe chi ọzọ,* chọọ ịna-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara Jehova,Chọọ ime ka onye* agụụ ji ghara ịhụ ihe rie,Chọọkwa ime ka onye mmiri na-agụ ghara ịṅụ mmiri.
7 Otú onye arụrụala si eme ihe ndị ọ na-eme dị njọ.+
Ọ na-eme ka ndị ọzọ na-eme omume na-eme ihere,Na-aghagidekwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ụgha ka o mesie ha ike,+Ọ bụrụgodị na ha kwuru otú ihe si mee.
8 Ma, ezigbo mmadụ na-ebu ezigbo ihe n’obi.
Naanị ihe ọ na-eme bụ ihe dị mma.*
9 “Ụmụ nwaanyị ndị weere na ihe a na-eme agbasaghị ha, bilienụ ọtọ gee ntị n’ihe m na-ekwu.
Ụmụ nwaanyị na-ejighị ihe ọ bụla kpọrọ ihe,+ nụrụnụ ihe m na-ekwu.
10 Otu afọ na abalị ole na ole gachaa, ununwa, bụ́ ndị na-ejighị ihe ọ bụla kpọrọ ihe, ga-ama jijiji,N’ihi na oge ịghọ mkpụrụ vaịn ga-agacha, ma o nwebeghị nke a ghọtara.+
11 Ụmụ nwaanyị ndị weere na ihe a na-eme agbasaghị ha, maanụ jijiji.
Ndị na-ejighị ihe ọ bụla kpọrọ ihe, maanụ jijiji.
Yipụnụ uwe unu gbara ọtọ,Keekwanụ ákwà iru uju n’úkwù.+
12 Tienụ aka n’obi, beekwanụ ákwáMaka ihe mere ala dị iche iche na-eme nri na osisi vaịn nke na-amị mkpụrụ.
13 N’ihi na ihe ga-eju ebe niile n’ala ndị m bụ osisi bụ́ ogwu ogwu.
Ọ ga-ekpuchi ụlọ niile a na-anọ enwe aṅụrị,Ya bụ, ụlọ ndị dị n’obodo a na-enwe ezigbo obi ụtọ.+
14 N’ihi na ndị bi n’ụlọ elu a rụsiri ike agbapụchaala.
Ndị mmadụ agbapụchaala n’obodo a na-eme mkpọtụ.+
Ofel+ na ụlọ nche tọgbọzi nkịtị.
Ha bụzi ebe jakị ọhịa na-enwe aṅụrịNa ebe ìgwè ewu na atụrụ na-ata ahịhịa.+ Ha ga-adịgidekwa otú ahụ
15 Ruo mgbe Chineke ga-esi n’eluigwe wụkwasị anyị mmụọ ya,+Mgbe ala ịkpa ga-aghọ ubi a kụrụ mkpụrụ osisi,E werekwa ubi a kụrụ mkpụrụ osisi ka oké ọhịa.+
16 N’oge ahụ, a ga na-ekpe ikpe ziri ezi n’ala ịkpa.
A ga na-emekwa ezi omume n’ubi a kụrụ mkpụrụ osisi.+
17 Ezi omume a ga na-eme ga-eme ka udo dị,+Meekwa ka ebe niile dị jụụ, obi eruokwa onye ọ bụla ala ruo mgbe ebighị ebi.+
18 Udo ga-adị ebe ndị m ga-ebi.
Obi ga-erukwa ha ala ebe ahụ. Ebe ha ga na-ezu ike ga-adakwa jii.+
19 Ma, akụ́ mmiri ígwé ga-ebibi oké ọhịa.
A ga-asụkwa obodo a akwụ.
20 Ndị na-akụ mkpụrụ n’akụkụ mmiri niileNa ndị na-atọpụ ehi na jakị eriri ka ha na-akpagharị na-enwe obi ụtọ.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ire ndị nsụ.”
^ Ma ọ bụ “na-emesapụ aka.”
^ Ma ọ bụ “kwụsị ịsọpụrụ Chineke, sọpụwara chi ọzọ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “imesapụ aka.”