Abụ Ọma 110:1-7
Abụ Devid.
110 Jehova gwara Onyenwe m, sị:
“Nọdụ ala n’aka nri m+Ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị bụrụ ihe i ji agbakwasị ụkwụ.”+
2 Jehova ga-eme ka ọchịchị gị* si na Zayọn ruo n’ebe ndị ọzọ. Ọ sịrị:
“Gaa meriwe n’etiti ndị iro gị.”+
3 Ndị gị ga-eji obi ha wepụta onwe ha n’ụbọchị i du ndị agha gị na-eje agha.
Ìgwè ndị na-eto eto* na-akwado gị. Ha dị ka igirigi nke na-ada n’isi ụtụtụ.
Ha dị nsọ, maakwa mma n’anya.
4 Jehova aṅụọla iyi, ọ gaghịkwa agbanwe obi ya.* Ọ sịrị:
“Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek,+Ị ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.”+
5 Jehova ga-anọ n’aka nri gị.+
Ọ ga-ebibi ndị eze n’ụbọchị iwe ya.+
6 Ọ ga-ekpe mba dị iche iche ikpe ma taa ha ahụhụ.+
Ọ ga-eme ka ozu ju n’ala ahụ niile.+
Ọ ga-ebibi onye na-achị* ala buru nnukwu ibu.*
7 Ọ* ga-aṅụ mmiri n’iyi dị n’ụzọ.
N’ihi ya, ọ ga-eweli isi ya elu.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “ga-esetị mkpanaka nke ike gị.”
^ Ma ọ bụ “Ìgwè ụmụ okorobịa.”
^ Ma ọ bụ “ọ gaghịkwa akwa ụta.”
^ Na Hibru, “onyeisi.”
^ Ma ọ bụ “ụwa niile.”
^ Ya bụ “Onyenwe m” e kwuru okwu ya n’amaokwu 1.