Abụ Ákwá 5:1-22

  • Ndị Izrel kpere ekpere ka Chineke kpọghachi ha

    • “Cheta ihe mere anyị” (1)

    • “Anyị efuola, n’ihi na anyị emehiela!” (16)

    • “Jehova, biko, kpọghachite anyị” (21)

    • “Mee ka ihe dịrị anyị otú ọ dị n’oge gara aga” (21)

5  Jehova, biko, cheta ihe mere anyị. Lee anya ka ị hụ otú e si menye anyị ihere.+   E werela ihe anyị ketara nye ndị ala ọzọ, nyekwa ndị mba ọzọ ụlọ anyị.+   Anyị aghọọla ụmụ na-enweghị nna. Nne anyị hà dịzi ka ụmụ nwaanyị isi mkpe.+   Anyị na-ejizi ego azụ mmiri anyị+ na nkụ anyị.   Ọ fọla ntakịrị ka ndị na-achụ anyị jide anyị. Ike agwụla anyị, ma e kweghị anyị zuru ike.+   Anyị na-asara Ijipt+ na Asiria+ aka ka ha nye anyị nri ga-eju anyị.   Nna nna anyị hà ndị mehierenụ anọghịzi, ma anyịnwa na-ata ahụhụ mmehie ha.   Ọ bụ ndị ohu na-achị anyị. E nweghị onye na-anapụta anyị n’aka ha.   Ndị ji mma agha nọrọ n’ala ịkpa emeela ka anyị na-eme ihe nwere ike ịta isi anyị*+ iji nweta ihe anyị ga-eri. 10  Akpụkpọ ahụ́ anyị dịzi ọkụ ka ekwú ọkụ, n’ihi ịnọ agụụ.+ 11  Ha menyere ụmụ nwaanyị ihere,* ma ụmụ nwaanyị a lụ alụ nọ na Zayọn ma ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke nọ n’obodo ndị dị na Juda.+ 12  E kegidere aka ndị isi n’elu kwụgbuo ha.+ A kwanyereghị ndị agadi ùgwù.+ 13  Ụmụ okorobịa bu nkume e ji egwe nri. Ụmụaka ndị nwoke bukwa nkụ na-adagharị. 14  Ndị agadi akwụsịla ịnọ n’ọnụ ụzọ ámá.+ Ụmụ okorobịa akwụsịkwala egwú ha na-akụ.+ 15  Anyị anaghịzi enwe obi ụtọ. Anyị akwụsịla ịgba egwú, na-eruzi uju.+ 16  Okpueze anyị kpu n’isi adapụla. Anyị efuola, n’ihi na anyị emehiela! 17  Ihe a emeela ka obi na-egbu anyị mgbu.+ Anya anyị na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi ihe ndị a.+ 18  Ugwu Zayọn tọgbọ nkịtị.+ Ọ bụzi ebe nkịta ọhịa na-awụgharị. 19  Ma gịnwa, bụ́ Jehova, ị ga-anọdụ n’ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị ga-adịru ọgbọ niile.+ 20  Gịnị mere i ji chefuo anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnịkwa mere i ji hapụ anyị kemgbe?+ 21  Jehova, biko, kpọghachite anyị n’ebe ị nọ. Anyị ga-ejikwa obi anyị niile lọghachikwute gị.+ Mee ka ihe dịrị anyị otú ọ dị n’oge gara aga.+ 22  Ma, ị jụla anyị kpamkpam. Ị ka na-ewesa anyị ezigbo iwe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “igbu mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “Ha dinara ụmụ nwaanyị n’ike.”