Aịzaya 49:1-26
49 Ndị bi n’agwaetiti, geenụ m ntị.
Mba ndị dị n’ebe dị anya, ṅaakwanụ ntị.+
Jehova ahọrọla m tupu a mụọ m.*+
Ọ gụrụ m aha mgbe m ka nọ n’afọ nne m.
2 O meela ka ọnụ m dị ka mma agha dị nkọ.
O jirila aka ya chebe m.+
O meela ka m dị ka akụ́ a pịrị apị.
O zoro m n’ime akpa akụ́ ya.
3 Ọ sịrị m: “Izrel, ị bụ ohu m.+
M ga-esi n’aka gị gosi na m dị ebube.”+
4 Ma, m sịrị: “Mbọ niile m gbara bụ na nkịtị.
Mbọ niile m gbara enweghị isi, ọ baghị uru.
Ma, ọ bụ Jehova ga-eleba okwu m anya,*
Ọ bụkwa Chineke m ga-akwụ m ụgwọ.”+
5 Ma ugbu a, Jehova, bụ́ Onye kpụrụ m kemgbe m nọ n’afọ ka m bụrụ ohu ya,Agwala m ka m kpọghachitere ya Jekọb,Ka m kpọkọtara ya ndị Izrel.+
A ga-eto m n’anya Jehova.
Chineke m ga-abụkwa ike m.
6 Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị na ị ga-abụ ohu mNke ga-eme ka ebo niile si n’ezinụlọ Jekọb kwụsie ike,Nke ga-akpọghachitekwa ndị Izrel aka na-akpaghị.
Kamakwa, m meela ka ị bụụrụ mba dị iche iche ìhè,+Ka m wee zọpụta ndị nọ n’ebe niile n’ụwa.”+
7 O nwere ihe Jehova, bụ́ Onye Mgbapụta Izrel na Onye Nsọ ya,+ gwara onye e ledara anya,+ onye otu mba kpọrọ asị, onye na-ejere ndị na-achị achị ozi. Ọ sịrị ya:
“N’ihi ihe ndị eze ga-ahụ, ha ga-ebili ọtọ,N’ihi ihe ndị isi ga-ahụ, ha ga-akpọkwa isiala.
Ha ga-esi otú a sọpụrụ Jehova, bụ́ onye họọrọ gị,+Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi,+ Onye Nsọ Izrel.”
8 Jehova kwukwara, sị:
“N’oge m na-emere ndị mmadụ amara ka m mere ihe ị rịọrọ m.+
N’ụbọchị m na-azọpụta ndị mmadụ ka m nyeere gị aka.+
M nọ na-echebe gị, ka ọ bụrụ gị ka mụ na ndị mmadụ ga-eji gbaa ndụ,+Ka i wee mee ka ala a dịghachi otú ọ dịbu,Meekwa ka ndị m birighachi n’ala ha ketara nke tọgbọ nkịtị.+
9 A ga-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ!’+
A ga-asịkwa ndị nọ n’ọchịchịrị,+ ‘Pụtanụ ka a hụ unu!’
Ha ga na-ata ahịhịa n’akụkụ ụzọ ka atụrụ.
N’ụzọ niile ọtụtụ ndị ji ụkwụ aga* ka ha ga na-ata ahịhịa.
10 Agụụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghịkwa akpọ ha nkụ.+
Oké okpomọkụ agaghị adị ebe ha nọ, anwụ agaghịkwa acha ha.+
N’ihi na Onye na-emere ha ebere ga na-edu ha,+Ọ ga na-edu ha n’akụkụ isi mmiri dị iche iche.+
11 M ga-eme ka ugwu m niile bụrụ ụzọ,Okporo ụzọ m niile ga-adịkwa n’ebe dị elu.+
12 E nwere ndị si ebe dị anya bịa,+Nwee ndị nke si n’ebe ugwu nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ bịa,Nweekwa ndị nke si Saịnim bịa.”+
13 Eluigwe, ṅụsiwe ọṅụ ike. Ụwa, ṅụrịwa ọṅụ.+
Ka ugwu niile ṅụsiwe ọṅụ ike.+
N’ihi na Jehova akasiela ndị ya obi,+Ọ na-emekwara ndị ya ọ na-enweghị ka ọ hà ha ebere.+
14 Ma Zayọn nọ na-asị:
“Jehova ahapụla m,+ Jehova echefuokwala m.”+
15 Nwaanyị ọ̀ ga-echefuli nwa ya ka na-aṅụ araMa ọ bụ ghara imere nwa ọ mụrụ ebere?
Ọ bụrụgodị na nwaanyị echefuo, emekataghị m chefuo gị.+
16 Akanyela m aha gị n’ọbụ aka m.
Mgbidi gị niile dịkwa n’ihu m mgbe niile.
17 Ụmụ gị emeela ngwa ngwa lọghachi.
Ndị mesiri gị ike, bibiekwa gị, ga-ahapụ gị.
18 Welite ihu gị ma legharịa anya.
Ha niile agbakọtawala.+
Ha na-abịakwute gị.
Jehova kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ,Ha ga-adị ka ihe e ji achọ mma i ji chọọ onwe gị mma,Ha ga-adịkwa ka ihe ị ga-eyiri otú nwaanyị a na-alụ ọhụrụ si eyiri ihe olu.
19 Ọ bụ eziokwu na a lara ebe i bi n’iyi, bibie ya, obodo gị atọgbọrọkwa nkịtị,+Ma, ọ gaghị aba ndị bi na ya ugbu a.+
Ndị bibiri gị+ ga-anọkwa ebe dị anya.+
20 Ụmụ a mụrụ mgbe ị gba aka ụmụ ga-agwa gị, sị,‘Ebe a anaghịzi aba anyị.
Nyekwuo anyị ebe anyị ga-ebi.’+
21 Ị ga-asịkwa n’obi gị,‘Ebe ọ bụ na m gbarala aka ụmụ, bụrụkwa nwaanyị agaNa onye a dọọrọ n’agha tụọ mkpọrọ,Ònyezi bụ nna ụmụ ndị a?
Ònyekwa zụlitere ha?+
Ebe ọ bụkwa na a hapụrụ naanị m,+Oleezi ebe ụmụ ndị a si?’”+
22 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“M ga-eweli aka m elu ka mba dị iche iche hụ ya.
M ga-egwunyekwara mba dị iche iche ihe ga-agbara ha àmà.+
Ha ga-ekuru ụmụ gị ndị nwoke n’aka* kutere gị,Burukwa ụmụ gị ndị nwaanyị n’ubu.+
23 Ndị eze ga na-elekọta gị.+
Ada ndị eze ga-abụkwa ụmụ nwaanyị na-ejere gị ozi.
Ha ga-ehulata ala kpọọrọ gị isiala.+
Ha ga-edo onwe ha n’okpuru gị.*+
Ị ga-amarakwa na abụ m Jehova.
A gaghị emenye ndị tụkwasịrị m obi ihere.”+
24 À ga-anapụtali dike ndị o ji eji?
Ka à ga-anapụtali onye ọchịchị aka ike ndị ọ dọọrọ n’agha?
25 Ma, Jehova kwuru, sị:
“A ga-anapụta dike ndị ọ dọọrọ n’agha,+Napụtakwa onye ọchịchị aka ike ndị o ji eji.+
M ga-alụso onye ọ bụla na-alụso gị ọgụ ọgụ.+
M ga-azọpụtakwa ụmụ gị.
26 M ga-eme ka ndị na-emegbu gị rie anụ onwe ha.
Ọbara ha ga na-egbu ha ka mmanya dị ụtọ.
Mmadụ* niile ga-amarakwa na abụ m Jehova,+Onye Nzọpụta gị,+ Onye Mgbapụta gị+Nakwa Dike na-enyere Jekọb aka.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “malite mgbe m nọ n’afọ.”
^ Ma ọ bụ “Jehova ga-ekpere m ikpe ziri ezi.”
^ O nwere ike ịbụ, “N’ugwu ahịhịa na-adịghị.”
^ Na Hibru, “n’obi.”
^ Na Hibru, “Ha ga-aracha ájá dị n’ụkwụ gị.”
^ Na Hibru, “Anụ ahụ́.”