Abụ Ákwá 1:1-22

  • A kpọrọ Jeruselem nwaanyị isi mkpe

    • Jeruselem tọgbọzi nkịtị, e nweghịkwa onye bi na ya (1)

    • Mmehie Zayọn karịrị akarị (8, 9)

    • Chineke ajụla Zayọn (12-15)

    • E nweghị onye na-akasi Zayọn obi (17)

א [Alef]* 1  Jeruselem, bụ́ obodo ndị mmadụ juburu na ya, tọgbọzi nkịtị.+ Nwaanyị ụmụ ya hiri nne ma e jiri ya tụnyere mba ndị ọzọ dịzi ka nwaanyị di ya nwụrụ.+ Onye bụ́bu eze nwaanyị na-achị mpaghara* dị iche iche bụzi onye a na-amanye ịrụ ọrụ.+ ב [Bet]   Ọ na-ebegbu onwe ya n’ákwá n’abalị.+ Anya mmiri na-asọdakwa ya na ntì. N’ime ndị niile hụrụ ya n’anya, e nweghị nke na-akasi ya obi.+ Ndị enyi ya niile agharịpụla ya.+ Ha bụzi ndị iro ya. ג [Gimel]   A dọrọla Juda n’agha laa ala ọzọ,+ ya ana-ata ahụhụ, a na-echi ya ọnụ n’ala ka ọ na-agba ohu.+ Ya na ndị mba ọzọ bizi.+ Ọ hụghị ebe ọ ga-ezuike. Ndị niile na-akpagbu ya akparala ya aka ka ọ nọ n’ahụhụ. ד [Dalet]   Ụzọ niile e si aga Zayọn na-eru uju, n’ihi na e nweghịzi onye na-aga ememme ebe ahụ.+ E mebisiela ọnụ ụzọ ámá ya niile.+ Ndị nchụàjà ndị nọ ebe ahụ na-asụkwa ude. Ụmụ agbọghọ ya* na-eru uju. Obodo ahụ n’onwe ya ahụsiela anya. ה [Hee]   Ndị na-ebibi Zayọn bụzi ndị isi ya. Ndị iro ya anaghị echegbu onwe ha.+ N’ihi na Jehova emeela ka ọ na-eru uju maka mmehie niile o mere.+ Onye iro ya adọrọla ụmụ ya n’agha.+ ו [Wọọ]   Ihe niile mere Zayọn* ji maa mma adịghịzi.+ Ndị isi ya dị ka ele ndị na-ahụghị ebe ha ga-ata ahịhịa. Ike gwụrụ ha ka ha na-aga n’ihu onye na-emegbu* ha. ז [Zayin]   N’oge Jeruselem nọ n’ahụhụ nakwa n’oge ọ na-enweghịzi ụlọ, o chetaraIhe ya niile bara ezigbo uru ndị dịwara kemgbe ụwa.+ Mgbe ndị ya dabara n’aka onye iro ha, mgbe ọ na-enweghịkwa onye na-enyere ya aka,+Ndị iro ya hụrụ ya mgbe ọ dara, chịwa ya ọchị.+ ח [Het]   Mmehie Jeruselem akarịala.+ Ọ bụ ya mere o ji bụrụ ihe na-asọ oyi. Ndị niile na-akwanyeburu ya ùgwù ejighịzi ya kpọrọ ihe, n’ihi na ha ahụla ọtọ ya.+ Ọ na-asụ ude,+ cheekwa ihu ebe ọzọ n’ihi ihere na-eme ya. ט [Tet]   Uwe mwụda ya etetọọla. Ọ naghị eche gbasara ọdịnihu ya.+ Ọdịda ya dị egwu. O nweghị onye na-akasi ya obi. Jehova, lee ahụhụ m na-ata. Onye iro m na-etu ọnụ na o meriela.+ י [Yod] 10  Onye iro ebukọrọla akụ̀ ya niile.+ Jeruselem ahụla mba ndị batara n’ụlọ nsọ ya,+Ndị i nyere iwu ka ha ghara ịbata n’ọgbakọ gị. כ [Kaf] 11  Ndị Jeruselem niile na-asụ ude. Ha na-achọgharị ihe oriri.+ Ha ejirila ihe ndị bara ezigbo uru ha nwere gbanweta ihe ha ga-eri ka ha* nwee ike dịrị ndụ. Jehova, biko, leenụ otú m dịzi ka nwaanyị* na-abaghị uru. ל [Lamed] 12  Ọ̀ bụ na o nweghị ihe ihe a bụ n’anya unu niile ndị na-agafe n’ụzọ? Leenụ anya hụ ihe na-eme. È nwere onye a tara ụdị ahụhụ a tara m, Ya bụ, ahụhụ Jehova tara m n’ụbọchị o were ezigbo iwe?+ מ [Mem] 13  O si n’eluigwe zite ọkụ ka o ree ọkpụkpụ m niile.+ Ọ gbasaala ụgbụ ka o jide ụkwụ m. Ọ manyela m ịlaghachi azụ. O meela ka m dị ka nwaanyị na-ata ahụhụ. M na-arịa ọrịa ụbọchị niile. נ [Nun] 14  Jehova ekeela mmehie m niile eriri otú e si eke yok. O ji aka ya kee ha. O kegidere ha n’olu m. Ike agwụkwala m. O nyefeela m n’aka ndị ka m ike.+ ס [Samek] 15  Jehova akpọpụla ndị dike niile nọ n’obodo a.+ Ọ kpọkọọlara m ndị agha ka ha lụso m agha, bibiekwa ụmụ okorobịa m.+ Jehova azọchaala Juda* otú e si azọchapụta mmanya.+ ע [Ayin] 16  M na-ebe ákwá n’ihi ihe ndị a.+ Anya mmiri na-agbapụta m n’anya. N’ihi na onye ga-akasi m obi ma ọ bụ onye ga-eme ka m* nwee ume nọ m ebe dị anya. Ụmụ m ahụsiela anya, n’ihi na onye iro emeriela. פ [Pee] 17  Zayọn agbasaala aka ya.+ O nweghị onye ọ bụla na-akasi ya obi. Jehova enyela ndị niile gbara Jekọb gburugburu iwu ka ha na-emeso Jekọb ka ndị iro ya.+ Jeruselem na-asọzi oyi n’anya ha.+ צ [Sadee] 18  Ahụhụ Jehova tara m kwesịrị ekwesị+ n’ihi na edebeghị m iwu ya.+ Unu niile, geenụ ntị, hụkwanụ ahụhụ m na-ata. A dọrọla ma ụmụ agbọghọ m na-amaghị nwoke* ma ụmụ okorobịa m n’agha.+ ק [Kof] 19  Akpọrọ m ndị hụrụ m n’anya ka ha bịa nyere m aka, ma ha gharịpụrụ m.+ Ndị nchụàjà m na ndị okenye m alaala n’iyi n’ime obodo,Ebe ha na-achọgharị ihe ha ga-eri ka ha nwee ike dịrị ndụ.*+ ר [Resh] 20  Jehova, leenụ na anọ m n’ezigbo nsogbu. Ime ahụ́ m* aghasaala. Obi agbawaala m n’ihi na isi ike m akarịala.+ Mma agha gbawara m aka ụmụ n’èzí.+ Ọnwụ na-egbukwa ndị mmadụ n’ime ụlọ. ש [Shin] 21  Ndị mmadụ anụla ude m na-asụ. E nweghị onye na-akasi m obi. Ndị iro m niile anụla ọdachi dakwasịrị m. Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na i mere ka ọ dakwasị m.+ Ma otu ụbọchị, ị ga-eme ha ihe i kwuru na ị ga-eme ha.+ Ha ga-adị ka m n’ụbọchị ahụ.+ ת [Tọọ] 22  Ka ihe ọjọọ niile ha na-eme pụta ìhè n’ihu gị. Mesiekwa ha ike,+Otú ahụ i si mesie m ike n’ihi mmehie m niile. N’ihi na asụkarịala m ude, obi na-egbukwa m mgbu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Isi nke mbụ ruo anọ bụ abụ iru uju e dere n’usoro abịdịị ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru.
Ma ọ bụ “ógbè.”
Na Hibru, “Ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “na-achụ.”
Jeruselem ka a kpọrọ nwaanyị n’amaokwu a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Juda.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ụmụ agbọghọ m.”
Ma ọ bụ “ka mkpụrụ obi ha dịghachi ndụ.”
Na Hibru, “Eriri afọ m.”