Abụ Ákwá 2:1-22

  • Jehova na-ewesa Jeruselem iwe

    • Chineke emereghị Jeruselem ebere (2)

    • Jehova dịzi ka onye iro Jeruselem (5)

    • Jeremaya bere ákwá n’ihi Zayọn (11-13)

    • Ndị na-agafe agafe ga na-akwa obodo maburu mma emo (15)

    • Ndị iro Zayọn na-aṅụrị ọṅụ na e bibiela ya (17)

א [Alef] 2  Jehova ejirila iwe mee ka ígwé ojii kpuchie Zayọn.* O sila n’eluigwe bibie ihe ndị mere ka Izrel maa mma.+ O chetaghị ihe o ji agbakwasị ụkwụ+ n’ụbọchị iwe ya. ב [Bet]   Jehova ebibiela ebe niile Jekọb na-ebi n’emeghị ebere. O jirila iwe dị ọkụ kwatuo ebe dị iche iche Juda* rụsiri ike.+ O meela ka alaeze ya na ndị isi ya daruo ala iji menye ha ihere.+ ג [Gimel]   O ji ezigbo iwe wepụ ihe niile na-enye Izrel ike.* O nyereghị Izrel aka mgbe onye iro bịara lụso ya agha.+ Iwe ọ na-ewesa Jekọb dịkwa ka ọkụ nke repịara ihe niile gbara ya gburugburu.+ ד [Dalet]   O kweela ụta ya ka onye iro. Aka nri ya adịla njikere ịlụ ọgụ ka onye iro.+ Ọ nọ na-egbu ndị niile anyị na-anaghị eji egwu egwu.+ Ọ na-ewesakwa ụlọikwuu Zayọn*+ iwe ka ebe ọkụ na-ere.+ ה [Hee]   Jehova dịzi ka onye iro.+ O bibiela Izrel. O bibiela ụlọ elu ya niile. O bibiela ebe niile a rụsiri ike na ya. O meekwala ka a na-eru uju, na-ebekwa ákwá na Juda. ו [Wọọ]   Jehova akwatuola ụlọ ndò ya+ otú e si akwatu ụlọ akịrịka dị n’ubi. Ọ kwụsịla ime ememme ya.+ O meela ka ndị bi na Zayọn chefuo ememme na ụbọchị izu ike. O jikwa ezigbo iwe jụ ndị eze na ndị nchụàjà.+ ז [Zayin]   Jehova ajụla ebe ịchụàjà ya. O legharala ụlọ nsọ ya anya.+ O nyefeela mgbidi ụlọ elu ya dị iche iche n’aka onye iro.+ Ha na-eme mkpọtụ n’ụlọ Jehova,+ ka à ga-asị na ọ bụ ụbọchị ememme. ח [Het]   Jehova ekpebiela ịla mgbidi Zayọn* n’iyi.+ O jirila eriri e ji atụ̀ ihe tụọ mgbidi ndị ahụ.+ Ọ hapụghị ibibi ihe. Ọ na-emekwa ka mgbidi e ji ájá rụọ na mgbidi siri ike na-eru uju. Ha adaala. ט [Tet]   Ọnụ ụzọ ámá ya dị iche iche emiela ala.+ Chineke ebibiela ihe niile e ji atụchi ha, kụriekwa ha. A dọrọla eze ya na ndị isi ya n’agha laa mba dị iche iche.+ E nweghịzi onye na-edebe iwu.* Jehova anaghịdị eme ka ndị amụma Zayọn hụ ọhụụ.+ י [Yod] 10  Ndị okenye Zayọn* nọ ọdụ n’ala nkịtị. Ha anaghịkwa ekwu okwu.+ Ha kpokwasịrị onwe ha ájá n’isi, yirikwa ákwà iru uju.+ Ụmụ agbọghọ Jeruselem* ekpudochaala ihu n’ala. כ [Kaf] 11  Anya akpọọla m ebe m na-ebe ákwá.+ Ime ahụ́ m* aghasaala. Obi agbawaala m,* n’ihi na e bibiela ndị m,*+N’ihi na ụmụntakịrị na ụmụ ọhụrụ na-atụbọ n’ámá obodo.+ ל [Lamed] 12  Ka ha na-atụbọ ka ndị e merụrụ ahụ́ n’ámá obodo,+Ka ha na-achọ ikubi ume n’aka nne ha,Onye ọ bụla n’ime ha nọ na-agwa nne ya, sị: “Mama, agụụ ji m, akpịrị na-akpọkwa m nkụ.”* מ [Mem] 13  Jeruselem,* ònye na-ata ụdị ahụhụ ị na-ata? Ònye ka m ga-asị na ị dị ka ya? Zayọn,* gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, ka m wee kasie gị obi? N’ihi na ahụ́ i merụrụ hiri nne ka oké osimiri.+ Ònye ga-agwọ gị?+ נ [Nun] 14  Ọhụụ ndị amụma gị na-ahụrụ gị bụ ọhụụ ụgha, ha abaghịkwa uru.+ Ndị amụma gị agbaghị mmehie gị n’anwụ iji mee ka a ghara ịdọrọ gị n’agha,+Kama, ha nọ na-ahụrụ gị ọhụụ ụgha, na-agwakwa gị ihe ndị na-eduhie gị.+ ס [Samek] 15  Ndị niile na-agafe n’okporo ụzọ na-akụ aka iji kwaa gị emo.+ Jeruselem,* ihe mere gị na-eju ha anya, ha ana-afụ mkpọrọhịhị,+ na-efufe isi, na-asị: “Ihe a ọ̀ bụ obodo ahụ ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya, sị, ‘Ọ bụ ebe mma ruru gwụ, bụrụkwa ebe na-eme ka ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ’?”+ פ [Pee] 16  Ndị iro gị niile na-agwa gị okwu ọjọọ. Ha na-afụ mkpọrọhịhị, na-atakwa ikikere ezé, na-asị: “Anyị ebibiela ya.+ Ụbọchị anyị nọ na-atụ anya ya kemgbe eruola.+ Anyị ahụla ya.”+ ע [Ayin] 17  Jehova emeela ihe o bu n’obi ime.+ O mezuola ihe o kwuru,+Ya bụ, ihe o kpebiri ime kemgbe.+ O bibiela gị n’emereghị gị ebere.+ O meela ka onye iro na-aṅụrị ọṅụ n’ihe mere gị. O meela ka onye iro gị sikwuo ike.* צ [Sadee] 18  Mgbidi Zayọn,* gee ntị. Ndị bi n’ime gị na-ebeku Jehova ákwá. Mee ka anya mmiri na-asọ ka iyi ma n’ehihie ma n’abalị. Ezula ike, ka anya mmiri gharakwa ịkwụsị ịgba gị n’anya. ק [Kof] 19  Bilie! Tie mkpu n’abalị niile. Jiri anya mmiri kọọrọ Jehova ihe niile dị gị n’obi. Gbasaara ya aka gị n’ihi ndụ* ụmụ gị,Ya bụ, ụmụ gị ndị ụnwụ mere ka ha na-atụbọ n’ebe niile ụzọ gbara mkpị.+ ר [Resh] 20  Jehova, biko, lee ndị gị, bụ́ ndị i mesiri ike. Ụmụ nwaanyị hà kwesịrị ịna-eri ụmụ ha?*+ Ka è kwesịrị igbu onye nchụàjà na onye amụma n’ụlọ nsọ Jehova?+ ש [Shin] 21  Ozu nwatakịrị nwoke na agadi tọgbọ n’okporo ámá.+ E jirila mma agha gbuo ụmụ agbọghọbịa m* na ụmụ okorobịa m.+ I gbuola ha n’ụbọchị iwe gị. I gbuola ha n’emereghị ha ebere.+ ת [Tọọ] 22  I si ebe niile mee ka ihe ndị na-emenye m ụjọ gbakọta otú i si eme ka ndị mmadụ gbakọta n’ụbọchị ememme.+ E nweghịkwa onye lanahụrụ ma ọ bụ onye gbapụrụ n’ụbọchị iwe Jehova.+ Onye iro m gbuchara ụmụ m mụrụ ma zụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “ada bụ́ Juda.”
Na Hibru, “wepụ mpi Izrel.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “na-eso ntụziaka.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “Ụmụ agbọghọ Jeruselem na-amaghị nwoke.”
Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”
Na Hibru, “A wụsala imeju m n’ala.”
Na Hibru, “Eriri afọ m.”
Na Hibru, “Olee nri na mmanya?”
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”
Na Hibru, “ka mpi onye iro gi dị elu.”
Na Hibru, “Mgbidi ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ nke afọ ha?”
Na Hibru, “ụmụ agbọghọ m na-amaghị nwoke.”