Abụ Ọma 1:1-6
1 Onye ọ bụla nke na-anaghị eso ndụmọdụ ndị ajọ omume,Nke na-anaghị eso ụzọ ndị mmehie,+Nke na-anaghịkwa anọ n’ebe ndị na-akwa emo nọ,+ na-enwe obi ụtọ.
2 Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ,+Ọ na-agụkwa iwu ya ma na-atụgharị uche na ya* ehihie na abalị.+
3 Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,Osisi nke na-amị mkpụrụ n’oge ya,Nke akwụkwọ ya na-anaghị akpọnwụ akpọnwụ.
Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.+
4 Ndị ajọ omume adịghị otú ahụ.
Ha dị ka mkpo ọka* ifufe na-efesasị.
5 Ọ bụ ya mere a ga-eji ama ndị ajọ omume ikpe,+Ndị mmehie agaghịkwa anọgide n’ebe ndị ezi omume zukọrọ.+
6 N’ihi na Jehova ma ihe ndị ezi omume na-eme,+Ma a ga-ala ndị ajọ omume na ajọ omume ha n’iyi.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala.”
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.