Aịzaya 35:1-10
35 Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị.+
Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.+
2 Okooko osisi ga-ejurịrị na ya.+
Ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ.
Ọ ga-adị ebube ka Lebanọn,+Maakwa mma ka Kamel+ na Sharọn.+
Ndị mmadụ ga-ahụ ebube Jehova, ya bụ, otú Chineke anyị si maa mma dị ebube.
3 Meenụ ka aka na-adịghị ike dị ike,Meekwanụ ka ikpere na-ama jijiji sie ike.+
4 Sịnụ ndị na-echegbu onwe ha:
“Obi sie unu ike. Unu atụla egwu.
Chineke unu ga-abịa ịkwụ ndị iro unu ụgwọ.
Chineke ga-abịa ịta ha ahụhụ.+
Ọ ga-abịa zọpụta unu.”+
5 Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì,+Megheekwa ntị ndị ntị chiri.+
6 Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu ka mgbada.+
Onye ogbi* ga-etikwa mkpu ọṅụ.+
Mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa.
Iyi ga na-asọkwa n’ọzara.
7 Ala kpọrọ nkụ ga-adị ka ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru.
Ala mmiri na-adịghị ga-adịkwa ka isi mmiri.+
Ahịhịa ndụ na ahịhịa amị na ahịhịa papaịrọsGa-adị n’ebe nkịta ọhịa na-ebi, n’ebe ha na-anọkwa ezu ike.+
8 Okporo ụzọ ga-adị ebe ahụ.+
Ọ bụ ụzọ a na-akpọ Ụzọ Dị Nsọ.
Onye rụrụ arụ agaghị akpa ụkwụ na ya.+
Ọ bụ naanị ndị kwesịrị ịga n’ụzọ ahụ ga na-aga na ya.
E nweghị onye nzuzu ọ bụla ga-azọ ụkwụ na ya.
9 Ọdụm agaghị anọ ebe ahụ.
O nweghịkwa anụ ọhịa ọjọọ ga-abịa na ya.
O nweghị nke a ga-ahụ ebe ahụ.+
Naanị ndị ga na-aga n’ụzọ ahụ bụ ndị a gbapụtara ebe e ji ha eji.+
10 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta,+ tirikwa mkpu ọṅụ bata na Zayọn.+
Ha agaghị akwụsị ịna-enwe aṅụrị.+
Ha ga na-enwe obi ụtọ, na-enwekwa aṅụrị.
Iru uju na ịsụ ude ga-alakwa kpamkpam.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ire onye ogbi.”