Abụ Ọma 117:1, 2

  • A gwara mba niile ka ha too Jehova

    • Ịhụnanya Chineke dị ukwuu (2)

117  Mba niile, toonụ Jehova.+ Mmadụ* niile, jaanụ ya mma.+   N’ihi na ịhụnanya* ọ na-egosi anyị dị ukwuu.+ Jehova bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi+ ruo mgbe ebighị ebi.+ Toonụ Jaa!*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ọnụmara.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.