Aịzaya 41:1-29
41 “Ndị bi n’agwaetiti, nọrọnụ jii gee m ntị.*
Mba dị iche iche, nwetaghachinụ ike.
Bịanụ m nso kwuo okwu.+
Ka anyị nọrọ ihu na ihu ka m kpee unu ikpe.
2 Ònye nyere onye si ebe ọwụwa anyanwụ ike?+
Ònye kpọrọ ya ka ọ bịa kpee ikpe ziri ezi,Ka e nyefee mba dị iche iche n’aka ya,Meekwa ka o merie ndị eze dị iche iche?+
Ònye ji mma agha ya gbuo ha, ha aghọọ uzuzu?
Ònye jikwa ụta ya gbajasịa ha, ha adị ka ahịhịa ọka nke ifufe na-ebugharị?
3 Ọ na-achụ ha ọsọ.
Ọ na-eji ụkwụ si ụzọ ọ na-agatụbeghị mbụ chụọ ha ọsọ. E nweghịkwa ihe na-anọchiri ya ụzọ.
4 Olee onye na-arụ ọrụ kemgbe nke mere ihe a?
Oleekwa onye mere ka ọgbọ dị iche iche dịrị kemgbe ụwa?
“Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Onye Mbụ.+
M ga-abụkwa otu onye ahụ ruo mgbe ọgbọ ikpeazụ ga-aga.”+
5 Ndị bi n’agwaetiti dị iche iche hụrụ ihe na-eme, tụwa ụjọ.
Ndị bi ná nsọtụ niile nke ụwa malitere ịma jijiji.
Ha gbakọrọ ma na-abịa nso.
6 Onye ọ bụla na-enyere ibe ya aka,Otu onye ana-asịkwa nwanne ya: “Dị ike.”
7 Omenkà na-agba onye na-eji ígwè akpụ ihe ume.+
Onye na-eji hama e ji akpụ ụ́zụ́ akụsa ígwèNa-agba onye ọzọ na-akụkọta ígwè na ígwè ume.
Ọ na-asị na otú e si kụkọta ígwè ndị ahụ dị mma.
N’ikpeazụ, mmadụ na-eji ntu kụgide arụsị ahụ n’ihe ka ọ ghara ite kweke kweke.
8 “Ma Izrel, ị bụ ohu m.+
Jekọb, ọ bụ gị ka m họọrọ.+
Ị bụ nwa* Ebreham bụ́ enyi m.+
9 Esi m n’ebe ụwa sọtụrụ kpọrọ gị.+
Esi m n’ebe kacha anya n’ụwa kpọrọ gị.
M sịrị gị, ‘Ị bụ ohu m.+
Ahọrọla m gị. Ajụghị m gị ajụ.+
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+
Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+
M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+
M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’
11 Ihere ga-eme ndị niile na-ewesa gị iwe. A ga-emechukwa ha ihu.+
M ga-ala ndị na-alụso gị agha n’iyi. Ha agaghịzi adị.+
12 Ị ga-achọ ndị na-alụso gị agha, ma ị gaghị ahụ ha.
Ndị na-alụso gị agha ga-adị ka ihe na-adịghị adị na ihe efu.+
13 N’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị.
Ọ bụ m na-asị gị, ‘Atụla egwu. M ga-enyere gị aka.’”+
14 Jehova, Onye Mgbapụta gị,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel, sịrị, “Gịnwa bụ́ Jekọb, onye dị ka idide e kwesịrị imetere ebere, atụla egwu,+Ndị Izrel, m ga-enyere unu aka.
15 Emeela m ka unu bụrụ ihe e ji eticha ọka,+Ya bụ, ngwá ọrụ ọhụrụ nke nwere ezé n’akụkụ ya abụọ, nke e ji eticha ọka.
Unu ga-azọda ugwu ukwu dị iche iche, zọriekwa ha.
Unu ga-emekwa ka ugwu nta dị iche iche dị ka mkpo ọka.
16 Unu ga-afụcha ha.
Ifufe ga-ebufukwa ha.
Oké ifufe ga-efesasị ha.
Unu ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.+
Unu ga-ejikwa Onye Nsọ Izrel na-eme ọnụ.”+
17 “Ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị ogbenye na-achọ mmiri, ma mmiri adịghị.
Mmiri agụkatala ha ire ha akpọọ nkụ.+
Mụnwa, bụ́ Jehova, ga-enyere ha aka.+
Mụnwa, bụ́ Chineke Izrel, agaghị ahapụ ha.+
18 M ga-eme ka osimiri na-asọ n’elu ugwu ahịhịa na-adịghị,+Meekwa ka ndagwurugwu bụrụ ebe mmiri si agbapụta.+
M ga-eme ka ala ịkpa bụrụ ọdọ mmiri ahịhịa amị juru,Meekwa ka ala mmiri na-adịghị bụrụ isi iyi.+
19 M ga-akụ osisi sida, osisi akeshịa,Osisi metụl, na osisi paịn n’ọzara.+
M ga-akụkwa osisi junipa na osisi ashNakwa osisi saịpres n’ọzara.+
20 Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ hụ, mata,Gee ntị ma ghọtaNa ọ bụ aka Jehova mere ihe a,Nakwa na ọ bụ Onye Nsọ Izrel mere ya.”+
21 Jehova kwuru, sị, “Zaranụ ọnụ unu.”
Eze na-achị Jekọb kwuru, sị, “Kwuonụ otú o si bụrụ na aka unu dị ọcha.
22 Arụsị dị iche iche, kọọrọnụ anyị ihe ndị gaje ime, kwuokwanụ otú unu si jide n’aka na ha ga-eme.
Gwanụ anyị ihe ndị mere n’oge gara aga,*Ka anyị chebara ha echiche,* matakwa ihe mechara mee.
Ma ọ bụ, gwanụ anyị ihe ndị na-aga ime.+
23 Gwanụ anyị ihe ga-eme n’ọdịnihu,Ka anyị mara na unu bụ chi.+
Meenụ ihe ga-eju anyị anya ma anyị hụ ya,Ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.+
24 Unu abaghị uru ọ bụla.
O nweghị ihe ọ bụla unu na-arụpụta.+
Onye ọ bụla kpebiri ife unu rụrụ arụ.+
25 Enyela m onye si n’ebe ugwu ike. Ọ ga-abịakwa.+
Onye a nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-eto aha m.
Ọ ga-azọ ndị na-achị achị* ụkwụ ka à ga-asị na ha bụ ụrọ.+
Ọ ga-azọ ha ụkwụ otú ahụ ọkpụite si azọ ụrọ.
26 Ònye kwuru gbasara ihe a ná mmalite, ka anyị wee mara,Ma ọ bụ, ònye gwara anyị ya n’oge gara aga, ka anyị nwee ike ịsị, ‘O kwuru eziokwu’?+
N’eziokwu, o nweghị onye mara ọkwa ya.
O nweghị onye kwusara ya.
O nweghị onye nụrụ olu unu.”+
27 Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, sị: “Lekwa ihe na-aga ime.”+
E nwere onye m ga-agwa ka ọ gaa zie ozi ọma na Jeruselem.+
28 M nọ na-ele anya, ma o nweghị onye m hụrụ.
O nweghị onye ọ bụla n’ime ha na-enye ndụmọdụ.
M nọ na-ajụ ha ajụjụ, ma ha azaghị m.
29 Ha niile abaghị uru ọ bụla.*
O nweghị ihe ha ga-emeli.
Arụsị ha a kpụrụ akpụ enweghị isi na ọdụ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “nọrọnụ jii n’ihu m.”
^ Na Hibru, “mkpụrụ.”
^ Na Hibru, “ihe mbụ niile.”
^ Ma ọ bụ “Ka obi anyị dịrị na ha.”
^ Ma ọ bụ “ndị osote onye na-achị achị.”
^ Ma ọ bụ “adịghị adị.”