Abụ Ọma 102:1-28

  • Ekpere onye a na-emegbu emegbu kpere

    • “Adị m ka nnụnụ nke nọ naanị ya” (7)

    • “Ndụ m dị ka onyinyo ji nwayọọ nwayọọ apụ” (11)

    • “Jehova ga-arụghachi Zayọn” (16)

    • Jehova ga na-adị ndụ ruo ebighị ebi (26, 27)

Ekpere onye a na-emegbu emegbu kpere mgbe ọ na-ata ahụhụ.* N’ekpere a, ọ kọọrọ Jehova ihe niile na-echegbu ya.+ 102  Jehova, biko, nụrụ ekpere m.+ Nụrụ ákwá m na-ebe ka i nyere m aka.+   Ezorola m ihu gị n’oge m nọ ná nsogbu.+ Gee m ntị.* Biko, za m ozugbo m kpọrọ gị.+   N’ihi na ndụ m na-agwụ n’ike n’ike ka ebe anwụrụ ọkụ na-ekusasị. Ọkpụkpụ m na-ere m ọkụ ka à ga-asị na a kwanyere ya ọkụ.+   Obi m dịzi ka ahịhịa chanwụrụ achanwụ, nke kpọkwara nkụ,+N’ihi na anaghị m echeta iri nri.   Ude m na-asụsi ike emeela+Ka m taa ezigbo ahụ́.+   M yiri okwolo nke nọ n’ala ịkpa. Adị m ka obere ikwiikwii nke nọ n’ebe dakpọsịrị adakpọsị.   Edina m ala, ma ụra ekweghị atụ m.* Adị m ka nnụnụ nke nọ naanị ya n’elu ụlọ.+   Ndị iro m na-akparị m mgbe niile.+ Ndị na-akwa m emo na-eji aha m abụ ndị mmadụ ọnụ.   M na-aracha ntụ ka à ga-asị na ọ bụ nri.+ Anya mmiri m na-ataba n’ihe m na-aṅụ,+ 10  N’ihi iwe gị na ọnụma gị,N’ihi na i buliri m elu ka ị tụfuo m. 11  Ndụ m dị ka onyinyo ji nwayọọ nwayọọ apụ mgbe anwụ na-ada,+M na-akpọnwụkwa ka ahịhịa.+ 12  Ma Jehova, ị na-anọ ruo mgbe ebighị ebi,+Ị ga na-edekwa ude* n’ọgbọ niile.+ 13  N’eziokwu, ị ga-ebili meere Zayọn ebere,+N’ihi na oge ị ga-emere ya amara eruola.+ Oge a kara aka eruola.+ 14  N’ihi na ndị ohu gị ejighị nkume ndị e ji rụọ ya egwu egwu,+Ha nwekwara mmasị n’ájá ya.+ 15  Mba dị iche iche ga-atụ egwu aha Jehova,Ndị niile bụ́ eze n’ụwa ga-atụkwa egwu gị maka na ị dị ebube.+ 16  N’ihi na Jehova ga-arụghachi Zayọn.+ Ọ ga-egosi na ya dị ebube.+ 17  Ọ ga-ege ntị n’ekpere ndị ogbenye.+ Ọ gaghị eleghara ekpere ha anya.+ 18  E dere ihe a maka ọgbọ na-abịa abịa,+Ka ndị a ka ga-amụ amụ* wee too Jaa. 19  N’ihi na ọ na-esi n’ebe dị elu ọ nọ, bụ́ ebe dị nsọ, eledata anya.+ Jehova na-esi n’eluigwe ele anya n’ụwa, 20  Ka o wee nụrụ ude ndị a tụrụ mkpọrọ na-asụ,+Ka ọ napụta ndị a mara ikpe ọnwụ,+ 21  Ka e wee kọsaa aha Jehova n’ime Zayọn,+Ka e tookwa ya na Jeruselem 22  Mgbe ndị dị iche iche na alaeze dị iche icheZukọtara ka ha fee Jehova.*+ 23  O mere ka ike gwụ m mgbe m na-akabeghị nká. O mere ka ndụ m na-agbada n’ike n’ike. 24  M sịrị: “Chineke m,Onye na-adị ndụ n’ọgbọ niile,+Biko, anapụla m ndụ m mgbe m na-akabeghị nká. 25  Ị tọrọ ntọala ụwa ogologo oge gara aga,Ọ bụkwa gị kere eluigwe.+ 26  Ha ga-ala n’iyi, ma ị ga na-adị ndụ. Ha niile ga-aka nká ka uwe. Ị ga-agbanwe ha otú e si agbanwe ákwà, nke ha agaa. 27  Ma ị ka bụ onye ị bụ, e nweghịkwa mgbe ị ga-akwụsị ịdị ndụ.+ 28  Ahụ́ ga-eru ụmụ ndị ohu gị ala n’ebe ha bi,Ụmụ ha ga-anọkwa mgbe niile n’ihu gị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mgbe ike gwụrụ ya.”
Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
O nwere ike ịbụ, “M tara ahụ́.”
Ma ọ bụ “Aha gị ga-adịkwa.” Na Hibru, “A ga na-echeta gị.”
Na Hibru, “ka ga-eke eke.”
Ma ọ bụ “jeere Jehova ozi.”