Abụ Ákwá 4:1-22

  • Ihe ndị mere Jeruselem n’oge a nọchibidoro ya

    • Ụkọ nri (4, 5, 9)

    • Ụmụ nwaanyị nọ na-esi ụmụ ha (10)

    • Jehova egosila na ezigbo iwe ji ya (11)

א [Alef] 4  Ọlaedo nke na-egbuke egbuke, nke bụ́ ezigbo ọlaedo, agbachuola.+ Nkume dị iche iche dị nsọ+ tọgbọgasị n’ebe niile ụzọ gbara mkpị.+ ב [Bet]   Ụmụ Zayọn, bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù, dịbu* ka ọlaedo a nụchara anụcha. Ma ugbu a, e weere ha ka nnukwu ite ụrọ,Ya bụ, ọrụ aka ọkpụite. ג [Gimel]   Nkịta ọhịa na-enyedị ụmụ ha ara. Ma, ndị m* aghọọla ndị obi tara mmiri+ ka enyí nnụnụ nọ n’ala ịkpa.+ ד [Dalet]   Ire nwa na-aṅụ ara araparala n’okpo ọnụ ya n’ihi akpịrị na-akpọ ya nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọ ka e nye ha nri,+ ma e nweghị onye na-enye ha.+ ה [Hee]   Agụụ emeela ka ndị na-eribu ezigbo nri tụbọọ* n’okporo ámá dị iche iche.+ Ndị na-eyi ákwà dị oké ọnụ kemgbe ha bụ ụmụaka+ na-edinazi n’ikpo ntụ. ו [Wọọ]   Ahụhụ a na-ata ndị m* maka mmehie ha akarịala nke a tara ndị Sọdọm maka mmehie ha.+ E bibiri Sọdọm n’otu ntabi anya. E nweghịkwa onye nyeere ya aka.+ ז [Zayin]   Ndị Naziraịt+ nọ na Zayọn dịbu ọcha karịa snoo, na-achabu ọcha karịa mmiri ara ehi. Ha na-achabu uhie uhie* karịa nkume kọral. Ha na-egbukebu egbuke dị ka nkume safaya. ח [Het]   Ha na-ejizi oji karịa unyì.* A naghị ama ndị ha bụ n’okporo ámá. Ha ataala ahụ́, bụrụzie ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+ Ha dịzi ka osisi kpọrọ nkụ. ט [Tet]   Ọ kaara ndị e ji mma agha gbuo mma karịa ndị ụnwụ gburu.+ N’ihi na ezigbo ike na-agwụ ndị ụnwụ ji aka maka na nri adịghịzi, ha eyie ndị e ji ube magbuo. י [Yod] 10  Ụmụ nwaanyị ndị na-emetaburu mmadụ ebere na-esizi ụmụ ha esi.+ Ha ji ha mere nri* n’oge e bibiri ndị m.*+ כ [Kaf] 11  Jehova egosila na ezigbo iwe ji ya. Iwe ya dị ka ọkụ na-ere ere.+ O sunyekwala Zayọn ọkụ nke na-erechapụ ntọala ya.+ ל [Lamed] 12  Ndị eze ụwa na ndị niile bi n’elu ala ekwetaghịNa onye mmegide na onye iro ga-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+ מ [Mem] 13  Ihe a mere n’ihi ihe ndị amụma ya mehiere nakwa n’ihi ihe ndị nchụàjà ya mejọrọ,+Bụ́ ndị na-egbu ndị ezi omume nọ na ya.+ נ [Nun] 14  Ha na-awagharị n’okporo ámá ka ndị kpuru ìsì.+ Ha ji ọbara merụọ onwe ha.+ Ọ bụ ya mere na e nweghị onye ga-anwa anwa metụ uwe ha aka. ס [Samek] 15  Ndị mmadụ nọ na-eti mkpu, na-asị ha, “Ndị na-adịghị ọcha, pụọnụ! Pụọnụ! Pụọnụ! Unu emetụla anyị aka!” Ndị amụma na ndị nchụàjà enweghịzi ebe ha ga-ebi. Ha na-awagharịzi awagharị. Ndị obodo dị iche iche na-asị: “Ha agaghịzi ebi n’obodo anyị.+ פ [Pee] 16  Jehova achụsasịala ha.+ Ọ gaghịzi na-ele ha anya ọma. Ndị mmadụ agaghị na-asọpụrụ ndị nchụàjà.+ Ha agaghịkwa na-emere ndị agadi amara.”+ ע [Ayin] 17  Anyị atụkatala anya ka e nyere anyị aka, anya akpọọ anyị. E nweghị onye nyeere anyị aka.+ Mba anyị nọ na-atụsi anya ike ka ha nyere anyị aka azọpụtalighị anyị.+ צ [Sadee] 18  Ndị iro anyị nọ na-achụgharị anyị ka ha jide anyị,+ nke na anyị enweghịzi ike ịna-agagharị n’okporo ámá anyị. Oge anyị ga-anwụ eruola. Ụbọchị anyị agwụla, n’ihi na oge ọnwụ anyị eruola. ק [Kof] 19  Ndị na-achụ anyị na-efe ọsọ karịa ugo.+ Ha chụrụ anyị ọsọ n’elu ugwu, chechiekwa anyị n’ala ịkpa. ר [Resh] 20  Ọ bụ ná nnukwu olulu ha ka ha jidere+ onye Jehova tere mmanụ,+ onye dị ka ume anyị na-eku. Anyị kwukwara gbasara ya, sị: “Ọ bụ ya ga na-echebe anyị ná mba dị iche iche anyị bi.” ש [Sin] 21  Ịdọm* nke dị n’ala Ọz, ṅụrịwa ọṅụ.+ Obi tọwakwa gị ụtọ. Ma, a ga-enye gị iko na-egosi na a ga-ebibi gị.+ Mmanya ga na-egbu gị. Ị ga-agbakwa onwe gị ọtọ.+ ת [Tọọ] 22  Zayọn,* ahụhụ a na-ata gị maka mmehie gị agwụla. E nweghị onye ga-adọrọ gị n’agha ọzọ.+ Ma Ịdọm,* Chineke ga-elebara mmehie gị anya. Ọ ga-agba mmehie gị n’anwụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “baburu ezigbo uru.”
Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”
Na Hibru, “tọgbọrọ nkịtị.”
Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Na Hibru, “ọchịchịrị.”
Ma ọ bụ “nri ha ji eru uju.”
Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Ịdọm.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “ada bụ́ Ịdọm.”