Abụ Ákwá 3:1-66

  • Jeremaya kwuru otú obi dị ya nakwa ihe ọ na-atụ anya ya

    • ‘M ga-echere’ (21)

    • Chineke na-eme ebere kwa ụtụtụ (22, 23)

    • Chineke dị mma n’anya onye na-atụ anya ya (25)

    • Ọ dị mma ka nwoke buru yok ya n’oge ọ bụ okorobịa (27)

    • Chineke ji ígwé ojii gbochie ndị ya ịbịakwute ya (43, 44)

א [Alef] 3  Ahụrụ m ndị nọ n’ahụhụ maka na Chineke ji ezigbo iwe taa anyị ahụhụ.   Ọ chụpụla m ma mee ka m na-eje ije n’ọchịchịrị, ọ bụghị n’ìhè.+   N’eziokwu, ọ na-emesi m ike ụbọchị niile.+ ב [Bet]   O meela ka anụ ahụ́ m rekasịa. Ọ gbajisịakwala ọkpụkpụ m.   Ọ rụchibidola m mgbidi. O jirikwala nsí+ na ihe isi ike gbaa m gburugburu.   Ọ manyere m ka m nọdụ n’ebe gbara ọchịchịrị dị ka ndị nwụrụ kemgbe. ג [Gimel]   Ọ rụchibidola m mgbidi ka m ghara ịpụ. Ọ tụọla m ịga dị arọ ndị e ji ọla kọpa mee.+   M tie mkpu kpọọ ya ka o nyere m aka, ọ naghị anụ ekpere m.+   O jirila nkume a wara awa dochie n’ụzọ m. O meela ka ije ije n’ụzọ m na-aga na ya siere m ike.+ ד [Dalet] 10  Ọ na-aga zoo chebiri m otú anụ ọhịa bea ma ọ bụ ọdụm si echebiri anụ ọ chọrọ iri.+ 11  Ọ chụpụla m n’ụzọ m na-aga ma dọrie m.* O meela ka m tọgbọrọ chakoo.+ 12  O kweela ụta ya, tụgidekwa m akụ́ ya. ה [Hee] 13  Ọ gbaala akụ́* ndị dị n’akpa akụ́ ya n’akụrụ m. 14  Mmadụ niile na-achị m ọchị. Ha na-agụkwa egwú ha ji akwa m emo ụbọchị niile. 15  O meela ka m rijuo ihe na-elu ilu afọ, meekwa ka m tajuo ahịhịa na-elu ilu afọ.+ ו [Wọọ] 16  O meela ka m taa okwute tajie ezé. O meela ka m tụrụọ ná ntụ.+ 17  I meela ka obi ghara iru m ala.* Echefuola m ihe bụ́ aṅụrị.* 18  Ọ bụ ya mere m ji na-asị: “Mma m mara alaala n’iyi. Ihe m na-atụ anya inweta n’aka Jehova alaakwala n’iyi.” ז [Zayin] 19  Cheta na m nọ n’ahụhụ nakwa na enweghị m ụlọ.+ Chetakwa na m na-ata ahịhịa na-elu ilu na ihe na-egbu mmadụ.+ 20  Ị* ga-emecha cheta m. Ị ga-abịakwutekwa m* ma nyere m aka.+ 21  M bu ihe a n’obi. Ọ bụ ya mere m ga-eji chere gị.+ ח [Het] 22  Ọ bụ ịhụnanya Jehova mere* na anyị anwụchabeghị,+N’ihi na ebere ya anaghị agwụ agwụ.+ 23  Ọ na-eme ebere kwa ụtụtụ.+ Ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile.+ 24  M* kwuru, sị, “Jehova bụ òkè m.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji chere ya.”+ ט [Tet] 25  Jehova dị mma n’anya onye na-atụ anya ya+ nakwa n’anya onye* na-achọ ya.+ 26  Ọ dị mma ka mmadụ gba nkịtị*+ chere ka Jehova zọpụta ya.+ 27  Ọ dị mma ka nwoke buru yok ya n’oge ọ bụ okorobịa.+ י [Yod] 28  Ya nọrọ ọdụ naanị ya gbachi nkịtị, ebe ọ bụ na Chineke hapụrụ ya ka o buru ya.+ 29  Ya jiri obi ya niile na-edi ya ma kpudo ihu n’ájá.+ Olileanya dị na e nwere ike inyere ya aka.+ 30  Ya cheziere onye na-ama ya ụra ntì, ka mkparị jukwa ya afọ. כ [Kaf] 31  N’ihi na Jehova agaghị ajụ anyị ruo mgbe ebighị ebi.+ 32  Ọ bụ eziokwu na o mere ka anyị na-eru uju, ọ ga-emekwara anyị ebere n’ihi na ịhụnanya ya enweghị atụ.+ 33  N’ihi na ịta ndị mmadụ ahụhụ ma ọ bụ ime ka ha na-eru uju anaghị atọ ya ụtọ.+ ל [Lamed] 34  Iji ụkwụ zọpịa ndị mkpọrọ nọ n’ụwa,+ 35  Ikpe mmadụ ikpe mkpegbu n’ihu Onye Kacha Elu,+ 36  Na ikpe mmadụ ikpe arụrụala,Jehova kpọrọ ihe a niile asị. מ [Mem] 37  Ònyezi nwere ike ikwu ka ihe mee, ihe ahụ emee mgbe Jehova na-ekwughị ka o mee? 38  Naanị ihe na-esi n’ọnụ Onye Kacha Elu apụta bụ ihe ọma. Ihe ọjọọ anaghị esi n’ọnụ ya apụta. 39  Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji na-ekwu na obi adịghị ya mma maka na ọ na-ata ahụhụ mmehie ya?+ נ [Nun] 40  Ka anyị leruo àgwà anyị anya, chebakwara ya echiche,+ ka anyị laghachikwuru Jehova.+ 41  Ka anyị gbasaara Chineke bi n’eluigwe aka anyị ma jiri obi anyị niile gwa ya, sị:+ 42  “Anyị emehiela gị. Anyị enupụrụla gị isi.+ Ị gbagharabeghị anyị.+ ס [Samek] 43  I ji ezigbo iwe gbochie anyị ịbịakwute gị.+ Ị chụkwutela anyị ma gbuo anyị n’emeghị ebere.+ 44  I jirila ígwé ojii gbochie anyị ịbịakwute gị, ka ekpere anyị ghara irute ebe ị nọ.+ 45  I mere ka anyị dịrị ka ihe a jụrụ ajụ na ihe e kpofuru ekpofu n’anya mba dị iche iche.” פ [Pee] 46  Ndị iro anyị niile na-agwa anyị okwu ọjọọ.+ 47  Ụjọ na-atụ anyị mgbe niile. Olulu gbakwara anyị gburugburu.+ E bibiela anyị. Anyị tọgbọkwa nkịtị.+ 48  Anya mmiri si m n’anya na-asọpụta ka iyi maka na e bibiela ndị m.*+ ע [Ayin] 49  M na-ebe ákwá n’akwụsịghị akwụsị,+ 50  Ruo mgbe Jehova si n’eluigwe ledata anya hụ ihe na-eme anyị.+ 51  Ahụsiela m* anya n’ihi ihe na-eme n’ime obodo niile dị n’obodo m.+ צ [Sadee] 52  E nweghị ihe m mere ndị iro m, ha ana-achụ nta m ka à ga-asị na m bụ nnụnụ. 53  Ha chọrọ igbu m n’ime olulu. Ha nọkwa na-atụ m nkume. 54  Mmiri rikpuru m, mụ asị: “Nke m agwụla!” ק [Kof] 55  Jehova, esi m n’ime ime olulu kpọkuo aha gị.+ 56  Nụrụ olu m. Emechila ntị gị mgbe m na-etiku gị ka i nyere m aka. 57  Ị bịakwutere m n’ụbọchị m kpọkuru gị. Ị sịrị m: “Atụla egwu.” ר [Resh] 58  Jehova, i kpechitere ọnụ m.* Ị zọrọ mụ ndụ.+ 59  Jehova, ị hụlanụ ihe ọjọọ e mere m. Biko, kpeere m ikpe ziri ezi.+ 60  Ị hụlanụ ihe niile ha ji obi ọjọọ mee m, ya bụ, nkata ọjọọ niile ha kpaara m. ש [Sin] ma ọ bụ [Shin] 61  Jehova, ị nụla ka ha na-akparị m, nụkwa nkata ọjọọ niile ha na-akpara m.+ 62  Ị nụkwala ihe ndị na-emegide m na-ekwu nakwa izu ọjọọ ha na-agbara m ụbọchị niile. 63  Lewe ha. Ha na-agụ egwú ha ji achị m ọchị, ma mgbe ha nọ ọdụ ma mgbe ha guzo ọtọ. ת [Tọọ] 64  Jehova, ị ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere. 65  Ọnụ ị ga-abụ ha ga-eme ka ha kpọchie obi ha. 66  Jehova, ị ga-eji iwe chụọ ha ọsọ ma kpochapụ ha n’ụwa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “mee ka m tọgbọrọ nkịtị.”
Na Hibru, “ụmụ.”
Ma ọ bụ “ka mkpụrụ obi m ghara inwe udo.”
Na Hibru, “ihe dị mma.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “Ị ga-ehulatakwa.”
Ma ọ bụ “Ọ bụ ịhụnanya pụrụ iche Jehova na-egosi mere.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “nwee ndidi.”
Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m ahụsiela.”
Ma ọ bụ “i kpechiteere mkpụrụ obi m ọnụ ya.”