Aịzaya 4:1-6

  • Ụmụ nwaanyị asaa ga-ejide otu nwoke aka (1)

  • Ihe Jehova mere ka o pulite ga-adị ebube (2-6)

4  Ụmụ nwaanyị asaa ga-ejide otu nwoke aka n’ụbọchị ahụ,+ sị: “Anyị ga na-akpa afọ anyị,Na-azụkwara onwe anyị ákwà. Naanị ihe anyị na-arịọ gị bụ ka anyị zawa aha gị,Ka a ghara ịna-akọ anyị ọnụ.”*+  N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-eme ka ome mara mma, nke na-enweghịkwa ntụpọ, pulite. Ndị fọrọ n’ala Izrel ga na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ala ha mepụtara, jirikwa ya na-eme ọnụ.+  Onye ọ bụla fọrọ na Zayọn, onye a hapụkwara na Jeruselem, ga-abụ onye dị nsọ n’anya ya, ya bụ, onye ọ bụla nọ na Jeruselem e dere aha ya na ọ ga-adịrị ndụ na-aga.+  Jehova ga-egosi Jeruselem na ezigbo iwe na-ewe ya, ọ ga-ekpekwa ya ikpe, si otú ahụ sachapụ ọbara metọrọ ya, sachapụkwa unyi* tere Zayọn.+  N’ehihie, Jehova ga-eme ka ígwé ojii na anwụrụ ọkụ kpuchie ebe niile n’Ugwu Zayọn, kpuchiekwa ebe ndị mmadụ na-agbakọ na ya. N’abalị, ọ ga-emekwa ka ìhè ọkụ na-enwu enwu kpuchie ha.+ Ndò ga-adịkwa ebe ahụ niile dị ebube.  Ụlọ ndò nke ga na-egbochi okpomọkụ n’ehihie ga-adịkwa ebe ahụ.+ Ọ ga-abụkwa ebe ndị mmadụ ga-agbaba zere oké ifufe na mmiri ozuzo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, ka a ghara ịna-akọ ha ọnụ maka na ha alụghị di, nakwa na ha amụghị nwa.
Na Hibru, “nsị.”