Aịzaya 48:1-22
48 Nụrụnụ ihe a, ndị ezinụlọ Jekọb,Ndị na-aza aha Izrel,+Ndị si n’ezinụlọ Juda,*Ndị na-eji aha Jehova aṅụ iyi,+Ndị na-eto Chineke Izrel,Ma o sighị ha n’obi. Ha anaghịkwa eme ezi omume.+
2 Ha na-asị na ha si n’obodo nsọ.+
Ha na-achọkwa ka Chineke Izrel,Onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, nyere ha aka.+
3 “O teela m gwara unu ihe ndị gara aga.*
M ji ọnụ m gwa unu ha.
M kwuru ha ka a nụ ha.+
Na mberede ka m mere ihe m kwuru na m ga-eme.+
4 N’ihi na m ma na unu bụ ekwe ekwe.
Unu kpọchiri obi unu,* na-akpọkwa ekwo nkụ.*+
5 O teela m gwara unu ihe ndị a.
Tupu ha emee, m mere ka unu nụ ha,Ka unu ghara ịsị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ihe a.
Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ kwuru ka ihe a mee.’
6 Unu anụla ihe niile, hụkwa ha.
Ọ̀ bụ na unu agaghị akọsa ha?+
Si ugbu a gawa, m ga na-akọziri unu ihe ọhụrụ,+Ihe ndị e zoro nke ọma unu na-amaghị.
7 Ugbu a ka ha na-eme.* O tebeghị aka,Ha bụ ihe unu na-anụtụbeghị tupu taa,Ka unu ghara ịsị, ‘Anyị dị mbụ mara ha.’
8 N’eziokwu, o nwebeghị mgbe unu chọrọ ịnụ ya.+ Unu aghọtaghịkwa ya,O teekwala ntị unu kpọchiri akpọchi.
Ama m na unu na-aghọ ncha n’aghụghọ.+
Unu bụkwa ndị mmehie kemgbe a mụrụ unu.+
9 Ma n’ihi aha m, m ga-akwụsị iwe m na-ewe.+
M ga-ejide onwe m ka e wee nye m otuto.
M gaghịkwa ebibi unu.+
10 Anụchaala m gị, ma ọ bụghị dị ka e si anụcha ọlaọcha.+
Ahapụrụ m gị ka ị taa ahụhụ, si otú ahụ nụchaa* gị otú e si eji oké ọkụ agbaze ihe.+
11 N’eziokwu, m na-eme ihe a n’ihi aha m.+
Olee otú m ga-esi kwe ka e mebie aha m?+
Anaghị m enye onye ọzọ otuto e kwesịrị inye m.
12 Jekọb, gee m ntị. Izrel, bụ́ onye m họọrọ, geekwa m ntị.
Anaghị m agbanwe agbanwe.+ Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.+
13 Eji m aka m tọọ ntọala ụwa,+Jirikwa m aka nri m gbasaa eluigwe ka ákwà.+
M na-akpọ ha ka ha pụtakọta ọnụ.
14 Unu niile, zukọtanụ ma gee ntị.
Ò nwere chi ọ bụla n’ime ha kwuru gbasara ihe ndị a?
Onye* mụnwa bụ́ Jehova hụrụ n’anya+Ga-eme Babịlọn ihe ọ bụla dị mụ mma.+
Ọ ga-ejikwa aka ya dị ike mesie ndị Kaldia ike.+
15 Ekwuola m ihe m kwuru, akpọọkwala m ya.+
Akpọbatala m ya. M ga-emekwa ka ihe gaziere ya.+
16 Bịanụ m nso, nụrụ ihe a.
Malite ná mbido, m na-ekwu ihe m na-ekwu n’ihu ọha, ọ bụghị na nzuzo.+
Mgbe ihe e kwuru na ọ ga-eme mere, anọ m ya.”
Ma ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ezipụla m, nyekwa m* mmụọ ya.
17 Jehova, Onye Mgbapụta gị na Onye Nsọ Izrel, kwuru,+ sị:
“Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke gị.
Ọ bụ m na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru,+Na-ezikwa gị ụzọ i kwesịrị ịna-eso.+
18 Biko, na-eme ihe m nyere n’iwu.+
Ọ bụrụ na ị na-eme ya, udo ị ga-enwe ga-aha ka osimiri,+Ị gaghịkwa akwụsị ime ezi omume otú ahụ ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị n’oké osimiri.+
19 Ụmụ* gị na ndị si n’ezinụlọ gịGa-adị ọtụtụ ka ájá.+
E nweghịkwa ihe ga-eme ka e hichapụ aha ha.”
20 Sinụ na Babịlọn pụọ.+
Sinụ n’obodo ndị Kaldia gbapụ.
Na-enwenụ aṅụrị ka unu na-akọsa ya. Kọsaanụ ya.+
Kwuonụ gbasara ya n’ebe ụwa sọtụrụ.+
Kwuonụ, sị: “Jehova agbapụtala Jekọb ohu ya.+
21 Akpịrị akpọghị ha nkụ mgbe o du ha gafee ọzara.+
O mere ka mmiri si n’oké nkume gbapụtara ha.
Ọ gbawara oké nkume, mmiri agbapụtawa.”+
22 Jehova kwuru, sị: “Udo agaghị adịrị ndị ajọ omume.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ndị si na mmiri Juda pụta.”
^ Na Hibru, “ihe ndị mbụ.”
^ Na Hibru, “Olu unu bụ akwara ígwè.”
^ Na Hibru, “egedege ihu unu bụkwa ọla kọpa.”
^ Na Hibru, “ka e kere ha.”
^ Ma ọ bụ “nyochaa.” O nwere ike ịbụ, “họrọ.”
^ Ya bụ, Saịrọs.
^ Ma ọ bụ “ezipụla mụ na.”
^ Na Hibru, “Mkpụrụ.”