Aịzaya 62:1-12

  • Aha ọhụrụ a ga na-akpọ Zayọn (1-12)

62  Agaghị m agbachi nkịtị n’ihi Zayọn.+ Agaghịkwa m anọ jii n’ihi Jeruselem,Ruo mgbe ezi omume ya malitere inwu ka ìhè,+Nzọpụta ya ana-enwukwa ka ọwa a mụnyere ọkụ.+   “Jeruselem,* mba dị iche iche ga-ahụ ezi omume gị.+ Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị.+ A ga na-akpọ gị aha ọhụrụ.+ Ọ bụ Jehova ga-eji ọnụ ya gụọ gị aha ahụ.   Ị ga-aghọ okpueze mara mma n’aka Jehova,Ghọọkwa ákwà eze na-eke n’isi n’ọbụ aka Chineke gị.   A gaghịzi akpọ gị nwaanyị a hapụrụ ahapụ.+ A gaghịzi asị na ala gị tọgbọ nkịtị.+ Kama a ga-akpọ gị Onye Ihe Ya Masịrị M,+Kpọọkwa ala gị Nwaanyị A Lụ Alụ. N’ihi na ihe gị ga-amasị Jehova,Ala gị ga-adịkwa ka nwaanyị a lụ alụ.   N’ihi na ụmụ gị ndị nwoke ga-alụrụ gịDị ka nwa okorobịa si alụrụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi gị+Otú nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ si aṅụrị ọṅụ n’ihi nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ.   Jeruselem, enyela m ndị nche ọrụ ka ha na-anọ n’elu mgbidi gị niile. Ha ekwesịghị ịgbachi nkịtị mgbe ọ bụla, ma n’ehihie ma n’abalị. Ndị na-ekwu gbasara Jehova,Unu ezula ike.   Na-arịọnụ ya ka ọ na-enyere unu aka ruo mgbe o mere ka Jeruselem sie ezigbo ike,Ruokwa mgbe o mere ka a na-eto Jeruselem n’ụwa.”+   Jehova eweliela aka nri ya na aka ya dị ike elu, ṅụọ iyi, sị: “Agaghịzi m enye ndị iro gị ọka* gị ka ha taa. Ndị mba ọzọ agaghịzikwa aṅụ mmanya ọhụrụ gị, nke ị tara ahụhụ mepụta.+   Kama ọ bụ ndị chịkọtara ọka ahụ ga-ata ya. Ha ga-etokwa Jehova. Ọ bụkwa ndị mepụtara mmanya ahụ ga-aṅụ ya n’ogige m dị nsọ.”+ 10  Pụọnụ, sinụ n’ọnụ ụzọ ámá pụọ. Wepụnụ ihe nọchiiri ndị m ụzọ.+ Rụọnụ ụzọ. Rụọnụ okporo ụzọ. Wepụsịanụ nkume ndị dị na ya.+ Gwunyenụ ihe ga na-agbara mba dị iche iche àmà.+ 11  Jehova gwara ndị nọ ebe ụwa sọtụrụ, sị: “Gwanụ Zayọn,* sị,‘A ga-azọpụta gị n’oge na-adịghị anya.+ Chineke dị njikere ịkwụ ndị ya ụgwọ ọrụ. Ihe ọ ga-akwụ ha dịkwa n’ihu ya.’”+ 12  Ndị mmadụ ga-akpọ ha ndị dị nsọ, ndị Jehova gbapụtara.+ A ga-akpọkwa Jeruselem Obodo Chineke Chọtara, Obodo Chineke Na-ahapụghị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nwaanyị.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”