Abụ Ọma 126:1-6
Abụ Mgbago.
126 Mgbe Jehova kpọlatara ndị Zayọn a dọọrọ n’agha,+Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ.
2 Ọchị juru anyị ọnụ n’oge ahụ,Anyị nọkwa na-eti mkpu ọṅụ.+
N’oge ahụ, mba dị iche iche nọ na-asị:
“Jehova emeerela ha nnukwu ihe.”+
3 Jehova emeerela anyị nnukwu ihe,+Obi bụkwa anyị sọ aṅụrị.
4 Jehova, biko, kpọlata ndị obodo anyị a dọọrọ n’aghaOtú mmiri ozuzo si asọba n’iyi ndị dị na Negeb.*
5 Ndị ji anya mmiri na-agha mkpụrụGa-eji mkpu ọṅụ ghọrọ ihe mkpụrụ ha mepụtara.
6 Onye bu mkpụrụ ọ ga-aghaBere ákwá na-aga n’ubiGa-ebu ọka* n’ùkwù n’ùkwù+Tiri mkpu ọṅụ lọta.+