Aịzaya 52:1-15
52 Zayọn,+ teta! Teta! Mee onwe gị ka ị dị ike.*+
Jeruselem, bụ́ obodo nsọ, yiri uwe gị mara mma.+
N’ihi na onye a na-ebighị úgwù na onye na-adịghị ọcha agaghị abata n’ime gị ọzọ.+
2 Jeruselem, bilie, tichapụ onwe gị ájá ma nọrọ n’oche.
Zayọn a dọọrọ n’agha, tọpụ agbụ e kere gị n’olu.+
3 N’ihi na Jehova kwuru, sị:
“E rere unu n’anataghị ego,+A gaghịkwa eji ego gbapụta unu.”+
4 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Na nke mbụ, ndị m gara biri n’Ijipt, bụrụ ndị mbịarambịa.+
Ndị Asiria mechakwara mesie ha ike n’agbanyeghị na o nweghị ihe ha mere ha.”
5 Jehova kwuru, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme ebe a?
N’ihi na a kpọọrọ ndị m n’akwụghị ihe ọ bụla.”
Jehova kwukwara, sị: “Ndị na-achị ha nọ na-eti mkpu ọṅụ na ha emeriela.+
Ha nọkwa na-emebi aha m mgbe niile.+
6 N’ihi ya, ndị m ga-amara aha m.+
Ọ bụ ya mere ha ga-eji mara n’ụbọchị ahụ na ọ bụ mụnwa na-ekwu.
Ọ bụ mụnwa na-ekwu ihe a.”
7 Ụkwụ onye si n’elu ugwu ziri ozi ọma na-abịa mara ezigbo mma.+
Onye ahụ na-ekwu na udo adịla.+
Ọ na-ekwu na ihe ka mma abịala.
Ọ na-ekwu na a zọpụtala ndị mmadụ.
Ọ na-asị ndị bi na Zayọn: “Chineke unu aghọọla Eze!”+
8 Geenụ ntị! Ndị nche unu na-eti mkpu.
Ha ji otu olu na-eti mkpu ọṅụ.
N’ihi na ha ga-eji anya ha hụ mgbe Jehova ga-akpọlata ndị bi na Zayọn.
9 Ebe ndị dakpọsịrị adakpọsị na Jeruselem,+ na-enwenụ obi ụtọ, jirikwanụ otu olu na-eti mkpu ọṅụ,N’ihi na Jehova akasiela ndị ya obi.+ Ọ gbapụtala Jeruselem.+
10 Jehova emeela ka mba niile hụ aka ya dị nsọ.+
Ndị niile nọ n’ụwa ga-ahụ ihe Chineke anyị mere iji zọpụta ndị ya.+
11 Pụọnụ, pụọnụ, sinụ ebe ahụ pụọ.+ Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka!+
Unu ndị na-ebu arịa Jehova,+Sinụ ebe ahụ pụọ,+ debekwanụ onwe unu ọcha.
12 Unu agaghị eji ụjọ pụọ.
Unu agaghịkwa eji ọsọ gbapụ,N’ihi na Jehova ga-ebutere unu ụzọ.+
Chineke Izrel ga na-anọkwa unu n’azụ na-echebe unu.+
13 Ohu m+ ga-egosi na ọ ma ihe n’ihe ọ bụla ọ na-eme.
M ga-eme ka ọ nọrọ n’ọkwá ukwu.
M ga-ebuli ya elu. A ga na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.+
14 E mere ya ihe otú ndị ma ya na-agaghịzi amata ya.
Ihe a e mere ya kpara mma ya aka ọjọọ. O nwetụbeghịkwa onye e mere ihe e mere ya.
Ọ tụrụ ọtụtụ ndị n’anya, ha ekporopụ anya na-ele ya.
15 Otú ahụkwa ka ọ ga-esi tụọ ọtụtụ mba n’anya.+
Ọnụ ga-emechi ndị eze n’ihi ya,+N’ihi na ha ga-ahụ ihe ọ na-enwetụbeghị onye kọrọ gbasara ya.
Ha ga-atụgharịkwa uche n’ihe ha na-anụtụbeghị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Yiri ike gị dị ka uwe.”